Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Jun 2027 › 29 Jun
Kalenda Katọlik
Ihe ọgụgụ Mass (Katọlik) — 29 Jun 2027
Tiuzdee · Izu nke 13 nke Oge Nkịtị
Mmemme na ndị nsọ
Ndị nsọ Pita na Pọl, Ndị ozi
Mmemme ukwu · Agba ofufe: uhie
Ihe ọgụgụ nke ụbọchị
Ihe ọgụgụ mbụ
1Nʼoge ahụ, eze Herọd jidere ụfọdụ ndị so na chọọchị buru nʼobi ịkpagbu ha. 2O jiri mma agha gbuo Jemis nwanne Jọn. 3Mgbe ọ chọpụtara na omume ya tọrọ ndị Juu ụtọ, ọ gara nʼihu jidekwa Pita. Nke a mere nʼoge mmemme Achịcha Ekoghị eko. 4Mgbe o jidere ya, o tinyere ya nʼụlọ mkpọrọ ebe o mere ka ndị agha chee ya nche, ndị agha anọ nʼotu oge, ndị agha anọ ọzọ nʼoge nke ọzọ. Ebumnobi ya bụ ịkpọpụta ya nʼihu ọha mmadụ kpee ya ikpe mgbe Mmemme Ngabiga gasịrị. 5Mgbe e debere Pita nʼụlọ mkpọrọ, nzukọ esepụghị aka nʼikpe ekpere nʼihi ya nye Chineke. 6Ma nʼabalị na-esota ụbọchị ahụ Herọd ga-akpụpụta ya, Pita nọ nʼụra nʼetiti ndị agha abụọ, e jiri eriri igwe kee ya nʼụkwụ nʼaka, ma ndị nche ọzọ nọkwa nʼọnụ ụzọ na-eche ya nche. 7Na mberede mmụọ ozi Onyenwe anyị bịara guzoro nʼebe ahụ, ìhè nwukwara nʼime ụlọ mkpọrọ ahụ. Ọ kutụrụ Pita aka nʼakụkụ sị, “Ngwangwa, bilie ọtọ!” Eriri igwe ahụ dapụrụ nʼaka ya. 8Mmụọ ozi ahụ sịrị ya, “Yiri uwe gị na akpụkpọụkwụ gị.” O mere otu ahụ, Mmụọ ozi ahụ gwakwara ya, “Yirikwa akwa mgbokwasị gị soro m.” 9Pita sooro ya nʼazụ, o chere na ọ na-ahụ ọhụ, ma ọ mataghị na ihe mmụọ ozi ahụ na-eme bụ ezie. 10Ha gafere ndị nche nke mbụ na nke abụọ rute nʼọnụ ụzọ e si abanye nʼime obodo, nke bụ ọnụ ụzọ igwe. Ọnụ ụzọ igwe ahụ meghekwara nʼonwe ya, ha esite na ya gafee. Mgbe ha gara ije ruo ebe tere anya nʼama nke ọzọ, ngwangwa mmụọ ozi ahụ hapụrụ ya. 11Mgbe ahụ kwa ka Pita ghọtara ihe niile mere. O kwuru, “Ugbu a, amatala m nʼezie, na Onyenwe anyị ezitela mmụọ ozi ya, ka ọ bịa zọpụta m site nʼaka eze Herọd na ihe niile ndị Juu na-atụ anya ya. Ugbu a ọ napụtakwala m site nʼọchịchọ ọjọọ niile nke ndị Juu.”
Abụ Ọma nzaghachi
1Abụ Ọma Devid. Mgbe ọ gbanwere omume ya mee ka onye na-ayị ara nʼihu Abimelek, onye nke chụpụrụ ya, ya a pụọ. Aga m eto Onyenwe anyị mgbe niile. Mgbe niile ka otuto ya ga-adị nʼọnụ m. 2Mkpụrụobi m ga-anya isi na Onyenwe anyị; ka ndị niile a na-akpagbu gee ntị ṅụrịa ọṅụ. 3Soro m too Onyenwe anyị; ka anyị bulie aha ya elu. 4Nʼihi na etikuru m Onyenwe anyị mkpu akwa, ọ zakwara m, napụta m site nʼaka ịtụ ụjọ m niile. 5Ihu ndị na-elekwasị ya anya na-enwu dịka ihe; ihere adịghị eme ha. 6Onye ogbenye a kpọkuru Onyenwe anyị, ọ zakwara ya; ọ zọpụtara ya site na nsogbu ya niile. 7Mmụọ ozi Onyenwe anyị na-agba ndị niile na-atụ egwu ya gburugburu na-anapụtakwa ha. 8Jiri aka gị tulee ma hụkwa na Onyenwe anyị dị mma; onye a gọziri agọzi ka onye ahụ bụ, onye nke na-agbaba nʼime ya.
Ihe ọgụgụ nke abụọ
6Nʼihi na ugbu a, abụrụla m rịị onye a na-awụpụ dị ka aja ihe ọṅụṅụ, oge ụla m eruokwala. 7Alụsịala m ọgụ ọma ahụ, agbasịala m ọsọ ahụ, edebezuokwala m okwukwe ahụ. 8Ugbu a, e deberela m okpueze nke ezi omume, nke Onyenwe anyị, onye ikpe ezi omume ahụ, ga-enye m nʼụbọchị ahụ. Ma ọ bụghị naanị m ka ọ ga-enye ya, kama ọ ga-enyekwa ya ndị ahụ niile ọ na-agụsị agụ ike ịhụ ya anya. 17Ma Onyenwe anyị nọnyeere m, nyekwa m ike ikwusa oziọma ka ndị mba ọzọ niile nụrụ ya. Ọ zọpụtara m, site nʼọnụ ọdụm. 18Onyenwe anyị ga-azọpụtakwa m site nʼihe ọjọọ niile ọbụla, kpọbata m nʼudo baa nʼalaeze eluigwe ya. Ọ bụ ya ka otuto dịrị ruo mgbe niile ebighị ebi. Amen.
Oziọma
13Mgbe Jisọs bịaruru obodo a na-akpọ Sizaria Filipai, ọ jụrụ ndị na-eso ụzọ ya ajụjụ sị ha, “Onye ka ndị mmadụ na-asị na Nwa nke Mmadụ bụ?” 14Ha zara ya sị, “Ụfọdụ na-asị na ị bụ Jọn omee baptizim, ụfọdụ na-asị na ị bụ Ịlaịja, ndị ọzọ na-asịkwa na ị bụ Jeremaya, maọbụ otu nʼime ndị amụma.” 15Ọ jụrụ ha sị, “Ma unu onwe unu, ọ bụ onye ka unu na-asị na m bụ?” 16Saimọn Pita zara sị ya, “Ị bụ Kraịst ahụ, Ọkpara Chineke dị ndụ.” 17Jisọs gwara ya sị, “Saimọn Pita nwa Jona, ị bụ onye a gọziri agọzi, nʼihi na anụ ahụ na ọbara ekpugheghị ya nye gị. Kama, ọ bụ Nna m bi nʼeluigwe mere ka ị mata ya. 18Ma mụ onwe m na-agwa gị, na gị onwe gị bụ Pita. Ọ bụkwa nʼelu nkume a ka m ga-ewu ụlọ chọọchị m. Ike niile nke ọkụ ala mmụọ apụghịkwa iguzo megide ya. 19Aga m enye gị mkpisi igodo alaeze eluigwe. Ihe ọbụla ị ga-eke agbụ nʼelu ụwa, ka a ga-ekekwa agbụ nʼeluigwe. Ihe ọbụla ị ga-atọpụ nʼagbụ nʼụwa, a ga-atọpụkwa ya nʼeluigwe.”
Ndị nsọ nke ụbọchị
- Ndị nsọ Pita na Pọl, Ndị ozi
Kalenda Rom n’ozuzu; ọgbakọ ndị bishọp nwere ike ibuga ụfọdụ mmemme (Epifani, Mgbago n’Eluigwe, Ahụ na Ọbara Kraịst) n’ụbọchị Sọnde ma ọ bụ tinye nke ha. Akwụkwọ ọgụgụ: usoro Sọnde B, afọ ụbọchị izu I.
Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike