Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Jun 2027 › 26 Jun

Kalenda Ọtọdọks · 13 Jun (Kalenda ochie)

Ihe ọgụgụ Ọtọdọks nke ụbọchị — 26 Jun 2027

Satọdee · Izu nke 1 mgbe Pentikọọsụ gasịrị · Olu 7

Mmemme na ndị nsọ

Njedebe Pentikọọsụ

Izu na-enweghị obubu ọnụ

Ọ dịghị obubu ọnụ

Nke a na-eso iwu ndị mọnk. Nʼparish, a na-ekpebi ọtụtụ obubu ọnụ ya na onye na-anụ nkwupụta mmadụ, dịka ahụike, afọ na ọnọdụ si dị.

Ihe ọgụgụ nke ụbọchị

Akwụkwọ ozi

Rom 1:7–12

7Ya bụ, unu ndị Chineke hụrụ nʼanya bi na Rom, ndị ọ kpọrọ ka ha bụrụ ndị nsọ: Ka amara na udo nke sitere na Chineke Nna anyị, na Onyenwe anyị Jisọs Kraịst dịrị unu. 8Na mbụ, ana m ekele Chineke ekele nʼihi unu niile, site nʼaha Jisọs Kraịst. Nʼihi na a na-ekwusa ihe banyere okwukwe unu nʼụwa niile. 9Chineke, onye m na-ejere ozi, nʼime mmụọ site na ikwusa oziọma nke Ọkpara ya, bụ onye akaebe na m na-echeta unu mgbe niile nʼekpere m. 10Nʼekpere m oge niile, a na m arịọ ka ọ bụrụ ihe ga-ekwe mee na site nʼike Chineke, aga m enwe ohere ịbịa leta unu. 11Ọ na-agụ m agụụ nke ukwuu ịbịa hụ unu anya, nʼihi na achọrọ m ka unu keta oke nʼonyinye Mmụọ Nsọ nke Chineke nyere m, nke ga-enyere unu aka iguzosi ike nʼokwukwe. 12Ọ bụkwaghị naanị nke a, kama achọrọ m ka anyị gbarịtaa onwe anyị ume site nʼokwukwe anyị.

Oziọma

Mat 5:42–48

42Nye onye ọbụla rịọrọ gị ihe. Achụghachikwala ndị na-abịa ka i binye ha ego. 43“Unu nụrụ na e kwuru sị, ‘Hụnụ ndị agbataobi unu nʼanya, ma kpọkwanụ ndị iro unu asị.’ 44Ma asị m unu, hụnụ ndị iro unu nʼanya, kpekwaaranụ ndị na-esogbu unu ekpere. 45Nke a ga-eme ka unu bụrụ ụmụ nke Nna unu bi nʼeluigwe, onye na-eme ka anwụ mụọrọ ndị ọma na ndị ọjọọ, na-emekwa ka mmiri zooro ndị ezi omume na ndị ajọ omume. 46Ọ bụrụ naanị ndị hụrụ unu nʼanya ka unu na-ahụ nʼanya, gịnị ga-abụ ụgwọ ọrụ unu? Ọ bụladị ndị ọna ụtụ na-emekwa otu a. 47Ọ bụrụkwa na unu na-ekele naanị ndị enyi unu ekele, ọ dịghị ihe ọbụla dị iche nʼebe unu na ndị ọzọ nọ. Nʼihi na ndị na-amaghị Chineke na-emekwa otu ahụ. 48Ya mere, unu kwesiri izuoke nʼịrụ ọrụ ọma, dịka Nna unu bi nʼeluigwe si zukwaa oke.

Ụbọchị ndị a na-eso kalenda Julian nke Nzukọ Rọshịa (dịka Nzukọ Sabia na Jọjia na Ugwu Athos): 13 Jun na kalenda nzukọ bụ 26 Jun na kalenda obodo. Nzukọ ndị na-eji kalenda ọhụrụ (Gris, Romania, Bulgaria, Ukraine…) na-eme mmemme ndị na-adịghị agbanwe agbanwe na ndị nsọ n’ụbọchị obodo ahụ n’onwe ya, ụbọchị 13 tupu mgbe ahụ, ụfọdụ ihe ọgụgụ ha dịkwa iche; Ista na ụbọchị ndị dabere na ya bụ otu.

Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike