Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Jun 2027 › 26 Jun

Kalenda Katọlik

Ihe ọgụgụ Mass (Katọlik) — 26 Jun 2027

Satọdee · Izu nke 12 nke Oge Nkịtị

Mmemme na ndị nsọ

Satọdee nke izu nke 12 nke Oge Nkịtị

Ncheta a na-ahọrọ · Agba ofufe: akwụkwọ ndụ

Ncheta Satọdee nke Nwaagbọghọ Meri Agọziri Agọzi · Ncheta a na-ahọrọ

Ihe ọgụgụ nke ụbọchị

Ihe ọgụgụ mbụ

Jen 18:1–15

1Onyenwe anyị gosiri Ebraham onwe ya nʼakụkụ osisi ukwu dị na Mamre, mgbe Ebraham nọdụrụ ala nʼihu ụlọ ikwu ya, nʼetiti ehihie. 2O lelitere anya ya hụ ndị ikom atọ ka ha guzo ebe ọ nọ nso. Mgbe ọ hụrụ ha, o sitere nʼihu ụlọ ikwu ya gbakwuru ha izute ha, kpọọ isiala. 3Ọ sịrị, “Onyenwe m, ọ bụrụ na m natara amara nʼihu gị, agabigala ohu gị. 4Biko, ka ekutere unu mmiri ntakịrị, ka unu sachaa ụkwụ unu, zurukwa ike nʼokpuru osisi a. 5Ka m wetara unu nri ntakịrị unu ga-eri nke ga-agba unu ume tupu unu agawa nʼihu nʼije unu ugbu a unu bịara na nke ohu unu.” Ha zara sị ya, “Ọ dị mma. Mee dịka i kwuru.” 6Ya mere, Ebraham mere ngwangwa banyekwuru Sera nʼụlọ ikwu ya sị ya, “Mee ngwa, mapụta ihe ọtụtụ sịa atọ site na ọka a kwọrọ nke ọma jiri meta achịcha.” 7Mgbe ahụ, Ebraham gbagara nʼigwe ehi ya, họpụta otu nwa ehi na-akaghị aka nke ahụ ya dị mma, nye ya otu ohu ya onye mere ngwangwa gbuo ya, dozie ya maka oriri. 8Emesịa, Ebraham buuru mmiri ara ehi nke rahụrụ arahụ, na mmiri ara ehi, na anụ ahụ a kwadoro dozie ha nʼihu ndị ọbịa ahụ. O guzokwara nso nso ebe ha nọ nʼokpuru osisi ahụ mgbe ha na-eri nri. 9Ha jụrụ ya sị, “Ebee ka Sera nwunye gị nọ?” Ọ zara sị, “Ọ nọ nʼime ụlọ ikwu.” 10Ọ sịrị ya, “Nʼezie, mụ onwe m ga-alọghachikwute gị nʼoge a nʼafọ ọzọ, Sera nwunye gị ga-amụta nwa nwoke.” Sera guzo nʼime ụlọ ikwu ahụ nke dị nʼazụ Ebraham na-ege ntị nʼihe ha na-ekwu. 11Nʼoge a, Ebraham na Sera emeela nnọọ agadi, gbaakwa isi awọ. Sera agafeela oge ịmụta nwa. 12Ya mere, mgbe Sera nụrụ ihe Onyenwe anyị kwuru, ọ chịrị ọchị sị, “Agadi nwanyị dịka m o si aṅaa amụta nwa, ugbu a onyenwe m karala nka?” 13Onyenwe anyị jụrụ Ebraham ajụjụ sị, “Gịnị mere Sera ji achị ọchị? Gịnị mere o ji kwuo sị, ‘Olee otu agadi nwanyị dịka m ga-esi mụọ nwa?’ 14Ọ dị ihe nyịrị Onyenwe anyị ime? Mụ onwe m ga-alọghachikwute gị nʼoge a kara aka, Sera nwunye gị ga-amụta nwa nwoke.” 15Ma ụjọ tụrụ Sera. Nʼihi ya, ọ gọrọ agọ sị, “Achịghị m ọchị.” Ma Ọ zara sị, “Ọ bụ ezie, Sera, ị chịrị ọchị.”

Abụ Ọma nzaghachi

Luk 1:47–50, 53–55

47mmụọ m na-aṅụrị ọṅụ nʼime Chineke bụ Onye nzọpụta m, 48nʼihi na o ledatala anya, lekwasị m, bụ odibo ya dị ala. Site ugbu a gaa nʼihu, ọgbọ niile ga-akpọ m onye a gọziri agọzi. 49Nʼihi na Onye dị ike emeelara m ihe dị ukwuu. Aha ya dịkwa nsọ. 50Ebere ya na-erute ndị niile na-atụ egwu ya site nʼọgbọ ruo nʼọgbọ. 53O jirila ihe dị mma nyejuo ndị agụụ na-agụ afọ ma ndị ọgaranya ka o zipụrụ nʼaka efu. 54O nyerela odibo ya bụ Izrel aka, ọ na-echetakwa imere ya ebere. 55Dị ka ọ gwara nna nna anyị ha, nye Ebraham na ụmụ ụmụ ya ruo mgbe ebighị ebi.”

Oziọma

Mat 8:5–17

5Mgbe ọ banyere na Kapanọm, otu onye ọchịagha bịakwutere ya rịọọ ka o nyere ya aka. 6Ọ sịrị, “Onyenwe m, onye na-ejere m ozi dina nʼụlọ nʼoke ihe mgbu, akụkụ ahụ ya kpọnwụkwara akpọnwụ.” 7Jisọs sịrị ya, “Ọ bụ m bịa gwọọ ya?” 8Ma onye ọchịagha ahụ zara ya sị, “Onyenwe m, ekwesighị m ka ị bata nʼokpuru ụlọ m. Naanị nọdụ nʼebe a, kwuo okwu, ahụ ga-adịkwa onye na-ejere m ozi ike. 9Nʼihi na mụ onwe m bụkwa onye nọ nʼokpuru ikike ọchịchị, nwee ndị agha nọ nʼokpuru m. Ana m asị onye nke a, ‘gaa.’ Ọ gaa, sịkwa onye nke ọzọ, ‘bịa.’ Ọ bịa. Ana m asị ohu m, ‘mee nke a.’ Ọ na-emekwa ya.” 10Mgbe Jisọs nụrụ okwu a, o juru ya anya nke ukwuu. Ọ gwara igwe mmadụ ahụ so ya okwu sị, “Nʼezie, ahụbeghị m okwukwe dị otu a ebe ọbụla; ọ bụladị nʼIzrel niile. 11Nʼezie kwa, ọtụtụ ndị mmadụ ga-esite nʼọwụwa anyanwụ nakwa ọdịda anyanwụ bịa soro Ebraham na Aịzik na Jekọb nọkọọ nʼoriri nʼalaeze eluigwe. 12Ma ụmụ alaeze ahụ, ka a ga-atụpụ nʼezi, nʼime ọchịchịrị, ebe ịkwa akwa na ịta ikikere eze ga-adị.” 13Jisọs gwara ọchịagha ahụ okwu sị ya, “Laa! E meerela gị dị ka okwukwe gị sịrị dị.” Ahụ dịrị onye ahụ na-ejere ya ozi mma nʼotu awa ahụ. 14Mgbe Jisọs ruru nʼụlọ Pita, ọ chọpụtara na nne nwunye ya nwere ahụ ọkụ. 15Ọ metụrụ ya aka, ahụ ọkụ ahụ hapụrụ ya, o biliri malite ijere ya ozi. 16Nʼoge uhuruchi, ha kpọtaara ya ọtụtụ ndị mmụọ ọjọọ na-esogbu. O ji okwu ọnụ chụpụ mmụọ ọjọọ ahụ niile, gwọọkwa ndị niile ahụ na-adịghị ike. 17Nke a bụ imezu amụma ahụ Aịzaya buru sị, “O bupụrụ nrịa nrịa anyị niile, burukwa ọrịa anyị niile.”

Kalenda Rom n’ozuzu; ọgbakọ ndị bishọp nwere ike ibuga ụfọdụ mmemme (Epifani, Mgbago n’Eluigwe, Ahụ na Ọbara Kraịst) n’ụbọchị Sọnde ma ọ bụ tinye nke ha. Akwụkwọ ọgụgụ: usoro Sọnde B, afọ ụbọchị izu I.

Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike