Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Jun 2027 › 23 Jun
Kalenda Ọtọdọks · 10 Jun (Kalenda ochie)
Ihe ọgụgụ Ọtọdọks nke ụbọchị — 23 Jun 2027
Wenezdee · Izu nke 1 mgbe Pentikọọsụ gasịrị · Olu 7
Mmemme na ndị nsọ
Hieromartyr Timothy, Bishop of Prussa († 361-363)
Izu na-enweghị obubu ọnụ
Ọ dịghị obubu ọnụ
Nke a na-eso iwu ndị mọnk. Nʼparish, a na-ekpebi ọtụtụ obubu ọnụ ya na onye na-anụ nkwupụta mmadụ, dịka ahụike, afọ na ọnọdụ si dị.
Ihe ọgụgụ nke ụbọchị
Akwụkwọ ozi
18Nʼihi na e sitela nʼeluigwe kpughe ọnụma Chineke megide mmehie na ajọ omume niile nke ndị na-emebi iwu, ndị na-esite nʼajọ omume ha na-eguzogide eziokwu ahụ. 19Nʼihi na ndị a maara ihe ha kwesiri ịmata banyere Chineke. Ha maara ya nʼihi na Chineke nʼonwe ya emeela ka o doo ha anya. 20Nʼihi na site nʼoge Chineke kere ụwa na ihe niile dị nʼime ya, ụdịdị ya nke a na-apụghị ịhụ anya na ike nke ebighị ebi ya na ụdịdị ịdị nsọ ya ka e mere ka ọ pụta ìhè nye ụmụ mmadụ. Ụmụ mmadụ na-aghọta ihe ndị a site nʼihe ndị e kere eke. Nʼihi nke a ụmụ mmadụ enwekwaghị ngọpụ. 21Ọ bụ eziokwu na ha maara Chineke, ma ha anaghị asọpụrụ ya, ha anakwaghị enye ya ekele dịka Chineke. Echiche uche ha bụ ihe efu, nzuzu ha mere ka obi ha gbaa ọchịchịrị. 22Mgbe ha na-eche na ha bụ ndị maara ihe, ha amataghị na ha bụ ndị nzuzu. 23Kama ife Chineke na-adịghị anwụ anwụ ofufe, ha weere otuto ha kwesiri inye ya nye ihe ndị ahụ ha jiri aka ha kpụọ. Ihe ndị a yiri mmadụ na-anwụ anwụ, na nnụnụ, na ụmụ anụmanụ, na ihe na-akpụ akpụ nʼala. 24Nʼihi ya, Chineke hapụrụ ha ka ha mee ihe ọjọọ ndị ahụ na-agụ obi ha agụụ nye adịghị ọcha nke ịkwa iko, ha jikwa ahụ ha emerịta mpu nʼetiti onwe ha. 25Ha were okwu ụgha dochie nʼọnọdụ eziokwu banyere Chineke. Ha na-asọpụrụ, na-efekwa ihe e kere eke, ma hapụ Onye okike, onye a na-eto ruo ebighị ebi. Amen. 26Ọ bụ nke a mere Chineke jiri nyefee ha nʼaka agụụ anụ ahụ nke na-eme ihere. Nʼihi ya, ọ bụladị ndị inyom na ndị inyom ibe ha nọgidere na-enwe mmekọrịta nʼụzọ na-ezighị ezi. 27Ọzọkwa, kama ha na ndị inyom inwe mmekọrịta; ndị ikom ha họọrọ ka ha na ndị ikom ibe ha na-enwe ụdị mmekọrịta nke ha na ndị inyom kwesiri inwe. Nwoke na-edinakwuru nwoke ibe ya. Nʼụzọ dị otu a, ha natakwara ntaramahụhụ kwesiri ha nʼihi ihe ọjọọ ndị a ha na-eme.
Oziọma
20Ka m dọọ unu aka na ntị. Ọ bụrụ na ezi omume unu akarịghị ezi omume ndị Farisii na ndị ozizi iwu, unu apụghị ịba nʼalaeze eluigwe ma ọlị. 21“Unu nụrụ na-agwara ndị mmadụ nʼoge gara aga, sị, ‘Onye egbula mmadụ, onye ọbụla gburu mmadụ a ga-ekpe ya ikpe.’ 22Ma asị m unu, na onye ọbụla nke na-ewe iwe megide nwanna ya, na-enyefe onwe ya nʼaka ikpe. Onye ọbụla nke na-akpọ nwanna ya ‘ Raka,’ ya bụ Onye iberiibe, ga-aza ajụjụ nʼụlọikpe. Ọzọkwa, onye ọbụla nke kpọrọ nwanne ya, ‘Onye nzuzu,’ na-edo onwe ya ịba nʼọkụ ala mmụọ. 23“Ya mere, ọ bụrụ na ị gaa inye onyinye gị nʼebe ịchụ aja, ma cheta nʼebe ahụ na gị na nwanne gị adịghị nʼudo, 24hapụ onyinye gị nʼebe ịchụ aja, laa ka gị na nwanne gị kpezie. Mgbe unu mere udo, laghachi bịa nye onyinye gị. 25“Mee ọsịịsọ ka gị na onye kpọ gị eje ụlọ ikpe kpezie, mgbe ọ na-eburubeghị ikpe gị na ya jee nʼaka ọkaikpe, onye ga-enyefe gị nʼaka ndị nche, ma eleghị anya etinye gị nʼụlọ mkpọrọ. 26Nʼezie, agwa m gị, ị gaghị e si nʼebe ahụ pụta ruo mgbe ị kwụghachiri kobo niile i ji.
Ụbọchị ndị a na-eso kalenda Julian nke Nzukọ Rọshịa (dịka Nzukọ Sabia na Jọjia na Ugwu Athos): 10 Jun na kalenda nzukọ bụ 23 Jun na kalenda obodo. Nzukọ ndị na-eji kalenda ọhụrụ (Gris, Romania, Bulgaria, Ukraine…) na-eme mmemme ndị na-adịghị agbanwe agbanwe na ndị nsọ n’ụbọchị obodo ahụ n’onwe ya, ụbọchị 13 tupu mgbe ahụ, ụfọdụ ihe ọgụgụ ha dịkwa iche; Ista na ụbọchị ndị dabere na ya bụ otu.
Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike