Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Julaị 2027 › 3 Julaị

Kalenda Katọlik

Ihe ọgụgụ Mass (Katọlik) — 3 Julaị 2027

Satọdee · Izu nke 13 nke Oge Nkịtị

Mmemme na ndị nsọ

Onye nsọ Tọmọs, Onyeozi

Mmemme · Agba ofufe: uhie

Ihe ọgụgụ nke ụbọchị

Ihe ọgụgụ mbụ

Efe 2:19–22

19Matakwanụ ugbu a na unu abụkwaghị ndị mba ọzọ na ndị ọbịa. Unu esorola ndị nsọ bụrụ diala na ndị so nʼezinaụlọ Chineke, 20nke a rụkwasara nʼelu ntọala nke ndị ozi na ndị amụma, nke Kraịst Jisọs nʼonwe ya bụ nkume isi ntọala ya. 21Ọ bụkwa nʼime ya ka a na-ejikọta ụlọ ahụ niile nke ọma, na-aba ụba, too bụrụ ụlọnsọ, nʼime Onyenwe anyị. 22Onye a na-ewukọkwa unu onwe unu nʼotu nʼime ya, ka unu niile bụrụ ebe obibi Chineke nʼime Mmụọ.

Abụ Ọma nzaghachi

Abụ 117:1–2

1Toonu Onyenwe anyị, unu mba niile dị iche iche. Jaakwa ya mma, unu ndị niile dị iche iche. 2Nʼihi na ịhụnanya ya nʼebe anyị nọ dị ukwuu. Ikwesi ntụkwasị obi Onyenwe anyị na-adịkwa ruo mgbe ebighị ebi. Toonu Onyenwe anyị!

Oziọma

Jọn 20:24–29

24Ma Tọmọs (onye a na-akpọ Didimọs), otu nʼime ndị ozi iri na abụọ ahụ, anọghị ya mgbe Jisọs bịara. 25Ya mere, ndị ọzọ na-eso ụzọ ya gwara ya, “Anyị ahụla Onyenwe anyị!” Ma ọ sịrị ha, “Ọ bụ naanị mgbe m jiri anya m hụ ebe ahụ ntu kpọpuru ya aka, tinye mkpịsịaka m nʼapa ntu ndị ahụ, ma tinyekwa aka m nʼakụkụ ya ebe ahụ a mara ya ùbe, ka m ga-ekwere.” 26Mgbe abalị asatọ gasịrị, ndị na-eso ụzọ ya zukọtara ọzọ. Ugbu a Tọmọs nọkwa nʼetiti ha. Nʼagbanyeghị na e mechisịrị ụzọ niile, Jisọs batara guzo nʼetiti ha sị ha, “Udo dịrị unu.” 27Mgbe ahụ ọ sịrị Tọmọs, “Rụnye mkpịsịaka gị nʼebe a, leekwa aka m abụọ. Wepụta aka gị tinyekwa nʼakụkụ m. Abụla onye na-enweghị okwukwe, kama kwere.” 28Tọmọs zara sị ya, “Onyenwe m na Chineke m!” 29Ma Jisọs sịrị ya, “I kweere nʼihi na ị hụla m? Ma ngọzị dịrị ndị na-ahụghị ma kwere.”

Ndị nsọ nke ụbọchị

Kalenda Rom n’ozuzu; ọgbakọ ndị bishọp nwere ike ibuga ụfọdụ mmemme (Epifani, Mgbago n’Eluigwe, Ahụ na Ọbara Kraịst) n’ụbọchị Sọnde ma ọ bụ tinye nke ha. Akwụkwọ ọgụgụ: usoro Sọnde B, afọ ụbọchị izu I.

Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike