Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Jun 2027 › 24 Jun
Kalenda Katọlik
Ihe ọgụgụ Mass (Katọlik) — 24 Jun 2027
Tọọzdee · Izu nke 12 nke Oge Nkịtị
Mmemme na ndị nsọ
Ọmụmụ Onye nsọ Jọn Onye na-eme baptizim
Mmemme ukwu · Agba ofufe: ọcha
Ihe ọgụgụ nke ụbọchị
Ihe ọgụgụ mbụ
1Geenụ m ntị, unu niile ndị bi nʼala mmiri gbara gburugburu, nụrụkwanụ nke a, unu ndị nọ na mba dị anya. Onyenwe anyị kpọrọ m tupu amụọ m. Ọ kpọrọ m aha m mgbe m ka nọ nʼime afọ nne m. 2O mere ka okwu sị m nʼọnụ dịrị nkọ dịka mma agha. O zobere m nʼaka ya kpuchie m. O mere m ka m dịrị ka àkụ dị nkọ nke o zoro nʼime akpa àkụ ya. 3Ọ sịrị m, “Ị bụ ohu m, Izrel. Ọ bụkwa site na gị ka m ga-eji gosi ịma mma na ike m.” 4Ma mụ onwe m sịrị, “Ọ bụ nʼefu ka m dọgburu onwe m nʼọrụ. Etufuola m ike m niile nʼihi ihe na-abụghị ihe. Ma ihe ruru m dị nʼaka Onyenwe anyị, ụgwọ ọrụ m dịkwa nʼaka Chineke m.” 5Ma ugbu a Onyenwe anyị na-asị, Onye ahụ kpụrụ m nʼafọ nne m ka m bụrụ onye na-ejere ya ozi; ka ọ kpọghachite Jekọb nye ya ka achịkọtakwa ndị Izrel nyekwa ya onwe ya, nʼihi na-abụ m onye nsọpụrụ dịrị nʼanya Onyenwe anyị, Chineke m aghọkwaarala m ike m. 6Ọ sịrị, “Ọ bụ ihe dị nta karịa, gị ị bụrụ m ohu, ịkpọghachita ebo niile nke Jekọb na ịkpọghachita ndị Izrel ndị m chebere. Aga m emekwa ka ị bụrụ ìhè nye ndị mba ọzọ, ka nzọpụta m site nʼaka gị ruo ndị bi na nsọtụ ụwa niile.”
Abụ Ọma nzaghachi
1Abụ nke dịrị onyeisi abụ. Abụ Ọma Devid. O Onyenwe anyị, ị nyochaala m, ị makwaara m nke ọma 2Ị maara mgbe m na-anọdụ ala na mgbe m na-eguzo ọtọ; site nʼebe dị anya, ị na-aghọta echiche obi m niile. 3Ị na-ahụzu ọpụpụ m na ndina ala m; ị mazukwara ụzọ m niile. 13Ọ bụ gị kpụrụ akụkụ niile dị m nʼahụ. Ọ bụkwa gị jikọtara ha niile ka ha bụrụ otu mmadụ nʼime afọ nne m. 14Ana m eto gị nʼihi na abụ m onye e sitere nʼoke egwu na ebube kee; ọrụ gị niile dị ebube; amaara m nke a nke ọma. 15Ụdịdị m abụghị ihe zoro ezo nʼebe ị nọ mgbe a kpụrụ m nʼebe nzuzo ahụ, mgbe a kpakọtara m nʼebe omimi nke ụwa.
Ihe ọgụgụ nke abụọ
22Mgbe o wepụsịrị ya, o mere Devid ka ọ bụrụ eze ha. Ọ gbara ama banyere ya sị, ‘Achọtala m Devid nwa Jesi, nwoke nke dị ka ọchịchọ obi m nke si dị. Ọ bụkwa onye ga-eme ihe niile m chọrọ ka o mee.’ 23“Jisọs onye si nʼezinaụlọ Devid pụta ka Chineke wetaara Izrel Onye nzọpụta ahụ bụ Jisọs, dịka o kwere nkwa izite. 24Ma tupu ọbịbịa ya, Jọn ekwusala nye ndị Izrel banyere baptizim nke nchegharị. 25Nʼoge Jọn na-arụsị ọrụ ya, ọ na-asị, ‘Onye ka unu chere na m bụ? Abụkwaghị m onye ahụ. Mba! Abụghị m ya. Ma otu onye ahụ na-abịa nʼazụ m, onye m na-erughị ịtọpụ eriri akpụkpọụkwụ ya.’ 26“Ya mere, ụmụnna m, ndị si nʼagbụrụ Ebraham na ndị niile na-atụ egwu Chineke, ozi nke nzọpụta a dịrị anyị niile.
Oziọma
57Mgbe oge zuru ka Elizabet mụọ nwa, ọ mụrụ nwa nwoke. 58Ndị agbataobi ya na ndị ikwu ya, ndị nụrụ otu Chineke si gosi ya ebere dị ukwuu, bịara soro ya ṅụrịa ọṅụ. 59Nʼabalị nke asatọ ha bịara ibi nwata ahụ ugwu na ịgụ ya aha. Ha na-achọ ịgụ ya Zekaraya bụ aha nna ya, 60ma Nne ya sịrị, “Mba, a ga-agụ ya Jọn.” 61Ha sịrị ya, “Ọ dịghị onye ọbụla nʼetiti ndị ikwu gị na-aza aha ahụ.” 62Ya mere, ha jiri ife aka jụọ nna ya, ihe ọ chọrọ ka akpọ nwata ahụ. 63Ọ rịọrọ ka e nye ya mbadamba ihe e ji ede ihe, o deere “Aha ya bụ Jọn.” Nke a jukwara mmadụ niile anya. 64Ngwangwa, ọnụ ya meghere, atọpụkwara ire ya. Ya ebido ikwu okwu ma na-etokwa Chineke. 65Ibubo wụrụ ndị agbataobi ha niile nʼahụ, ndị mmadụ kọkwara akụkọ banyere ihe ndị a niile ruo obodo niile dị nʼakụkụ ugwu Judịa. 66Ndị niile nụrụ akụkọ a chere nʼobi ha na-ajụ sị, “Gịnịkwa ka nwa nke a gaje ịbụ?” Nʼihi na aka Onyenwe anyị dịnyeere ya. 80Nwata ahụ toro, bụrụ onye dị ike nʼime mmụọ. O biri nʼime ọzara tutu ruo mgbe oge zuru igosi ụmụ Izrel onwe ya.
Ndị nsọ nke ụbọchị
- Ọmụmụ Onye nsọ Jọn Onye na-eme baptizim
Kalenda Rom n’ozuzu; ọgbakọ ndị bishọp nwere ike ibuga ụfọdụ mmemme (Epifani, Mgbago n’Eluigwe, Ahụ na Ọbara Kraịst) n’ụbọchị Sọnde ma ọ bụ tinye nke ha. Akwụkwọ ọgụgụ: usoro Sọnde B, afọ ụbọchị izu I.
Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike