Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Jun 2027 › 30 Jun
Kalenda Katọlik
Ihe ọgụgụ Mass (Katọlik) — 30 Jun 2027
Wenezdee · Izu nke 13 nke Oge Nkịtị
Mmemme na ndị nsọ
Wenezdee nke izu nke 13 nke Oge Nkịtị
Ncheta a na-ahọrọ · Agba ofufe: akwụkwọ ndụ
Ndị mbụ nwụrụ nʼihi okwukwe nke Chọọchị Nsọ nke Rom · Ncheta a na-ahọrọ
Ihe ọgụgụ nke ụbọchị
Ihe ọgụgụ mbụ
5Ebraham agbaala narị afọ mgbe a mụrụ Aịzik nwa ya nwoke. 8Nwata ahụ tokwara, ruo mgbe a kwụsịrị ya ara. Nʼụbọchị ahụ a kwụsịrị ya ara, Ebraham kpọrọ oriri. 9Ma mgbe Sera hụrụ na nwa nwoke ahụ Hega onye Ijipt mụtaara Ebraham nọ na-akwa emo, 10ọ gwara Ebraham okwu sị ya, “Chụpụ ohu nwanyị a na nwa ya. Nʼihi na nwa nwoke ohu nwanyị agaghị eso nwa m nwoke Aịzik keta oke nʼihe nketa.” 11Okwu a wutere Ebraham nke ukwuu nʼihi na ihe banyere nwa ya nwoke Ishmel na-emetụ ya nʼobi. 12Ma Chineke gwara Ebraham sị, “Ekwela ka obi jọọ gị njọ nʼihi nwantakịrị a na ohu gị nwanyị. Gee ntị nʼihe ọbụla Sera gwara gị. Nʼihi na ọ bụ site nʼAịzik ka a ga-akpọ mkpụrụ gị aha. 13Aga m eme ka nwa gị nwoke nke ohu gị mụtara ghọọ mba dị ukwuu, nʼihi na mkpụrụ afọ gị ka ọ bụ.” 14Ebraham biliri nʼisi ụtụtụ echi ya, kwadoo ihe oriri na mmiri ọṅụṅụ nke dị nʼime karama akpụkpọ, bunye ha Hega. O bukwasịrị ha nʼubu Hega, zipụ ya na nwa ya nwoke. Hega si nʼebe ahụ pụọ wagharịa nʼime ọzara Bịasheba. 15Mgbe mmiri dị na karama akpụkpọ ahụ gwụsịrị, o nibere nwantakịrị ahụ nʼokpuru otu osisi ọhịa. 16Hapụ ya gaa nọdụ ala nʼebe dịtụ anya, ihe dịka narị nzọ ụkwụ, nʼihi na o kwuru nʼobi ya sị, “Achọghị m ịhụ nwantakịrị nwoke a anya mgbe ọ na-anwụ.” Mgbe ọ nọdụrụ ebe ahụ, o bidoro ịkwa akwa. 17Ma Chineke nụrụ ịkwa akwa nwantakịrị nwoke ahụ. Mmụọ ozi Chineke sikwa na mbara eluigwe kpọọ Hega oku sị ya, “Hega, gịnị na-eme gị? Atụla egwu, nʼihi na Chineke anụla olu akwa nwantakịrị ahụ nʼebe ahụ o dina. 18Gaa kulite nwantakịrị ahụ kasịe ya obi, nʼihi na aga m eme ya ka ọ ghọọ mba dị ukwuu.” 19Mgbe ahụ, Chineke meghere anya ya, mee ka ọ hụ olulu mmiri dị nʼebe ahụ. Ọ gara kujuo karama akpụkpọ ahụ mmiri, ma nye nwantakịrị ahụ mmiri ka ọ ṅụọ. 20Chineke nọnyeere nwantakịrị ahụ mgbe ọ na-eto. O biri nʼọzara ahụ ghọọ onye na-agba àkụ nke ọma.
Abụ Ọma nzaghachi
6Onye ogbenye a kpọkuru Onyenwe anyị, ọ zakwara ya; ọ zọpụtara ya site na nsogbu ya niile. 7Mmụọ ozi Onyenwe anyị na-agba ndị niile na-atụ egwu ya gburugburu na-anapụtakwa ha. 9Tụọnụ egwu Onyenwe anyị, unu ndị nsọ ya, nʼihi na ọ dịghị ihe na-akọ ndị niile na-atụ egwu ya. 10Agụụ nwere ike ịgụ ụmụ ọdụm, ike pụkwara ịgwụ ha, ma ihe ọbụla bụ ihe ọma agaghị akọ ndị niile na-achọ Onyenwe anyị. 11Ụmụ m, bịanụ gee m ntị; aga m ezi unu ihe ịtụ egwu Onyenwe anyị bụ. 12Onye ọbụla nʼime unu hụrụ ndụ nʼanya, ma nwee ọchịchọ ihu ọtụtụ ụbọchị ndị dị mma,
Oziọma
28Mgbe o rutere nʼofe nke ọzọ nke obodo Gadarin, mmadụ abụọ ndị mmụọ ọjọọ si nʼebe a na-eli ozu zutere ya. Ha na-akpa ike nke ukwuu, na ọ dịkwaghị onye na-esite nʼụzọ ahụ agafe nʼihi ha. 29Ngwangwa, ha tiri mkpu bido na-ajụ ajụjụ sị, “Gịnị ka anyị na gị nwekọrọ, gị Ọkpara Chineke? Ị gaghị echekwa eche ka oge ruo tupu ibido ịta anyị ahụhụ?” 30Igwe ezi nọ nʼakụkụ ebe ahụ na-akpa nri. 31Mmụọ ọjọọ ndị a rịọrọ ya arịrịọ sị, “Ọ bụrụ na ị chụpụ anyị, biko, hapụ anyị ka anyị banye nʼime ezi ndị a.” 32Ọ nyere ha iwu sị ha, “Ngwa, gaanụ!” Ha sitere nʼime mmadụ abụọ ahụ pụta banye nʼime igwe ezi ahụ. Otu mgbe ahụ kwa, ezi ndị ahụ niile gbaara ọsọ site na mkputamkpu ala ọnụ mmiri ahụ dabanyechaa nʼime mmiri ahụ. Ha nwụkwara nʼime ya. 33Ndị na-elekọta igwe ezi ndị ahụ gbapụrụ gbaga nʼime obodo kọọrọ ha ihe niile mere; tinyere ihe mere ndị ahụ mmụọ ọjọọ na-esogbu. 34Ya mere ndị niile nọ nʼobodo ahụ pụtara ịhụ Jisọs. Mgbe ha hụrụ ya ha rịọrọ ya sị ya pụọra ha nʼakụkụ obodo ha.
Ndị nsọ nke ụbọchị
- Ndị mbụ nwụrụ nʼihi okwukwe nke Chọọchị Nsọ nke Rom
Kalenda Rom n’ozuzu; ọgbakọ ndị bishọp nwere ike ibuga ụfọdụ mmemme (Epifani, Mgbago n’Eluigwe, Ahụ na Ọbara Kraịst) n’ụbọchị Sọnde ma ọ bụ tinye nke ha. Akwụkwọ ọgụgụ: usoro Sọnde B, afọ ụbọchị izu I.
Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike