Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Julaị 2027 › 1 Julaị
Kalenda Ọtọdọks · 18 Jun (Kalenda ochie)
Ihe ọgụgụ Ọtọdọks nke ụbọchị — 1 Julaị 2027
Tọọzdee · Izu nke 2 mgbe Pentikọọsụ gasịrị · Olu 8
Mmemme na ndị nsọ
Holy Martyrs Leontius, Hypatius, and Theodulus in Syria (70-79)
Obubu ọnụ Ndị Ozi
Obubu ọnụ: ya na mmanụ
Nke a na-eso iwu ndị mọnk. Nʼparish, a na-ekpebi ọtụtụ obubu ọnụ ya na onye na-anụ nkwupụta mmadụ, dịka ahụike, afọ na ọnọdụ si dị.
Ihe ọgụgụ nke ụbọchị
Akwụkwọ ozi
10Nʼihi na, ọ bụrụ na mgbe anyị bụ ndị iro Chineke, e mere ka anyị na ya dị nʼudo site nʼọnwụ Ọkpara ya, nke karịrị nke a bụ, ebe ọ bụ na anyị na ya dịzi na mma, anyị ga-enweta nzọpụta site na ndụ ya. 11Ọ bụkwaghị naanị nke a, kama anyị na-aṅụrịkwa ọṅụ nʼime Chineke site na Onyenwe anyị Jisọs Kraịst, onye anyị sitere na ya nata ịdị na mma a ugbu a. 12Dịka o siri dị, ọ bụ site nʼaka otu nwoke ka mmehie siri bata nʼụwa. Ọ bụkwa mmehie a wetara ọnwụ. Ugbu a, ọnwụ erutela onye ọbụla aka nʼihi na mmadụ niile emehiela. 13Ma tupu e nye iwu, mmehie dị nʼụwa. Ma a dịghị agụkọta mmehie mgbe iwu na-adịghị. 14Ma e mere ka ọnwụ rute onye ọbụla site nʼoge Adam ruo nʼoge Mosis. O metụtara ọ bụladị ndị mmehie ha na-adịghị ka nke Adam, onye bụ ihe atụ nke onye ahụ gaje ịbịa. 15Ma onyinye a adịghị ka njehie ya. Nʼihi na ọ bụrụ na ọtụtụ nwụrụ site na mmehie nke otu mmadụ, lee ka o siri bụrụ ihe dị ukwu karịa na amara Chineke na onyinye amara sitere nʼotu onye bụ Jisọs Kraịst ga-ababiga ụba oke rute ọtụtụ mmadụ. 16Ọzọ, onyinye a adịghị ka ihe mmehie mmadụ mụpụtara. Nʼihi na ikpe ahụ sooro mmehie otu onye weta ọmụma ikpe, ma onyinye ahụ sooro ọtụtụ njehie weta ịgụ mmadụ nʼonye ikpe na-amaghị.
Oziọma
23Mgbe ọ banyere nʼụgbọ, ndị na-eso ụzọ ya sooro ya. 24Nʼotu ntabi anya, oke ifufe bidoro ife nʼọdọ mmiri ahụ, nke mere na ebili mmiri na-ekpuchi ụgbọ ahụ. Ma ọ nọ na-arahụ ụra mgbe ihe ndị a na-eme. 25Ndị na-eso ụzọ ya jekwuuru ya, kpọtee ya, sị ya, “Onyenwe anyị, zọpụta anyị! Lee, na anyị nʼala nʼiyi.” 26Ma ọ zaghachiri, “Unu ndị okwukwe nta, gịnị mere ụjọ ji na-atụ unu?” Mgbe ahụ o biliri baara ifufe ahụ na ebili mmiri ahụ mba. Ha niile dajụrụ, deere jii. 27O juru ndị na-eso ụzọ ya anya, mee ka ha jụọ ajụjụ sị, “Ọ bụ ụdị mmadụ dị aṅaa ka nwoke a bụ? Ọ bụladị ifufe na ebili mmiri na-eme ihe o kwuru.”
Ụbọchị ndị a na-eso kalenda Julian nke Nzukọ Rọshịa (dịka Nzukọ Sabia na Jọjia na Ugwu Athos): 18 Jun na kalenda nzukọ bụ 1 Julaị na kalenda obodo. Nzukọ ndị na-eji kalenda ọhụrụ (Gris, Romania, Bulgaria, Ukraine…) na-eme mmemme ndị na-adịghị agbanwe agbanwe na ndị nsọ n’ụbọchị obodo ahụ n’onwe ya, ụbọchị 13 tupu mgbe ahụ, ụfọdụ ihe ọgụgụ ha dịkwa iche; Ista na ụbọchị ndị dabere na ya bụ otu.
Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike