Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Jun 2027 › 5 Jun

Kalenda Ọtọdọks · 23 Mee (Kalenda ochie)

Ihe ọgụgụ Ọtọdọks nke ụbọchị — 5 Jun 2027

Satọdee · Izu nke 5 nke Ista · Olu 4

Mmemme na ndị nsọ

St. Michael the Confessor and Bishop of Synnada († 821)

Obubu ọnụ

Ọ dịghị obubu ọnụ

Nke a na-eso iwu ndị mọnk. Nʼparish, a na-ekpebi ọtụtụ obubu ọnụ ya na onye na-anụ nkwupụta mmadụ, dịka ahụike, afọ na ọnọdụ si dị.

Ihe ọgụgụ nke ụbọchị

Akwụkwọ ozi

Ọrụ 15:35–41

35Pọl na Banabas nọgidere nʼAntiọk, ebe ha na ndị ọzọ kuziri ihe ma kwusakwa okwu Onyenwe anyị. 36Mgbe ụbọchị ole na ole gasịrị, Pọl gwara Banabas, “Ka anyị gaghachi nʼobodo niile anyị kwusara okwu Onyenwe anyị nʼotu nʼotu, mata ka ndị kwere ekwe si agbalị nʼebe ahụ.” 37Banabas chọrọ ka ha na Jọn onye a na-akpọ Mak soro gaa. 38Ma Pọl echeghị na o ziri ezi iduru ya nʼihi na ọ hapụrụ ha na Pamfilia. O sokwaghị ha jezuo ozi ha. 39Ịrụ ụka dapụtara nʼetiti ha siri ike nke mere na ha kewara. Banabas kpọrọ Jọn Mak banye nʼụgbọ gawa Saiprọs. 40Ma Pọl họọrọ Saịlas, kpọrọ ya gawa njem, mgbe ụmụnna kpesịrị ha ekpere raara ha nye nʼamara Onyenwe anyị. 41O jegharịrị nʼime obodo Siria na Silisia na-agba nzukọ nọ nʼebe ahụ ume.

Oziọma

Jọn 10:27–38

27Atụrụ m na-anụ olu m. Amaara m ha, ha na-esokwa m. 28Ana m enye ha ndụ ebighị ebi. Ha agaghị ala nʼiyi. Mmadụ ọbụla enwekwaghị ike ịpụnarị ha nʼaka m. 29Nna m onye nyere m ha dị ukwuu karịa ihe niile. O nweghị onye nwere ike ịnapụ ha site nʼaka Nna m. 30Mụ na nna m bụ otu.” 31Ndị Juu tụtụlitekwara nkume ọzọ ịtụ ya. 32Ma Jisọs zara ha, “E zila m unu ọtụtụ ọrụ ọma nke sitere nʼaka Nna m, olee nke unu na-achọ ịtụ m nkume nʼihi ya?” 33Ndị Juu zara ya, “Anyị achọghị ịtụ gị nkume nʼihi ọrụ ọma ndị a, kama nʼihi nkwulu na nʼihi na gị bụ mmadụ efu, ma ị na-eme onwe gị Chineke.” 34Jisọs zara ha, “Edeghị ya nʼiwu unu, sị, ‘Mụ onwe m sịrị na unu bụ chi’? 35Ọ bụrụ na a kpọrọ ndị ahụ nabatara okwu Chineke ‘chi,’ apụghịkwa imebi ihe e dere nʼakwụkwọ nsọ. 36Unu na-ekwu na onye ahụ Chineke doro nsọ ma zitekwa ya nʼime ụwa na-ekwulu Chineke nʼihi na m sịrị, ‘Abụ m Ọkpara Chineke?’ 37Unu ekwenyela na m, ma ọ bụrụ na ọ bụghị ọrụ Nna m ka m na-arụ. 38Ma ọ bụrụ na m na-arụ ya, a sịkwarị na unu ekweghị na m, kwerenụ nʼọrụ ndị a, ka unu nwee ike mata ma ghọtakwa na Nna ahụ nọ nʼime m, mụ onwe m nọkwa nʼime Nna ahụ.”

Ụbọchị ndị a na-eso kalenda Julian nke Nzukọ Rọshịa (dịka Nzukọ Sabia na Jọjia na Ugwu Athos): 23 Mee na kalenda nzukọ bụ 5 Jun na kalenda obodo. Nzukọ ndị na-eji kalenda ọhụrụ (Gris, Romania, Bulgaria, Ukraine…) na-eme mmemme ndị na-adịghị agbanwe agbanwe na ndị nsọ n’ụbọchị obodo ahụ n’onwe ya, ụbọchị 13 tupu mgbe ahụ, ụfọdụ ihe ọgụgụ ha dịkwa iche; Ista na ụbọchị ndị dabere na ya bụ otu.

Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike