Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Julaị 2027 › 1 Julaị

Kalenda Katọlik

Ihe ọgụgụ Mass (Katọlik) — 1 Julaị 2027

Tọọzdee · Izu nke 13 nke Oge Nkịtị

Mmemme na ndị nsọ

Tọọzdee nke izu nke 13 nke Oge Nkịtị

Ụbọchị izu · Agba ofufe: akwụkwọ ndụ

Ihe ọgụgụ nke ụbọchị

Ihe ọgụgụ mbụ

Jen 22:1–19

1Mgbe ihe ndị a gasịrị, Chineke nwara Ebraham. Ọ sịrị ya, “Ebraham.” Ebraham zara sị, “Lekwa m.” 2Chineke sịrị, “Duru nwa gị nwoke, naanị otu nwa gị nwoke, Aịzik onye ị hụrụ nʼanya, gaa nʼala Mọrịa. Jiri ya chụọrọ m aja nsure ọkụ nʼelu otu nʼime ugwu dị nʼebe m ga-egosi gị.” 3Nʼisi ụtụtụ echi ya, Ebraham biliri kwadoo ịnyịnya ibu ya. O duuru ndị ikom abụọ na-ejere ya ozi, na nwa ya nwoke Aịzik. O gbutere nkụ ga-ezuru ya ịchụ aja nsure ọkụ, bilie gawa ebe ahụ Chineke gwara ya maka ya. 4Nʼụbọchị nke atọ, Ebraham lepụrụ anya hụ ebe ahụ nʼebe dị anya. 5Ọ gwara ndị na-ejere ya ozi sị, “Nọdụnụ nʼebe a, unu na ịnyịnya ibu anyị, ka mụ na nwokorobịa a gaa nʼebe ahụ. Anyị feecha ofufe, anyị ga-alọghachikwute unu ọzọ.” 6Ebraham boro nwa ya nwoke Aịzik ukwu nkụ ahụ e ji achụ aja nsure ọkụ nʼisi, ma ya onwe ya jidere ọkụ na mma. 7Aịzik gwara nna ya Ebraham sị, “Nna m.” Ebraham zara, “Ehee, nwa m.” Aịzik sịrị, “Ọkụ na nkụ dị nʼebe a, olee nwa atụrụ e ji achụ aja nsure ọkụ?” 8Ebraham zara, “Nwa m, Chineke nʼonwe ya ga-eweta nwa atụrụ e ji achụ aja nsure ọkụ.” Ha abụọ gakwara nʼihu nʼije ha. 9Mgbe ha ruru ebe ahụ Chineke gwara ya maka ya, Ebraham wuru ebe ịchụ aja nʼebe ahụ, doo nkụ ndị ahụ niile nʼusoro nʼelu ya. O kere nwa ya Aịzik agbụ, tụkwasị ya nʼelu ebe ịchụ aja ahụ, na nʼelu nkụ ndị ahụ. 10Mgbe ahụ Ebraham setịpụrụ aka ya, welite mma ka o gbuo nwa ya nwoke. 11Ma mmụọ ozi Onyenwe anyị si nʼeluigwe kpọọ ya oku sị ya, “Ebraham! Ebraham!” Ebraham zara, “Lekwa m nʼebe a.” 12Ọ sịrị ya, “Emetụkwala nwokorobịa ahụ aka. Emekwala ya ihe ọbụla. Nʼihi na amatala m ugbu a na ị na-atụ egwu Chineke, ebe ọ bụ na i kwenyere iji nwa gị nwoke, naanị otu nwa nwoke i nwere chụọrọ m aja.” 13Ebraham leliri anya hụ otu ebule nke eriri ọhịa jidere na mpi ya. Ebraham gara jide ebule ahụ, were ya chụọ aja nsure ọkụ nʼọnọdụ nwa ya nwoke. 14Ya mere, Ebraham kpọrọ ebe ahụ, “ Onyenwe anyị ga-arọpụta.” Ya mere ruo taa a na-asị, “Nʼugwu Onyenwe anyị, a ga-arọpụta.” 15Mmụọ ozi Onyenwe anyị sitere nʼeluigwe kpọọ Ebraham oku nke ugboro abụọ, 16sị, “Mụ onwe m, bụ Onyenwe anyị, ji onwe m na-aṅụ iyi na-ekwupụta sị, ebe ọ bụ na i mere ihe dị otu a, na i kwenyere iji nwa gị nwoke, naanị otu nwoke i nwere chụọrọ m aja, 17aga m agọzi gị nʼezie, mekwa ka ụmụ ụmụ gị mụbaa nʼọnụọgụgụ dịka kpakpando nke mbara eluigwe na dịka aja dị nʼọnụ mmiri osimiri. Ụmụ ụmụ gị ga-enwetara onwe ha ọnụ ụzọ ama ndị iro ha. 18Sitekwa na mkpụrụ gị ka a ga-agọzikwa agbụrụ niile nọ nʼụwa, nʼihi na i rubeere m isi.” 19Emesịa, Ebraham laghachikwuru ndị na-ejere ya ozi. Ha niile laghachikwara Bịasheba. Ebraham birikwara na Bịasheba.

Abụ Ọma nzaghachi

Abụ 116:1–6, 8–9

1Ahụrụ m Onyenwe anyị nʼanya, nʼihi na ọ nụrụ olu m; ọ nụrụ mkpu akwa m maka ebere. 2Nʼihi na o gere m ntị, aga m akpọku ya oge ndụ m niile. 3Agbụ nke ọnwụ kekọrọ m, oke ihe mgbu nke ili bịakwasịrị m; nsogbu na iru ụjụ dakwasịrị m. 4Mgbe ahụ, akpọkuru m aha Onyenwe anyị: “O Onyenwe anyị, zọpụta m!” 5Onyenwe anyị bụ onye na-eme ebere na onye ezi omume. Chineke anyị jupụtakwara nʼọmịiko. 6Onyenwe anyị na-echebe ndị na-enweghị uche; mgbe m nọ nʼọnọdụ mkpa, ọ zọpụtara m. 8Nʼihi na gị, o Onyenwe anyị, napụtara mkpụrụobi m site nʼọnwụ, anya m site na anya mmiri akwa, napụtakwa ụkwụ m site nʼịsọ ngọngọ, 9ka m nwee ike jegharịa nʼihu Onyenwe anyị nʼime ala ebe ndị dị ndụ bi.

Oziọma

Mat 9:1–8

1Jisọs banyekwara nʼụgbọ mmiri nke kwọọrọ ya bịaruo nʼobodo nke ya. 2Ndị ikom ụfọdụ butere ya otu nwoke akụkụ ahụ ya kpọnwụrụ akpọnwụ, bụ onye dina nʼute. Mgbe Jisọs hụrụ okwukwe ndị ahụ, ọ gwara onye ọrịa ahụ okwu sị ya, “Nwee obi ike nwa m nwoke nʼihi na a gbagharala gị mmehie gị niile.” 3Nʼoge a, ụfọdụ ndị ozizi iwu nke ndị Juu nọ nʼebe ahụ sịrịtara onwe ha, “Nwoke a na-ekwulu Chineke.” 4Ma ebe Jisọs matara ihe ha na-eche nʼobi ha, ọ sịrị, “Gịnị mere unu ji na-eche ajọ echiche nʼobi unu? 5Olee nke ka mfe ikwu? Ọ bụ ị sị, ‘A gbagharala gị mmehie gị niile,’ ka ọ bụ ị sị, ‘Bilie jee ije’? 6Ma ka unu mata na Nwa nke Mmadụ nwere ikike nʼụwa ịgbaghara mmehie.” Ọ sịrị onye ahụ akụkụ ahụ ya kpọnwụrụ akpọnwụ, “Bilie, chịrị ute gị laa!” 7Nwoke ahụ biliri, chịrị ute ya laa nʼụlọ ya. 8Mgbe igwe mmadụ a hụrụ ihe ahụ mere, akpata oyi jụrụ ha nʼahụ nʼihi egwu. Ha tokwara Chineke onye na-enye ụmụ mmadụ ikike dị otu a.

Kalenda Rom n’ozuzu; ọgbakọ ndị bishọp nwere ike ibuga ụfọdụ mmemme (Epifani, Mgbago n’Eluigwe, Ahụ na Ọbara Kraịst) n’ụbọchị Sọnde ma ọ bụ tinye nke ha. Akwụkwọ ọgụgụ: usoro Sọnde B, afọ ụbọchị izu I.

Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike