Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Jun 2027 › 27 Jun
Kalenda Katọlik
Ihe ọgụgụ Mass (Katọlik) — 27 Jun 2027
Sọnde · Izu nke 13 nke Oge Nkịtị
Mmemme na ndị nsọ
Sọnde nke 13 nke Oge Nkịtị
Sọnde · Agba ofufe: akwụkwọ ndụ
Ihe ọgụgụ nke ụbọchị
Ihe ọgụgụ mbụ
Ọ dịghị na nsụgharị a
Abụ Ọma nzaghachi
1Abụ Ọma. Abụ nke ido obieze Devid nsọ. Aga m eto gị, O Onyenwe anyị, nʼihi na i sitere nʼebe dị omimi dọpụta m. I kweghị ka ndị iro m chịa m ọchị. 3O Onyenwe anyị, i si nʼala ili kpọpụta m, i mere ka m dịrị ndụ. 4Bụkuonụ Onyenwe anyị abụ, unu ndị nsọ ya, toonu aha nsọ ya. 5Iwe ya adịghị adịgide tee anya, ma ime amara ya na-adị ruo ebighị ebi! Ịkwa akwa nwere ike dịrị ogologo abalị niile, ma iti mkpu ọṅụ ga-adị nʼụtụtụ. 10O Onyenwe anyị, gee m ntị ma meere m ebere; O Onyenwe anyị, bụụrụ m onye inyeaka. 11I meela ka iti mkpu akwa m ghọọ ite egwu; ị napụrụ m akwa mkpe m, ma yinye m ọṅụ dịka akwa mmemme. 12I mere nke a ka obi m bụọ maka otuto gị, ghara ịnọ nwayọọ. O Onyenwe anyị Chineke m, aga m eto gị ruo mgbe ebighị ebi.
Ihe ọgụgụ nke abụọ
7Ma ebe unu babigara ụba oke nʼihe niile unu nwere, nʼokwukwe, na okwu, nʼihe ọmụma, na ịnụ ọkụ nʼobi, na ịhụnanya unu hụrụ anyị, lezie unu anya hụ na unu babigakwara ụba oke nʼamara nke inye ihe a. 9Nʼihi na unu maara ụdị amara nke Onyenwe anyị Jisọs Kraịst nwere. Ọ bụ ezie na ọ bụ ọgaranya, ma ọ họọrọ ịbụ ogbenye nʼihi unu, ka unu onwe unu site nʼogbenye ya bụrụ ọgaranya. 13Nzube m abụghị ka unu nye nʼụzọ ihe ga-esi siere unu ike nʼihi na unu nyere. Kama ka e nwe nhatanha. 14Ugbu a, ọ bụ ihe dị mma ka unu nyere ndị ọzọ nọ na mkpa aka. Mgbe unu ga-anọkwa na mkpa, ha ga-enyere unu aka ma ha nwee hie nne. Nʼụzọ dị otu a, a ga-enwe nhatanha. 15Nke a bụkwa ihe akwụkwọ nsọ kwuru, “Onye ahụ chịkọtara hie nne enweghị karịa. Onye nke chịkọtara ihe dị nta enweghị ihe fọdụrụ ya inweta ihe ọ chọrọ.”
Oziọma
21Mgbe Jisọs jiri ụgbọ mmiri gafee nʼakụkụ nke ọzọ, ọtụtụ igwe mmadụ zukọrọ gbaa ya gburugburu mgbe ọ nọ nʼakụkụ osimiri. 22Ma otu nʼime ndịisi ụlọ ekpere nke aha ya bụ Jairọs bịara, mgbe ọ hụrụ ya, ọ dara nʼala nʼụkwụ ya, 23rịọsie ya arịrịọ ike sị, “Ada m nwanyị nke nta nọ nʼọnụ ọnwụ ugbu a. Biko, bịa ka ị bikwasị ya aka gị ka agwọ ya, ka ọ dịkwa ndụ.” 24Ya mere, Jisọs soro ya gawa. Oke igwe mmadụ sokwa ya na-akpagbu ya. 25Ma otu nwanyị nọkwa nʼebe ahụ, onye nọrịị na-arịa ọrịa oruru ọbara afọ iri na abụọ. 26Ọ taala ahụhụ dị ukwuu nʼaka ndị dibịa, mefukwaa ihe niile o nwere. Ma kama ọrịa ya ịdị mma, ọ na-aga nʼihu ịdị njọ. 27Ebe ọ nụrụla akụkọ banyere Jisọs, o sooro igwe mmadụ ndị ahụ, sitere nʼazụ metụ uwe ya aka. 28Nʼihi na o kwuolarị nʼime obi ya sị, “Ọ bụrụ nnọọ na m enwe ike metụ naanị uwe ya aka, a ga-agwọkwa m.” 29Ngwangwa oruru ọbara ya kwụsịrị. Ọ matakwara nʼime onwe ya na ya enwerela onwe ya site nʼọrịa ya. 30Nʼotu oge ahụ Jisọs matara na ike esitela ya nʼahụ pụọ. Ọ tụgharịrị gburugburu nʼetiti igwe mmadụ ahụ jụọ sị, “Onye metụrụ uwe m aka?” 31Ndị na-eso ụzọ ya sịrị, “Lee ọtụtụ igwe mmadụ gbara gị gburugburu, i sikwa aṅaa na-ajụ, ‘Onye metụrụ uwe m aka?’ ” 32Ma Jisọs gara nʼihu na-ele anya gburugburu ịhụ onye mere ya. 33Ma nwanyị ahụ, ebe ọ matara ihe mere nʼahụ ya, bịara nʼegwu nʼịma jijiji daa nʼụkwụ ya, gwa ya eziokwu niile. 34Ọ sịrị ya, “Ada m nwanyị, okwukwe gị agwọọla gị. Laa nʼudo nwerekwa onwe gị site nʼọrịa gị.” 35Mgbe ọ ka nọ na-ekwu okwu, ụfọdụ ndị mmadụ sitere nʼụlọ onyeisi ụlọ ekpere bịara sị, “Ada gị nwanyị anwụọla, olee ihe mere i ji esogbu onye ozizi a ọzọ?” 36Ma ka ọ nụrụ ihe ha kwuru, Jisọs gwara onyeisi ụlọ ekpere ahụ sị ya, “Atụla egwu, naanị kwere.” 37O kweghị ka onye ọbụla ọzọ soro ya ma ọ bụghị Pita, na Jemis na Jọn nwanne Jemis. 38Mgbe ha bịarutere nʼụlọ onyendu ụlọ ekpere ahụ, ọ nụrụ ụzụ hụkwa ọtụtụ mmadụ ka ha nọ na-akwa akwa na-etikwa mkpu akwa. 39Mgbe ọ batara, ọ sịrị ha, “Gịnị mere unu ji na-akwa akwa na-etikwa mkpu akwa? Nwatakịrị a anwụghị anwụ, ọ na-arahụ ụra!” 40Ma ha chịrị ya ọchị. Mgbe ọ chụpụsịrị ha niile nʼezi, ọ kpọọrọ nne na nna nwantakịrị ahụ, na ndị ya na ha so, banye nʼime ụlọ ebe nwantakịrị ahụ dina. 41O jidere ya nʼaka sị ya, “Talita koum!” (nke pụtara, “Nwa agbọghọ nta, asị m gị bilie!”). 42Otu mgbe ahụ nwaagbọghọ nta ahụ biliri ọtọ bido ijegharị (ọ gbara afọ iri na abụọ). Nke a jụrụ ha niile anya nke ukwuu. 43Ma ọ dọsiri ha aka na ntị ike, ka ha ghara ịgwa onye ọbụla ihe mere. Ọ sịrị ha, “Nyenụ ya nri ka o rie.”
Ndị nsọ nke ụbọchị
- Onye nsọ Sirịl nke Aleksandria, Bishọp na Onye nkuzi nke Chọọchị
Kalenda Rom n’ozuzu; ọgbakọ ndị bishọp nwere ike ibuga ụfọdụ mmemme (Epifani, Mgbago n’Eluigwe, Ahụ na Ọbara Kraịst) n’ụbọchị Sọnde ma ọ bụ tinye nke ha. Akwụkwọ ọgụgụ: usoro Sọnde B, afọ ụbọchị izu I.
Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike