Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Jun 2027 › 24 Jun

Kalenda Ọtọdọks · 11 Jun (Kalenda ochie)

Ihe ọgụgụ Ọtọdọks nke ụbọchị — 24 Jun 2027

Tọọzdee · Izu nke 1 mgbe Pentikọọsụ gasịrị · Olu 7

Mmemme na ndị nsọ

Holy Apostles Bartholomew and Barnabas (1st C)

Izu na-enweghị obubu ọnụ

Ọ dịghị obubu ọnụ

Nke a na-eso iwu ndị mọnk. Nʼparish, a na-ekpebi ọtụtụ obubu ọnụ ya na onye na-anụ nkwupụta mmadụ, dịka ahụike, afọ na ọnọdụ si dị.

Ihe ọgụgụ nke ụbọchị

Ofufe mgbede: ihe ọgụgụ

1Pt 1:3–9

3Otuto dịrị Chineke Nna Onyenwe anyị Jisọs Kraịst! Site nʼịba ụba nke ebere ya, o nyela anyị ndụ ọhụrụ baa nʼolileanya dị ndụ site na mbilite nʼọnwụ Jisọs Kraịst. 4Anyị nwekwara ihe nketa nke na-apụghị imebi emebi, nke na-agaghị ere ure, maọbụ gbanwee ụdịdị ya, nke e debeere anyị nʼeluigwe. 5Anyị bụ ndị e sitere nʼokwukwe na-echekwa nʼike Chineke, tutu ruo ọbịbịa nzọpụta ahụ, nke a na-ejikere ime ka ọ pụta ìhè nʼọgwụgwụ oge. 6Nʼime ihe ndị a ka unu na-aṅụrị oke ọṅụ, ọ bụ ezie na nʼoge ndị a dị nta, unu agabigala ọtụtụ ihe mgbu nʼihi ụdị ọnwụnwa dị iche iche bịakwasịrị unu. 7Ọnwụnwa ndị a na-abịa ime ka okwukwe unu, nke dị oke ọnụahịa karịa ọlaedo na-ala nʼiyi nʼagbanyeghị na e ji ọkụ nụchaa ya; bụrụ nke ga-eweta otuto, na ebube, na nsọpụrụ, mgbe e mere ka Jisọs Kraịst pụta ìhè. 8Ọ bụ ezie na unu ejibeghị anya unu hụ ya mgbe ọbụla, ma unu hụrụ ya nʼanya, ọ bụkwa ezie na unu adịghị ahụ ya anya ugbu a, ma unu kwere na ya. Unu jupụtakwara nʼọṅụ ahụ dị ebube nke ọnụ na-apụghị ịkọwa. 9Ụgwọ ọrụ ọzọ unu ga-enweta nʼihi okwukwe unu nʼime ya ga-abụ nzọpụta a ga-azọpụta mkpụrụobi unu.

Ofufe mgbede: ihe ọgụgụ

1Pt 1:13–19

13Nʼihi ya, werenụ uche unu niile jikere ịrụ ọrụ, anya dokwaa unu. Nweenụ olileanya zuruoke nʼamara nke a ga-ewetara unu mgbe a ga-ekpughe Jisọs Kraịst. 14Dị ka ụmụ na-erube isi, unu ekwela ka ihe ọjọọ ndị ahụ na-agụ unu agụụ mgbe unu nọ nʼọchịchịrị, na-achị ndụ unu. 15Kama bụrụnụ ndị dị nsọ nʼihe niile unu na-eme, dịka onye kpọrọ unu si dị nsọ. 16Nʼihi na e dere ya ede, “Dịnụ nsọ, nʼihi na adị m nsọ.” 17Ebe unu na-akpọku Nna ahụ na-ekpe onye ọbụla ikpe dị ka ọrụ ya sịrị dị na-eleghị mmadụ anya nʼihu, bienụ ndụ unu nʼịtụ egwu Chineke, dịka ndị mbịarambịa nʼụwa a. 18Nʼihi na unu matara na-ejighị ihe pụrụ imebi emebi, dịka ọlaọcha na ọlaedo gbapụta unu site nʼibi ndụ ọjọọ ahụ nna nna unu ha nyefere unu nʼaka 19kama ọ bụ ọbara dị oke ọnụahịa nke Kraịst bụ nwa atụrụ na-enweghị ntụpọ ọbụla maọbụ ọrụsị.

Ofufe mgbede: ihe ọgụgụ

1Pt 2:11–24

11Nʼihi ya, ndị enyi m, ana m arịọ unu, dịka ndị bụ ọbịa na ndị na-agba ọsọ ndụ nʼụwa a, nke unu bụ, na-asị unu, wezuganụ onwe unu site nʼagụụ mmehie nke na-ebuso mkpụrụobi unu agha. 12Bienụ ezi ndụ nʼetiti ndị mba ọzọ, ka ọ ga-abụ na a sị na ha ebo unu ebubo ime ihe ọjọọ, ha ga-ahụ ọrụ ọma unu, ma nye Chineke otuto nʼụbọchị ahụ ọ ga-abịa. 13Werenụ onwe unu nyefee, nʼihi Onyenwe anyị, nʼokpuru ọchịchị niile e guzobere nʼetiti ụmụ mmadụ, ma ọchịchị ahụ ọ bụ nke eze, dịka onye ike ya kacha nke ibe ya, 14maọbụ nke ọchịchị gọvanọ, onye e guzobere nʼihi ịta ndị na-eme ihe ọjọọ ahụhụ, na ito ndị na-eme ezi ihe otuto. 15Nʼihi na ọ bụ uche Chineke na unu ga-esite nʼezi ọrụ unu kpuchie ọnụ ndị ahụ na-esite na-amaghị ihe ha, na-ekwu okwu nzuzu. 16Na-ebinụ ndụ dị ka ndị nwere onwe ha, ma unu ejikwala mnwere onwe unu mere ihe mkpuchi nke ajọ ihe. Bienụ dịka ụmụodibo Chineke. 17Sọpụrụnụ mmadụ niile dịka o si kwesi. Gosi ndị niile kwere ekwe ịhụnanya. Tụọ Chineke egwu, ma na-asọpụrụ eze. 18Ndị ohu, ruberenụ ndị nwe unu isi, na-enyekwa ha nsọpụrụ na ugwu ruuru ha. Unu emela nke a nye naanị ndị bụ ezi mmadụ, na ndị nwere obiọma nʼebe unu nọ, kama meekwanụ ya ọ bụladị nye ndị afọ tara mmiri. 19Nʼihi na nke a bụ ihe inye ekele ma ọ bụrụ na unu ejiri ntachiobi na-edi ahụhụ na-ezighị ezi na-adakwasị unu, nʼihi na unu na-eme ihe Chineke na-achọ. 20Ma o nweghị otuto ọbụla dịrị unu mgbe a tara unu ahụhụ nʼihi na unu mejọrọ, unu na-edikwa ya? Ma ọ bụrụ na unu enwee ntachiobi mgbe a na-ata unu ahụhụ nʼihi ihe ọma unu na-eme, nke a na-ewetara Chineke otuto. 21Ọ bụ nʼihi ihe dị otu a, ka e jiri kpọọ unu, nʼihi na Kraịst hụrụ ahụhụ nʼihi unu. Ọ bụkwa ihe ịmaatụ nye unu. Na-esonụ nzọ ụkwụ ya. 22“O nweghị mgbe ọbụla o mehiere, o nwekwaghị mgbe onye ọbụla nụrụ okwu aghụghọ nʼọnụ ya.” 23O kwutọghị onye ọbụla mgbe ha na-ekwutọ ya. Ọ baghị mba ọbụla mgbe ha na-ata ya ahụhụ, kama o were ya nyefee nʼaka onye ahụ na-ekpe ikpe ziri ezi. 24Nʼelu obe ahụ, o buuru mmehie anyị niile bokwasị onwe ya mgbe ọ nwụrụ, ime ka anyị nwee ike ịbụ ndị nwụrụ anwụ nʼebe mmehie dị; ma dịrị ndụ nʼebe ezi omume dị. Ọ bụkwa site nʼapa ọnya dị ya nʼahụ ka o ji gwọọ unu.

Ofufe ụtụtụ: Oziọma

Jọn 21:15–25

15Mgbe ha risiri nri ụtụtụ, Jisọs sịrị Saimọn Pita, “Saimọn nwa Jọn, ị hụrụ m nʼanya karịa ndị a niile?” Ọ sịrị ya, “E, Onyenwe anyị, ị maara na m hụrụ gị nʼanya.” Jisọs sịrị ya, “Na-azụ ụmụ atụrụ m.” 16Jisọs sịrị ya nke ugboro abụọ, “Saimọn nwa Jọn, ị hụrụ m nʼanya?” Ọ sịrị, “E, Onyenwe anyị, ị maara na m hụrụ gị nʼanya.” Ọ sịrị ya, “Na-elekọta atụrụ m.” 17Ọ sịrị ya nke ugboro atọ, “Saimọn nwa Jọn, ị hụrụ m nʼanya?” O wutere Pita na ọ sịrị ya nke ugboro atọ, “ị hụrụ m nʼanya?” Ọ sịrị ya, “Onyenwe anyị, ị mazuru ihe niile, ị makwaara na m hụrụ gị nʼanya.” Jisọs sịrị ya, “Na-azụ atụrụ m. 18Nʼezie, nʼezie asị m gị, mgbe ị bụ okorobịa ị na-eke ajị nʼukwu, gaa ebe ị chọrọ ịga. Ma mgbe ị ghọrọ agadi, ị ga-esetipụ aka gị, onye ọzọ ga-ekee gị ihe okike nʼukwu ma duru gị gaa ebe ị na-achọghị ịga.” 19O kwuru nke a iji gosi ụdị ọnwụ ọ ga-anwụ iji nye Chineke otuto. Mgbe nke a mesịrị, ọ sịrị ya, “Soro m.” 20Pita chigharịrị hụ onye ahụ na-eso ụzọ ya nke Jisọs hụrụ nʼanya ka ọ na-esokwa ha nʼazụ. (Ọ bụ onyeozi ahụ dabeere ya nʼobi na nri anyasị, nke sịrị, “Onyenwe anyị, onye ga-arara gị nye?”) 21Mgbe Pita hụrụ ya, ọ sịrị Jisọs, “Onyenwe anyị kedụ maka onye a?” 22Jisọs sịrị ya, “Ọ bụrụ na m achọọ ka ọ nọgide ruo mgbe m ga-alọghachi gịnị ka nke a bụ nye gị? Soro m.” 23Ya mere, akụkọ a gbasara nʼetiti ụmụnna na onye a na-eso ụzọ ya agaghị anwụ. Ma Jisọs asịghị ya na ọ gaghị anwụ anwụ, kama, “Ọ bụrụ na m chọrọ ka ọ nọgide ruo mgbe m ga-abịa, ọ gbasara gị?” 24Nke a bụ onye ahụ na-eso ụzọ ya onye na-agba ama ihe ndị a niile, ma deekwa ha nʼakwụkwọ. Anyị makwaara na ama ya bụ eziokwu. 25Ma ọ dị ọtụtụ ihe ndị ọzọ Jisọs mere. Ọ bụrụ na e dee ha niile nʼakwụkwọ, ọ dịghị m ka ụwa niile ọ ga-aba akwụkwọ a ga-ede banyere ha.

Akwụkwọ ozi

Rom 1:28–2:9

28Ya mere, ebe ha kpachapụrụ anya jụ ịmata onye Chineke bụ, Chineke nyere ha akọnuche ndị nzuzu, nke mere ka ha na-eme ihe ọjọọ niile nke ajọ echiche obi ha chepụtara. 29Ha jupụtara nʼajọ omume na mmehie niile, anya ukwu na aghụghọ. Ha jupụtakwara nʼekworo, na igbu mmadụ, na esemokwu, na uche gbagọrọ agbagọ na ịkpọ asị. Ha bụ ndị na-ekwu okwu azụ, 30na ndị nkwutọ na ndị kpọrọ Chineke asị, na ndị na-akparị mmadụ na ndị mpako na ndị na-anya isi. Ha na-atụpụta ụzọ ọhụrụ ime ihe ọjọọ, ha adịghị asọpụrụ ndị mụrụ ha. 31Ha bụkwa ndị na-enweghị nghọta, ndị na-enweghị okwukwe, ndị obi ọjọọ na ndị na-enweghị obi ebere. 32Ha maa na Chineke nyere iwu dị ike na ndị na-ebi ndụ dị otu a kwesiri ọnwụ, ma ha gara nʼihu na-eme ihe ndị a, ma na-akwalịkwa mmụọ ndị ọzọ ka ha soro na-eme ha. 2:1Nʼihi ya, ị nweghị ngọpụ, onye ọbụla ị bụ, mgbe ị na-ekpe ndị ọzọ ikpe. Nʼihi na mgbe ị mara onye ọzọ ikpe, ọ bụ onwe gị ka ị na-ama ikpe maka na gị onwe gị na-emekwa ụdị ihe ndị ahụ. 2Ma anyị maara na Chineke na-ekpe ndị na-eme ihe ọjọọ dị otu a ikpe nʼụzọ ziri ezi. 3Gị bụ mmadụ, gịnị mere i ji na-ama ndị na-eme ihe dị otu a ikpe mgbe gị onwe gị na-eme otu ihe ahụ. I chere na ị ga-agbanarị ikpe Chineke? 4Ka ị na-eleda obiọma Chineke, na nnagide ọ na-anagide ndụ ọjọọ gị, na ogologo ntachiobi ya anya? Ị maghị na obiọma Chineke nwere nʼebe ị nọ kwesiri ime ka i site na mmehie gị chegharịa? 5Ma nʼihi isiike gị na obi gị kpọrọ nkụ nke enweghị nchegharị, ị na-akpakọtara onwe gị ọnụma nke Chineke nʼụbọchị oke iwe ya, mgbe a ga-ekpughe ikpe ya ziri ezi. 6Ọ ga-akwụghachi onye ọbụla dịka ọrụ ya siri dị. 7Chineke ga-enye ndị niile sitere na ntachiobi na ezi ọrụ na-achọ otuto na nsọpụrụ na ndụ ahụ na-adịgide adịgide bụ ndụ ebighị ebi. 8Ma ndị niile na-akpa iche iche, ndị jụkwara isoro eziokwu ahụ, ndị na-anọgidekwa na-eme ihe ọjọọ, ka a ga-ata ahụhụ, gosi ha iwe ọkụ na ọnụma. 9Nsogbu na iru ụjụ ga-abịakwasị ndị niile na-eme ihe ọjọọ, mbụ, ọ ga-adịrị ndị Juu, emechaa, ọ ga-adịkwara ndị mba ọzọ.

Akwụkwọ ozi (maka ndị ozi)

Ọrụ 11:19–26, 29–30

19Ugbu a, ndị ahụ niile gbasasịrị nʼihi mkpagbu ahụ bidoro mgbe a tụgburu Stivin na nkume, jeruru akụkụ Fonisia na Saiprọs na Antiọk na-ekwusa oziọma ahụ naanị nʼetiti ndị Juu. 20Ma otu ọ dị, ụfọdụ nʼime ndị ikom ndị ahụ sitere nʼakụkụ Saiprọs na Sirini gara Antiọk, malite ikwusara ndị Griik oziọma banyere Onyenwe anyị Jisọs. 21Onyenwe anyị gọziri mgbalị ha niile. Nʼihi na ọtụtụ mmadụ chegharịrị kwere nʼOnyenwe anyị. 22Mgbe nzukọ dị na Jerusalem nụrụ ihe ndị a, ha zipụrụ Banabas ka ọ gaa Antiọk. 23Mgbe o rutere, hụ ihe amara Chineke rụrụ nʼetiti ha. Ọ ṅụrịrị ọṅụ, mgbakwaa ha niile ume, gwa ha ka ha were obi ha niile nọgide nʼime Onyenwe anyị. 24Ọ bụ ezigbo mmadụ, onye jupụtara na Mmụọ Nsọ na okwukwe. O nwekwara okwukwe dị ebube, nʼihi ya ọtụtụ mmadụ chegharịkwara bịakwute Onyenwe anyị. 25Emesịa, ọ gara Antiọk obodo Tasọs ịchọ Sọl. 26Mgbe ọ chọpụtara ya, o duuru ya bịa nʼAntiọk. Ihe ha ka otu afọ, ka ha na-ezukọ nʼụlọ chọọchị na-akụziri ọtụtụ igwe mmadụ ihe. Ọ bụ nʼime Antiọk ka e buru ụzọ kpọọ ndị na-eso ụzọ ya ndị Kraịst. 29Ndị na-eso ụzọ ya kwekọrịtara ịtụkọta na iziga onyinye dị iche iche nye ndị kwere ekwe nọ na Judịa. Onye ọbụla nyekwara ihe dịka o nwere ike. 30Ha mere nke a, ha zigara ndị okenye ihe ha tụkọtara, site nʼaka Banabas na Sọl.

Oziọma

Mat 5:27–32

27“Unu nụrụ na e kwuru sị, ‘Akwala iko.’ 28Ma asị m unu, onye ọbụla lere nwanyị anya site na-agụụ ịkwa iko emeelarị mmehie ịkwa iko nʼime obi ya megide nwanyị ahụ. 29Nʼihi nke a, ọ bụrụ na anya aka nri gị na-eme ka i jehie, ghụpụ ya tufuo. Ọ kaara gị mma na i tufuru otu akụkụ ahụ gị baa nʼalaeze karịa na i ji ahụ zuruoke baa nʼọkụ ala mmụọ. 30Ọ bụrụ na aka nri gị na-eme ka i jehie, gbupụ ya tufuo. Ọ kaara gị mma na i tufuru otu akụkụ ahụ gị ma baa nʼalaeze eluigwe, karịa na i ji ahụ zuruoke ma baa nʼọkụ ala mmụọ. 31“E kwukwara sị, ‘Onye ọbụla chọrọ ịgbara nwunye ya alụkwaghị m, ga-ebu ụzọ dee akwụkwọ alụkwaghị m nye nwunye ya.’ 32Ma asị m unu, onye ọbụla gbara nwunye ya alụkwaghị m, ma ọ bụghị nʼihi ịkwa iko, ọ na-etinye nwanyị ahụ nʼọnọdụ ga-eme ka ọ kwaa iko. Ọ bụrụ na nwanyị ahụ alụọ di ọzọ, nwoke ahụ lụrụ nwanyị ahụ na-emekwa mmehie ịkwa iko.

Oziọma (maka ndị ozi)

Luk 10:16–21

16“Onye ọbụla gere unu ntị, ọ bụ mụ ka o gere ntị. Onye ọbụla jụrụ ịnabata unu, ọ bụ mụ ka ọ jụrụ ịnabata. Onye ọbụla jụrụ ịnabata m jụrụ ịnabata onye zitere m.” 17Iri mmadụ asaa na abụọ ahụ jiri ọṅụ lọta sị, “Onyenwe anyị, nʼaha gị, ọ bụladị ndị mmụọ ọjọọ rubeere anyị isi.” 18Ọ sịrị ha, “Ahụrụ m ekwensu ka o si nʼeluigwe daa dị ka amụma. 19Lee! Enyela m unu ikike ịzọkwasị agwọ na akpị ụkwụ, na imegide ike niile nke onye iro; ọ dịghị ihe ọbụla ga-emerụ unu ahụ. 20Otu ọ dị, unu aṅụrịla ọṅụ nʼihi na mmụọ ọjọọ rubere unu isi, kama ṅụrịanụ ọṅụ nʼihi na e deela aha unu nʼeluigwe.” 21Nʼotu oge ahụ, o jupụtara nʼọṅụ nke Mmụọ Nsọ kwuo sị, “Nna, Onyenwe eluigwe na ụwa, ana m ekele gị nʼihi na ị zonarịrị ihe ndị a nʼebe ndị ọkachamara na ndị nwere amamihe nọ, ma ị kpughere ihe ndị a niile nye ụmụntakịrị. E, Nna, otu a ka o si masị uche gị ime ya.

Ụbọchị ndị a na-eso kalenda Julian nke Nzukọ Rọshịa (dịka Nzukọ Sabia na Jọjia na Ugwu Athos): 11 Jun na kalenda nzukọ bụ 24 Jun na kalenda obodo. Nzukọ ndị na-eji kalenda ọhụrụ (Gris, Romania, Bulgaria, Ukraine…) na-eme mmemme ndị na-adịghị agbanwe agbanwe na ndị nsọ n’ụbọchị obodo ahụ n’onwe ya, ụbọchị 13 tupu mgbe ahụ, ụfọdụ ihe ọgụgụ ha dịkwa iche; Ista na ụbọchị ndị dabere na ya bụ otu.

Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike