Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Jun 2027 › 25 Jun

Kalenda Ọtọdọks · 12 Jun (Kalenda ochie)

Ihe ọgụgụ Ọtọdọks nke ụbọchị — 25 Jun 2027

Fraịdee · Izu nke 1 mgbe Pentikọọsụ gasịrị · Olu 7

Mmemme na ndị nsọ

Venerable Onuphrius the Great (4th C)

Izu na-enweghị obubu ọnụ

Ọ dịghị obubu ọnụ

Nke a na-eso iwu ndị mọnk. Nʼparish, a na-ekpebi ọtụtụ obubu ọnụ ya na onye na-anụ nkwupụta mmadụ, dịka ahụike, afọ na ọnọdụ si dị.

Ihe ọgụgụ nke ụbọchị

Akwụkwọ ozi

Rom 2:14–29

14Nʼezie, mgbe ndị mba ọzọ bụ ndị na-enweghị iwu sitere nʼobi ha mee ihe iwu kwuru, o gosiri na ha bụ iwu nye onwe ha, ọ bụ ezie na ha enweghị iwu ahụ e dere ede. 15Ha na-egosipụta na edeela ihe ndị ahụ iwu kwuru nʼobi ha. Akọnuche ha na-egosikwa na nke a bụ eziokwu, ebe ọ bụ na akọnuche ha na-ama ha ikpe mgbe ụfọdụ, ma na-agọpụrụ ha mgbe ụfọdụ. 16Dịka oziọma ahụ m na-ekwusa si kwuo, Chineke ga-ekpe ndụ nzuzo niile ụmụ mmadụ na-ebi ikpe, site na Kraịst Jisọs. 17Ma ugbu a, gị onye na-akpọ onwe gị onye Juu, onye tụkwasịrị obi gị nʼiwu ahụ, onye na-anyakwa isi na ị maara Chineke, 18ọ bụrụ na ị mara uche ya ma kwenyekwa nʼihe nke ka mma nʼihi na e ziri gị ihe site nʼiwu; 19ọ bụrụ na o doro gị anya na ị bụ onyendu nye ndị ìsì, bụrụkwa ìhè nye ndị nọ nʼọchịchịrị, 20ị na-agụkwa onwe gị dịka onye nkuzi nke ndị na-amaghị ihe, na onye nkuzi ụmụntakịrị, nʼihi na ị maara iwu nke ọma, jupụtakwa nʼamamihe na eziokwu. 21Gị onye na-akụziri mmadụ ibe gị ihe, ị na-akụzikwara onwe gị? Gị onye na-ekwusa ka mmadụ ezula ohi, ị na-ezu ohi? 22Gị onye na-asị mmadụ akwala iko, ị na-akwa iko? Gị onye na-akpọ arụsị ihe arụ, ị na-ezuru ihe dị nʼụlọ arụsị nʼohi? 23Gị onye na-anya isi na ị maara iwu, ị na-emenye Chineke ihere site nʼimebi iwu ahụ? 24Dịka esi dee ya, “Ndị mba ọzọ na-ekwulu aha Chineke nʼihi unu.” 25Obibi ugwu bara uru nʼezie ma ọ bụrụ na ị na-edebe iwu, ma ọ bụrụ na ị na-emebi iwu, obibi ugwu gị dịka mgbe i bighị ugwu. 26Ọ bụrụ na ndị e bighị ugwu na-edebe ihe iwu kwuru, ọ bụ na a gaghị agụ ebighị ugwu ha dịka obibi ugwu? 27Ya bụ, ndị ahụ a na-ebighị ugwu nʼanụ ahụ ma na-edebe iwu ga-ama unu ikpe, bụ ndị nwere iwu ahụ e dere nʼakwụkwọ na ndị e bikwara ugwu ma na-emebi iwu. 28Ị bụ ezigbo onye Juu abụghị nke elu ahụ. Ezigbo ibi ugwu abụkwaghị ihe a na-ahụ nʼanụ ahụ. 29Kama ezigbo onye Juu bụ onye ọbụla nke bụ ya nʼime mmụọ. Ezigbo obibi ugwu bụkwa nke ime obi, nke mmụọ, ọ bụghị nke e dere ede. Otuto ya esiteghị nʼaka mmadụ kama o sitere nʼaka Chineke.

Oziọma

Mat 5:33–41

33“Ọzọkwa, unu nụrụ na a gwara ndị mmadụ nʼoge gara aga sị, ‘Aṅụla iyi ụgha, kama mezuo ihe niile unu ṅụrụ nʼiyi nye Onyenwe anyị.’ 34Ma asị m unu aṅụla iyi ọbụla. Ejikwala eluigwe aṅụ iyi nʼihi na eluigwe bụ ebe ocheeze Chineke dị. 35Ejikwala ụwa aṅụ iyi nʼihi na ụwa bụ ebe mgbakwasị ụkwụ ya. Ejikwala Jerusalem aṅụ iyi nʼihi na ọ bụ obodo Eze ukwu ahụ. 36Ejikwala isi gị aṅụ iyi nʼihi na ị pụghị ime ka otu agịrị isi gị dị ọcha maọbụ dị oji. 37Aṅụla iyi ọbụla. Kama ka okwu unu bụrụ ‘E’ maọbụ ‘Ee’; ihe ọbụla gafere nke a sitere nʼaka ajọ onye ahụ. 38“Unu anụla na e kwuru sị, ‘Ọ bụ anya ka a kụkpọrọ, anya nʼọnọdụ anya. Ọ bụrụkwa otu eze ka e tipụrụ, eze nʼọnọdụ eze.’ 39Ma ana m asị unu eguzogidela onye bụ ajọ onye. Kama ọ bụrụ na mmadụ amaa gị ụra na ntị aka nri, tụgharịara ya ntị nke ọzọ. 40Ọ bụrụ na mmadụ agbaa gị akwụkwọ nʼụlọikpe, ka ọ nara gị uwe ime gị, nyekwa ya uwe nke elu gị. 41Ọ bụrụ na mmadụ esite nʼike chọọ ka i soro ya gaa puku nzọ ụkwụ atọ, soro ya gaa puku nzọ ụkwụ isii.

Ụbọchị ndị a na-eso kalenda Julian nke Nzukọ Rọshịa (dịka Nzukọ Sabia na Jọjia na Ugwu Athos): 12 Jun na kalenda nzukọ bụ 25 Jun na kalenda obodo. Nzukọ ndị na-eji kalenda ọhụrụ (Gris, Romania, Bulgaria, Ukraine…) na-eme mmemme ndị na-adịghị agbanwe agbanwe na ndị nsọ n’ụbọchị obodo ahụ n’onwe ya, ụbọchị 13 tupu mgbe ahụ, ụfọdụ ihe ọgụgụ ha dịkwa iche; Ista na ụbọchị ndị dabere na ya bụ otu.

Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike