Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Jun 2027 › 28 Jun

Kalenda Katọlik

Ihe ọgụgụ Mass (Katọlik) — 28 Jun 2027

Mọnde · Izu nke 13 nke Oge Nkịtị

Mmemme na ndị nsọ

Mọnde nke izu nke 13 nke Oge Nkịtị

Ncheta · Agba ofufe: uhie

Onye nsọ Irenios, Bishọp, Onye nwụrụ nʼihi okwukwe na Onye nkuzi nke Chọọchị · Ncheta

Ihe ọgụgụ nke ụbọchị

Ihe ọgụgụ mbụ

Jen 18:16–33

16Mgbe ndị ikom atọ ahụ biliri ibidokwa ije ha, ha chere ihu ịga obodo Sọdọm, Ebraham dupụkwara ha. 17Mgbe ha na-aga nʼụzọ, Onyenwe anyị tulere sị, “O kwesiri ka m zochiere Ebraham ihe m chọrọ ime? 18Ebraham aghaghị ịbụ mba dị ukwuu dịkwa ike. A ga-agọzikwa agbụrụ niile nọ nʼụwa site na ya. 19Nʼihi na ahọpụtala m ya, ka ọ tụziere ụmụ ya na ụlọ ya ndị ga-esote ya ịgbaso ụzọ Onyenwe anyị site nʼime ihe dị mma na ihe ziri ezi, ka Onyenwe anyị mezuoro Ebraham ihe niile o kwere ya na nkwa.” 20Mgbe ahụ, Onyenwe anyị kwuru sị, “Mkpu akwa m na-anụ site na Sọdọm na Gọmọra dị ukwuu, otu a kwa, mmehie ha jọbigara njọ oke. 21Ugbu a, ana m aga ka m jiri anya m hụ ma ihe ha mere ọ dị njọ dịka mkpu akwa m na-anụ si dị. Ma o sighị otu ahụ dịrị, aga m amata.” 22Mgbe ahụ, ndị ikom abụọ nʼime ha gawara Sọdọm. Ma Ebraham nọ na-eguzo nʼihu Onyenwe anyị. 23Ebraham jeruru Onyenwe anyị nso jụọ ya sị, “Uche gị ọ bụ ikpochapụ ndị ezi omume na ndị ajọ omume? 24Ọ bụrụ na ị chọta iri ndị ezi omume ise nʼime obodo ahụ, ị ga-ekpochapụ obodo ahụ? Ị gaghị agbaghara ya nʼihi iri ndị ezi omume ise nọ nʼime ya? 25Ọ bụghị ezi ihe na ị ga-ala ndị ezi omume na ndị ajọ omume nʼiyi. Nʼihi na ị gaghị emeso ndị ezi omume dịka i si mesoo ndị na-eme ajọ ihe. O kwesighị ka onye ga-ekpe ụwa niile ikpe, kpee ikpe ziri ezi?” 26Mgbe ahụ, Onyenwe anyị zara sị ya, “Ọ bụrụ na m achọta iri ndị ezi omume ise nʼobodo Sọdọm, aga m agbaghara obodo ahụ niile nʼihi ha.” 27Ebraham kwukwara ọzọ sị, “Ugbu a m nwere ike kwuwapụta okwu nʼihu Onyenwe anyị, mụ onye bụ naanị aja na ntụ. 28Eleghị anya ọ bụrụ na e nweta naanị iri ndị ezi omume anọ na ise, ị ga-emebi obodo ahụ?” Onyenwe anyị zara sị, “Agaghị m ebibi ya ma ọ bụrụ na m achọta iri mmadụ anọ na ise nʼime ya.” 29Ọzọkwa, ọ sịrị ya, “Ọ bụrụkwanụ na a ga-achọta naanị iri mmadụ anọ?” Onyenwe anyị zara sị ya, “Nʼihi iri mmadụ anọ, agaghị m ebibi ya.” 30Mgbe ahụ ọ sịrị, “Biko, ka iwe hapụ iwe Onyenwe anyị ma m kwuo okwu. Eleghị anya, achọta naanị iri mmadụ atọ nʼebe ahụ?” Onyenwe anyị zaghachiri sị ya, “Agaghị m emebi ya, ma ọ bụrụ na m achọta iri mmadụ atọ nʼime ya.” 31O kwuru sị, “Ebe ọ bụ na m amalitela ịgwa gị, Onyenwe anyị okwu, biko kwere ka m gaa nʼihu. Ọ bụrụ na a ga-achọta naanị iri mmadụ abụọ?” Onyenwe anyị zara sị, “Nʼihi iri mmadụ abụọ ahụ agaghị m emebi ya.” 32Nʼikpeazụ, Ebraham kwuru sị, “Ka iwe hapụ iwe Onyenwe anyị. Ka m kwuo naanị otu ugboro a. Ọ bụrụkwanụ na a chọta naanị mmadụ iri nʼebe ahụ?” Onyenwe anyị zara sị, “Nʼihi mmadụ iri ahụ, agaghị m ebibi ya.” 33Mgbe Onyenwe anyị gwachara Ebraham okwu, ọ hapụrụ ya gawa ebe ọ na-aga. Ebraham laghachiri azụ nʼụlọ ya.

Abụ Ọma nzaghachi

Abụ 103:1–4, 8–11

1Abụ Ọma Devid. Mkpụrụobi m, too Onyenwe anyị; ka ihe niile dị nʼime m too aha nsọ ya. 2Mkpụrụobi m, too Onyenwe anyị; echefukwala mmeso ọma ya niile, 3ọ bụ ya na-agbaghara gị mmehie gị niile; na-agwọkwa gị ọrịa gị niile, 4onye na-agbapụta ndụ gị site nʼolulu werekwa ịhụnanya na ọmịiko kpukwasị gị dịka okpueze, 8Onyenwe anyị nwere obi ọmịiko na-emekwa amara. Ọ dịghị ewe iwe ọsịịsọ, o jupụtara nʼịhụnanya. 9Iwe ya anaghị adịgide ruo mgbe ebighị ebi, ọ bụghị oge niile ka ọ na-anọgide na-ata mmadụ ụta; 10ọ bụghị dịka mmehie anyị si dị ka ọ na-emeso anyị, ọ dịghị akwụghachi anyị dịka ajọ omume anyị si dị. 11Nʼihi na dịka eluigwe si dị elu karịa ụwa, otu a ka ịhụnanya ya si dị ukwuu nʼebe ndị na-atụ egwu ya nọ.

Oziọma

Mat 8:18–22

18Mgbe Jisọs hụrụ igwe mmadụ dị ukwuu ndị gbara ya gburugburu, ọ nyere ndị na-eso ụzọ ya iwu ka ha gafee nʼofe nke ọzọ. 19Nʼoge ahụ, otu onye nʼetiti ndị na-ezi iwu bịakwutere ya sị ya, “Onye nkuzi, aga m eso gị gaa ebe ọbụla ị na-aga.” 20Jisọs zara, sị, “Nkịta ọhịa nwere ọnụ ebe ha na-edina. Ụmụ nnụnụ nke igwe nwekwara akwụ; ma Nwa nke Mmadụ enweghị ebe obibi.” 21Otu onye ọzọ nʼime ndị na-eso ụzọ ya sịrị ya, “Onyenwe m, aga m eso gị, kama kwere ka m buru ụzọ gaa lie nna m.” 22Ma Jisọs zara sị ya, “Soro m ugbu a. Hapụ ndị nwụrụ anwụ ka ha lie ndị nwụrụ anwụ ibe ha.”

Ndị nsọ nke ụbọchị

Kalenda Rom n’ozuzu; ọgbakọ ndị bishọp nwere ike ibuga ụfọdụ mmemme (Epifani, Mgbago n’Eluigwe, Ahụ na Ọbara Kraịst) n’ụbọchị Sọnde ma ọ bụ tinye nke ha. Akwụkwọ ọgụgụ: usoro Sọnde B, afọ ụbọchị izu I.

Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike