Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Jun 2027 › 7 Jun
Kalenda Ọtọdọks · 25 Mee (Kalenda ochie)
Ihe ọgụgụ Ọtọdọks nke ụbọchị — 7 Jun 2027
Mọnde · Izu nke 6 nke Ista · Olu 5
Mmemme na ndị nsọ
Third Finding of the Honorable Head of the Holy Glorious Prophet, Forerunner and Baptist John (c. 850)
Obubu ọnụ
Ọ dịghị obubu ọnụ
Nke a na-eso iwu ndị mọnk. Nʼparish, a na-ekpebi ọtụtụ obubu ọnụ ya na onye na-anụ nkwupụta mmadụ, dịka ahụike, afọ na ọnọdụ si dị.
Ihe ọgụgụ nke ụbọchị
Ofufe mgbede: ihe ọgụgụ
Ọ dịghị na nsụgharị a
Ofufe ụtụtụ: Oziọma
17Akụkọ a banyere ya ruru Judịa niile na obodo nta niile gbara ya gburugburu. 18Ndị na-eso ụzọ Jọn kọọrọ ya maka ihe ndị a niile. Jọn kpọrọ mmadụ abụọ nʼime ndị na-eso ụzọ ya, 19zie ha ka ha jekwuru Onyenwe anyị jụọ ya ajụjụ sị, “Ọ bụ gị bụ onye ahụ ga-abịa. Ka anyị ga-ele anya ọbịbịa onye ọzọ?” 20Mgbe ụmụ nwoke ahụ bịakwutere ya, ha sịrị, “Jọn omee baptizim ziri anyị ka anyị jụọ gị sị, ‘Ọ bụ gị bụ onye ahụ ga-abịa ka anyị ga-ele anya ọbịbịa onye ọzọ?’ ” 21Mgbe ahụ ọ gwọrọ ọtụtụ ndị nwere ọrịa, na nrịa nrịa dị iche iche, na mmụọ ọjọọ. O mekwara ka ọtụtụ ndị kpuru ìsì hụ ụzọ ọzọ. 22Ọ zaghachiri ndị ozi ahụ sị, “Laghachinụ azụ gaa kọrọ Jọn ihe unu hụrụ na nke unu nụrụ; ndị kpuru ìsì na-ahụ ụzọ, ndị ngwụrọ na-aga ije, ndị ekpenta ka a na-eme ka ha dị ọcha, ndị ntị chiri na-anụ ihe, a na-eme ka ndị nwụrụ anwụ si nʼọnwụ bilie, a na-ezisara ndị ogbenye oziọma. 23Ngọzị na-adịrị onye ahụ na-enweghị ihe mkpasu iwe nʼihi m.” 24Mgbe ndị na-eso ụzọ Jọn pụrụ, Jisọs bidoro ịgwa igwe mmadụ ahụ okwu banyere Jọn sị, “Gịnị ka unu gara nʼọzara ịhụ? Ọ bụ ahịhịa achara nke ikuku na-ebugharị? 25Ma gịnị ka unu pụrụ ịga ịhụ? Ọ bụ nwoke yi uwe mara mma? E e, ndị na-eyi uwe dị oke ọnụahịa, ndị na-ebikwa nʼoke oriri na oke ọṅụṅụ bi nʼụlọeze. 26Ma gịnị ka unu pụrụ ka unu ga-ahụ? Ọ bụ onye amụma? E, ana m a gwa unu, unu hụrụ onye karịrị onye amụma. 27Ọ bụ onye a bụ onye ahụ e dere ihe banyere ya sị, “ ‘Aga m ezipu onyeozi m nʼihu gị, onye ga-edozi ụzọ gị nʼihu gị.’ 28Agwa m unu, nʼetiti ndị nwanyị mụrụ, ọ dịghị onye dị ukwuu karịa Jọn, ma onye dịkarịsịrị nta nʼalaeze Chineke dị ukwuu karịa ya.” 29(Ndị mmadụ niile nụrụ nke a, tinyekwara ndị ọna ụtụ, nabatara nʼụzọ Chineke bụ nke ziri ezi, nʼihi na Jọn emela ha baptizim. 30Ma ndị Farisii na ndị ozizi iwu jụrụ imezu ebumnobi Chineke nye ha onwe ha, nʼihi na ha anabataghị ka Jọn mee ha baptizim.)
Akwụkwọ ozi
1Mgbe ha gafechara obodo Amfipolis na Apolonia, ha bịaruru obodo Tesalonaịka, ebe ụlọ nzukọ ndị Juu dị. 2Pọl bakwuuru ha, dịka ọ na-eme oge niile. Ọ nọnyere ha izu ụka atọ, ya na ha na-atụgharị uche nʼAkwụkwọ Nsọ, 3na-akọwara ha na-edokwa ha anya na ọ dị mkpa na Kraịst ga-ahụ ahụhụ, ma sitekwa nʼọnwụ bilie. Ọ sịrị, “Jisọs a, nke m na-ekwusara unu bụ Kraịst ahụ.” 4Ụfọdụ nʼime ndị Juu ahụ ka e mere ka ha kwere ma sonyere Pọl na Saịlas, otu aka ahụ, igwe mmadụ ndị na-atụ egwu Chineke nʼetiti ndị Griik na ụmụ nwanyị ụfọdụ a maara aha ha. 5Ma ndị Juu jupụtara nʼekworo, nʼihi ya, ha kpaliri obi ụfọdụ mmadụ efu nʼetiti ha nʼọma ahịa. Ndị a malitekwara ọgbaaghara nʼụzọ dị iche nʼime obodo. Ha tikasịrị ụlọ Jesin, nʼihi na ha chọrọ ịdọpụta ha nyefee ha nʼaka ọha mmadụ. 6Ma mgbe ha na-achọtaghị ha nʼebe ahụ, ha dọpụtara Jesin na ụmụnna anyị ụfọdụ, duru ha jekwuru ndị ikpe nke obodo ahụ, na-eti mkpu, “Ndị a kpuru ụwa ihu nʼala abịala inye obodo ukwu anyị nsogbu. 7Ma Jesin nabatara ha nʼụlọ ya. Ha na-emebi iwu Siza nʼihi na ha na-asịkwa na ọ dị eze ọzọ dị nke a na-akpọ Jisọs.” 8Okwu dị otu a wetara obi ịlọ mmiri nʼetiti ndị ikpe na mmadụ niile. 9Ha hapụrụ Jesin na ndị ọzọ, naanị mgbe ndị akaebe bịara kwụọ ụgwọ e jiri gbapụta ha. 10Ma nʼabalị ahụ, ndị kwere ekwe mere ngwangwa zipụ Pọl na Saịlas ka ha gaa obodo Beria. Ma mgbe ha ruru nʼebe ahụ, ha banyere nʼụlọ nzukọ ndị Juu. 11Ma ndị bi na Beria jiri obi ghere oghe nabata okwu a karịa ndị bi na Tesalonaịka. Nʼihi na ha ji ịnụ ọkụ nʼobi nara okwu ahụ, na-enyocha Akwụkwọ Nsọ kwa ụbọchị, ka ha mara ma ihe ha na-ekwu ọ bụ eziokwu. Ha mere nke a ụbọchị niile. 12Ọtụtụ nʼime ha kweere, ụfọdụ ụmụ nwanyị na ụmụ nwoke ndị Griik a maara aha ha chegharịkwara. 13Ma mgbe ndị Juu bi na Tesalonaịka nụrụ na Pọl na-ekwusa oziọma Chineke na obodo Beria, ụfọdụ ha gara nʼebe ahụ na-akpali igwe ndị mmadụ nʼihi iwebata ọgbaaghara. 14Ndị kwere ekwe mere ngwangwa zipụ Pọl ka ọ gaa nʼakụkụ oke osimiri dị nʼebe ahụ. Ma ha hapụrụ Saịlas na Timoti ka ha na ha nọdụ. 15Ma ndị dupuru Pọl sooro ya ruo obodo Atens. Ha lawara, hapụrụ Saịlas na Timoti ozi ka ha bịakwute ya na-atụfughị oge.
Akwụkwọ ozi (maka Onye bu ụzọ)
6Nʼihi na ọ bụ Chineke ahụ sịrị, ka ìhè si nʼọchịchịrị chawapụta; bụkwa onye mere ka ìhè ya nwuwa nʼime obi anyị. Nke a ka o mere iji wetara anyị ìhè amamihe nke ebube Chineke nʼihu Kraịst. 7Anyị onwe anyị bụ ndị natara akụ nke dị oke ọnụahịa dị nʼime ite ụrọ, iji gosi na ike kacha elu si nʼaka Chineke, ọ bụghị nʼaka anyị. 8A na-akpagbu anyị nʼakụkụ niile, ma adịghị emeri anyị. Mgbe ụfọdụ, anyị nọ na mgbagwoju anya ma anyị adịghị ada mba. 9A na-esogbu anyị, ma adịghị ahapụ naanị anyị; mgbe ụfọdụ, a na-akụtu anyị nʼala ma adịghị ala anyị nʼiyi. 10Ọtụtụ mgbe, anyị na-ebugharị nʼahụ anyị ọnwụ Jisọs, ka ndụ nke Jisọs nwekwa ike pụta ìhè nʼahụ anyị. 11Mgbe ọbụla anyị dị ndụ, anyị nọ nʼọnwụ nʼihi Jisọs, ka ndụ Jisọs nwee ike pụta ìhè nʼahụ anyị pụrụ ịnwụ anwụ. 12Nke a pụtara na ọnwụ na-arụsị ọrụ ike nʼime anyị, ma na ndụ na-arụ ọrụ nʼime unu. 13Ebe ọ bụ na anyị nwere otu mmụọ nke okwukwe ahụ, dịka e si dee nʼakwụkwọ nsọ, “Ekweere m, ya mere m ji kwuo.” Anyị onwe anyị kwekwara, nʼihi nke a mere anyị ji na-ekwu, 14ma anyị maara na onye mere ka Onyenwe anyị Jisọs si nʼọnwụ bilie, ga-emekwa ka anyị soro Jisọs si nʼọnwụ bilie, ma kpọbatakwa anyị na unu nʼihu ya. 15Ihe ndị a niile bụ maka nʼihi unu, ka ọ ga-abụ amara na-abawanye irute ọtụtụ mmadụ aka, ka o nwee ike na-abawanye inye ekele maka otuto nke Chineke.
Oziọma
47Mgbe ahụ, ndịisi nchụaja na ndị Farisii kpọrọ nzukọ ndị Sanhedrin. Ha na-asị, “Gịnị ka anyị ga-eme? Nʼihi na nwoke a na-eme ọtụtụ ihe ịrịbama. 48Ọ bụrụ na anyị ahapụ ya ka ọ gaa nʼihu, mmadụ niile ga-ekwere na ya. Ndị Rom ga-abịakwa, kwatuo ụlọnsọ ukwu ma napụ anyị obodo anyị.” 49Ma otu onye nʼime ha bụ Kaịfas, onyeisi nchụaja nʼafọ ahụ sịrị ha, “Unu amaghị ihe ọbụla. 50Ọ bụ na unu amaghị na ọ ka mma ka otu onye nwụọ nʼihi mmadụ niile, karịa nʼobodo anyị niile ga-ala nʼiyi.” 51Dị ka onyeisi nchụaja nke afọ ahụ, o kwughị nke a site nʼechiche ya, kama o buru amụma na Jisọs ga-anwụ nʼihi mba ndị Juu. 52Ọ bụghị nʼihi mba ahụ naanị, kama, ka ọ kpọkọta ụmụ Chineke ndị gbasara nʼebe niile. 53Ya mere, site nʼụbọchị ahụ, ha malitere ịgba izu otu ha ga-esi gbuo ya. 54Ya mere, Jisọs kwụsịrị ịgagharị ebe ndị Juu ga-ahụ ya. O siri nʼebe ahụ pụọ gaa nʼakụkụ ọzara nʼotu obodo nta a na-akpọ Ifrem. Ya na ndị na-eso ụzọ ya nọdụrụ nʼebe ahụ. 55Mmemme Ngabiga ndị Juu dịkwa nso. Ọtụtụ ndị mmadụ si nʼakụkụ ala ndị Juu niile bịa Jerusalem. Ha bịara tutu mmemme ahụ ebido ka ha mee onwe ha ka ha dị ọcha. 56Ha na-achọ Jisọs na-ajụrịta onwe ha nʼime ụlọnsọ ukwu ahụ, “Gịnị ka unu chere? Ọ bụ na ọ gaghị abịa na mmemme a?” 57Ma nʼoge ahụ, ndịisi nchụaja na ndị Farisii enyela iwu ka onye ọbụla hụrụ ya bịa gwa ha ka ha gaa jide ya.
Oziọma (maka Onye bu ụzọ)
2Jọn omee baptizim nọkwa nʼụlọ mkpọrọ nʼoge ahụ. Mgbe ọ nụrụ akụkọ ọrụ ebube niile nke Kraịst na-arụ, o zipụrụ ndị na-eso ụzọ ya. 3Ọ gwara ha ka ha jụọ ya ajụjụ sị, “Ọ bụ gị bụ onye ahụ anyị na-ele anya ọbịbịa ya, ka ọ bụ onye ọzọ?” 4Jisọs zara ha sị, “Laghachinụ azụ gwa Jọn banyere ihe unu nụrụ na ihe anya unu hụrụ. 5Gwanụ ya na a na-eme ka ndị ìsì hụ ụzọ, ka ndị ngwụrọ gaa ije. A na-emekwa ka ahụ ndị ekpenta dị ọcha. Ndị ogbi na-anụ ihe, na-ekwu okwu. Ndị nwụrụ anwụ ka a na-akpọte. Gwakwanụ ya ihe banyere oziọma a na-ezisara ndị ogbenye. 6Ziekwanụ ya ozi a, na ngọzị na-adịrị onye ahụ na-enweghị ihe mkpasu iwe nʼihi m.” 7Mgbe ndị ahụ Jọn zitere lara, Jisọs bidoro ịgwa igwe mmadụ nọ nʼebe ahụ okwu banyere Jọn. Ọ jụrụ ha ajụjụ sị, “Mgbe unu gara nʼọzara ịhụ Jọn, gịnị ka unu lere anya na unu ga-ahụ? Ọ bụ ahịhịa achara nke ikuku na-ebugharị? 8Ma ọ bụghị otu a, gịnị ka unu pụrụ ịga ịhụ? Ọ bụ nwoke yi uwe mara mma? Ma lee ndị na-eyi uwe dị oke ọnụahịa na-anọ nʼụlọ eze. 9Ma gịnị ka unu lere anya na unu ga-ahụ? Ọ bụ onye amụma? E, asị m unu, ọ bụ onye karịrị onye amụma. 10Onye bụ onye ahụ e dere ihe banyere ya nʼakwụkwọ nsọ sị, “ ‘Lee, aga m ezipu onyeozi m nʼihu gị, onye ga-edozi ụzọ gị nʼihu gị.’ 11Nʼezie, ọ dịghị nwoke ọbụla nʼetiti ndị nwanyị mụrụ dị ukwuu karịa Jọn omee baptizim. Ma onye dịkarịsịrị nta nʼalaeze eluigwe dị ukwuu karịa ya. 12Site nʼụbọchị ndị ahụ Jọn omee baptizim malitere ọrụ ya ruo ugbu a, ihe banyere alaeze eluigwe na-agabiga ihe ike. Otu a kwa ndị dị ike na-abagidekwa ya. 13Nʼihi na tupu Jọn abịa, iwu na ndị amụma niile buru amụma banyere alaeze a. 14Ọ bụrụkwa na unu jikeere ịnabata ya, ọ bụ ya bụ Ịlaịja ahụ, nke na a ga ịbịa. 15Onye ọbụla nwere ntị ịnụ ihe, ya nụrụ.
Ụbọchị ndị a na-eso kalenda Julian nke Nzukọ Rọshịa (dịka Nzukọ Sabia na Jọjia na Ugwu Athos): 25 Mee na kalenda nzukọ bụ 7 Jun na kalenda obodo. Nzukọ ndị na-eji kalenda ọhụrụ (Gris, Romania, Bulgaria, Ukraine…) na-eme mmemme ndị na-adịghị agbanwe agbanwe na ndị nsọ n’ụbọchị obodo ahụ n’onwe ya, ụbọchị 13 tupu mgbe ahụ, ụfọdụ ihe ọgụgụ ha dịkwa iche; Ista na ụbọchị ndị dabere na ya bụ otu.
Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike