Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Jun 2027 › 29 Jun
Kalenda Ọtọdọks · 16 Jun (Kalenda ochie)
Ihe ọgụgụ Ọtọdọks nke ụbọchị — 29 Jun 2027
Tiuzdee · Izu nke 2 mgbe Pentikọọsụ gasịrị · Olu 8
Mmemme na ndị nsọ
Saint Tikhon, Bishop of Amathus († 425)
Obubu ọnụ Ndị Ozi
E kwere azụ
Nke a na-eso iwu ndị mọnk. Nʼparish, a na-ekpebi ọtụtụ obubu ọnụ ya na onye na-anụ nkwupụta mmadụ, dịka ahụike, afọ na ọnọdụ si dị.
Ihe ọgụgụ nke ụbọchị
Akwụkwọ ozi
4Mgbe mmadụ rụrụ ọrụ, ụgwọ ọrụ a kwụrụ ya abụghị onyinye, kama ọ bụ ihe ruru ya nʼihi ọrụ ọ rụrụ. 5Ma nye onye na-enweghị ọrụ ma tinye okwukwe ya na onye ahụ na-agụnye ndị ajọọ omume dịka ndị ezi omume, a ga-eji okwukwe ya gụnyere ya dịka ezi omume. 6Devid nʼonwe ya kwukwara banyere ọṅụ dịịrị onye ọbụla Chineke gụrụ nʼonye ezi omume nʼagbanyeghị ọrụ ya. 7“Ngọzị na-adịrị ndị a gbaghaara ajọ omume ha niile, ndị ekpuchikwara mmehie ha niile. 8Ngọzị na-adịrị nwoke ahụ, onye Onyenwe anyị na-adịghị agụnyere mmehie ya.” 9Ngọzị a ọ dịrị naanị ndị e biri ugwu ka ọ bụ nyekwa ndị a na-ebighị ugwu? Ihe anyị na-ekwu bụ na a gụrụ okwukwe Ebraham dị ka ezi omume nye ya. 10Olee mgbe a gụrụ ya nye ya? Ọ bụ tupu e bie ya ugwu, ka ọ bụ mgbe e bichara ya ugwu? Ọ bụghị mgbe e bichara ya ugwu kama ọ bụ tupu e bie ya ugwu. 11Ọ natara ihe ịrịbama nke obibi ugwu dịka akara nke ezi omume nke okwukwe o nwere mgbe ọ nọ na-ebighị ugwu. Nke a bụ ime ya nna ndị niile kweerenụ, ndị ahụ ọ gụrụ dịka ndị ezi omume, ọ bụ ezie na ha bụ ndị a na-ebighị ugwu. 12Nʼụzọ dị otu a kwa, ọ bụ nna ndị niile e biri ugwu. Ndụ ya na-egosikwa ha na ọ bụghị obibi ugwu ha na-azọpụta ha, kama ọ bụ okwukwe ha. Nʼihi na Chineke nabatara Ebraham naanị site nʼokwukwe o nwere tupu e bie ya ugwu.
Oziọma
15“Kpachapụnụ anya! Nʼihi na ndị amụma ụgha dị. Ha na-abịakwute unu nʼụdịdị atụrụ, ma ha bụ agụ. 16A ga-esite na mkpụrụ ha mata ndị ha bụ. Ndị mmadụ ọ na-esite nʼosisi ogwu dị nʼọhịa ghọta mkpụrụ osisi grepu, ka ha na-esite nʼosisi uke gbara nʼọhịa ghọta mkpụrụ fiig? 17Nʼụzọ dị otu a, osisi ọbụla dị mma na-amịpụta mkpụrụ ọma, ma osisi dị njọ na-amịpụta mkpụrụ dị njọ. 18Osisi na-amị mkpụrụ ọma adịghị amị mkpụrụ ọjọọ. Nke na-amị mkpụrụ ọjọọ adịghịkwa amị mkpụrụ ọma. 19Ma osisi ọbụla na-amịghị mkpụrụ ọma ka a ga-egbutu tụnye ya nʼọkụ. 20Ụzọ e si amata osisi ọma bụ site na mkpụrụ ya. 21“Ọ bụghị ndị niile na-asị m ‘Onyenwe anyị, Onyenwe anyị,’ ga-abanye nʼalaeze eluigwe, kama ọ bụ naanị ndị ahụ na-eme ihe Nna m nọ nʼeluigwe na-achọ ka ha mee.
Ụbọchị ndị a na-eso kalenda Julian nke Nzukọ Rọshịa (dịka Nzukọ Sabia na Jọjia na Ugwu Athos): 16 Jun na kalenda nzukọ bụ 29 Jun na kalenda obodo. Nzukọ ndị na-eji kalenda ọhụrụ (Gris, Romania, Bulgaria, Ukraine…) na-eme mmemme ndị na-adịghị agbanwe agbanwe na ndị nsọ n’ụbọchị obodo ahụ n’onwe ya, ụbọchị 13 tupu mgbe ahụ, ụfọdụ ihe ọgụgụ ha dịkwa iche; Ista na ụbọchị ndị dabere na ya bụ otu.
Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike