Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Jun 2027 › 25 Jun
Kalenda Katọlik
Ihe ọgụgụ Mass (Katọlik) — 25 Jun 2027
Fraịdee · Izu nke 12 nke Oge Nkịtị
Mmemme na ndị nsọ
Fraịdee nke izu nke 12 nke Oge Nkịtị
Ụbọchị izu · Agba ofufe: akwụkwọ ndụ
Obubu ọnụ na nchegharị
Ụbọchị nchegharị
Fraịdee ọ bụla bụ ụbọchị nchegharị; ọgbakọ ndị bishọp ọ bụla na-ekpebi otú a ga-esi debe ya: izere anụ ma ọ bụ omume nchegharị ọzọ. Obubu ọnụ na-ejikọ ndị dị afọ 18 ruo 59, izere anụ site nʼafọ 14.
Ihe ọgụgụ nke ụbọchị
Ihe ọgụgụ mbụ
1Mgbe Ebram gbara iri afọ itoolu na itoolu, Onyenwe anyị gosiri ya onwe ya sị ya, “Abụ m Chineke Onye pụrụ ime ihe niile. Jegharịa ije nʼihu m, bụrụ onye na-enweghị ịta ụta ọbụla. 9Chineke gwara Ebraham okwu sị ya, “Ma nʼebe ị nọ, ị ghaghị irube isi imezu ihe ọgbụgba ndụ m kwuru, gị onwe gị na ụmụ ụmụ gị ndị ga-esote gị, ruo ọgbọ niile. 10Nke a bụ ọgbụgba ndụ dị nʼetiti mụ na gị na ụmụ ụmụ gị ndị ga-esote gị, ọgbụgba ndụ nke unu na-aghaghị idebe. A ga-ebi nwoke ọbụla nʼetiti unu ugwu. 15Chineke gwakwara Ebraham sị, “Ma nʼebe Serai nwunye gị nọ, ị gaghị akpọkwa ya Serai ọzọ, kama aha ya ga-abụ Sera. 16Aga m agọzi ya, sitekwa na ya nye gị nwa nwoke. Aga m agọzi ya ruo na ọ ga-abụ nne nke ọtụtụ mba. Ndị eze ga-achị ọtụtụ mmadụ ga-esite na ya pụta.” 17Ebraham dara kpuo ihu nʼala, chịakwa ọchị nʼobi ya sị, “Ọ bụ onye gbara narị afọ ka a ga-amụrụ nwa? Sera, onye gbara iri afọ itoolu ọ ga-amụ nwa?” 18Ebraham gwara Chineke sị, “A sịkwa na ị ga-ekwe mee ka Ishmel bụrụ onye dị ndụ nʼihu gị.” 19Ma Chineke zara sị ya, “Ee, kama Sera nwunye gị ga-amụtara gị nwa nwoke. Ị ga-agụ ya Aịzik. Ọgbụgba ndụ m ga-adịkwara ya na agbụrụ ya ruo mgbe ebighị ebi. 20Ma banyere Ishmel, anụla m ihe i kwuru. Aga m agọzi ya mee ya ka ọ baa ụba ma dịkwa ukwuu nʼọnụọgụgụ. Ọ ga-aghọ nna ndị eze iri na abụọ. Aga m eme ya ka ọ ghọọ mba dị ukwuu. 21Ma ọgbụgba ndụ m ka m ga-eme ka o guzosie ike nʼebe Aịzik nọ, onye Sera ga-amụtara gị nʼoge dịka ugbu a nʼafọ ọzọ.” 22Mgbe ọ gwasịrị Ebraham okwu, Chineke si nʼebe ọ nọ pụọ.
Abụ Ọma nzaghachi
1Abụ nrigo. Ngọzị na-adịrị ndị niile na-atụ egwu Onyenwe anyị, ndị na-aga ije nʼirube isi nye ya. 2Ị ga-eri mkpụrụ ọrụ aka gị; ọtụtụ ngọzị na ihe ịga nke ọma ga-abụ nke gị. 3Nwunye gị ga-adị ka osisi vaịnị na-amị mkpụrụ nʼime ụlọ gị; ụmụ gị ndị ikom ga-adịkwa ka ome osisi oliv gburugburu tebul gị. 4Otu a ka a ga-esi gọzie nwoke ahụ na-atụ egwu Onyenwe anyị. 5Ka Onyenwe anyị gọzie gị site na Zayọn ụbọchị niile nke ndụ gị; ka i hụkwa ọdịmma Jerusalem,
Oziọma
1Ọtụtụ mmadụ sooro Jisọs mgbe o si nʼugwu ahụ rịdata. 2Mgbe ha na-aga nʼụzọ, otu onye ekpenta bịakwutere ya kpọọ isiala nye ya, rịọ ya sị, “Onyenwe m, ọ bụrụ na ị chọrọ, ị pụrụ ime ka m dị ọcha.” 3O setịpụrụ aka ya, metụ ya sị, “Achọrọ m ka ị dị ọcha, dịrịkwa ọcha!” Ngwangwa, ekpenta ahụ lara. 4Jisọs nyere nwoke ahụ iwu sị ya, “Hụ na ịgwaghị onye ọbụla, kama gaa gosi onye nchụaja onwe gị, chụọkwa aja onyinye dịka Mosis, nyere nʼiwu, ka ọ bụrụ ihe ama nye ya.”
Kalenda Rom n’ozuzu; ọgbakọ ndị bishọp nwere ike ibuga ụfọdụ mmemme (Epifani, Mgbago n’Eluigwe, Ahụ na Ọbara Kraịst) n’ụbọchị Sọnde ma ọ bụ tinye nke ha. Akwụkwọ ọgụgụ: usoro Sọnde B, afọ ụbọchị izu I.
Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike