Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Mee 2027 › 24 Mee
Kalenda Katọlik
Ihe ọgụgụ Mass (Katọlik) — 24 Mee 2027
Mọnde · Izu nke 8 nke Oge Nkịtị
Mmemme na ndị nsọ
Mọnde nke izu nke 8 nke Oge Nkịtị
Ụbọchị izu · Agba ofufe: akwụkwọ ndụ
Ihe ọgụgụ nke ụbọchị
Ihe ọgụgụ mbụ
Ọ dịghị na nsụgharị a
Abụ Ọma nzaghachi
1Abụ Ọma Devid. Abụ Maskil. Onye a gọziri agọzi ka mmadụ ahụ bụ, onye a gbaghaara ajọ omume ya niile, onye e kpuchikwaara mmehie ya niile. 2Ngọzị na-adịrị nwoke ahụ, onye Onyenwe anyị na-adịghị agụnyere mmehie ya, onye ahụ nke aghụghọ ọbụla na-adịghịkwa nʼime mmụọ ya. 5Mgbe ahụ, ekwupụtara m mmehie m niile nʼihu gị, kwụsịkwa izo ha ezo. Agwara m onwe m okwu sị, “Aga m ekwupụta mmehie m niile nʼihu Onyenwe anyị.” Ị gbaghakwaara m ikpe ọmụma nke mmehie m niile. Sela 6Ya mere, ka ndị niile bụ ndị ezi omume kpọkuo gị nʼekpere mgbe e nwere ike ịchọta gị; nʼụzọ dị otu a, ọ bụrụ na uju mmiri abịa, ọ gaghị erute ha. 7Gị onwe gị bụụrụ m ebe nzuzo; Ị ga-echebekwa m ka nsogbu ọbụla hapụ irute m nso. Ọ bụkwa abụ nzọpụta ka i ji gbaa m gburugburu. Sela
Oziọma
17Mgbe ọ na-ebili njem, otu nwoke gbaara ọsọ bịa gbuo ikpere nʼihu ya. Ọ jụrụ ya sị, “Ezi onye ozizi ọma, gịnị ka m ga-eme ka m keta ndụ ebighị ebi?” 18Jisọs sịrị ya, “Gịnị mere i ji akpọ m ezi mmadụ? Ọ dịghị onye ọbụla bụ ezi mmadụ ma ọ bụghị naanị Chineke. 19Ị maara ihe niile enyere nʼiwu: ‘Egbula mmadụ, a kwala iko, e zula ohi, a gbala ama ụgha, a ghọgbula mmadụ ibe gị, sọpụrụ nne na nna gị.’ ” 20Ọ sịrị ya, “E, onye ozizi, Edebezuchaala m ha niile siterị na mgbe m bụ nwata.” 21Jisọs lere ya anya, hụ ya nʼanya. Mgbe ahụ, ọ gwara ya sị, “Ọ fọdụrụ naanị otu ihe ị ga-eme. Laa, ugbu a, ree ihe niile i nwere, nyekwa ndị ogbenye ego i retara. I mesịa nke a, ị ga-enwe akụ nʼeluigwe. Mgbe ahụ bịaghachi soro m.” 22Mgbe ọ nụrụ okwu a, ihu ya gbarụrụ. O sitere nʼebe ahụ pụọ na mwute, nʼihi na ọ bụ ọgaranya nke nwere ọtụtụ akụnụba. 23Jisọs legharịrị anya gwa ndị na-eso ụzọ ya sị, “Lee ka o si bụrụ ihe rara ahụ na onye ọgaranya ga-abanye nʼalaeze Chineke.” 24Okwu ya tụrụ ndị na-eso ụzọ ya nʼanya, ma Jisọs gwakwara ha ọzọ sị, “Ụmụntakịrị, ọ bụ nnọọ ihe rara ahụ ịbanye nʼalaeze Chineke. 25Ọ dịrị ịnyịnya kamel mfe isite nʼanya agịga gafee, karịa onye ọgaranya ịbanye nʼalaeze Chineke.” 26Okwu a jubigara ha anya oke. Ha jụrịtara ibe ha sị, “Onye kwanụ ka a ga-azọpụta?” 27Ma Jisọs lere ha anya sị ha, “Nʼebe mmadụ nọ, ọ bụ ihe rara ahụ. Ma nʼebe Chineke nọ, ihe niile dị mfe. Ọ dịghị ihe rara Chineke ahụ ime.”
Kalenda Rom n’ozuzu; ọgbakọ ndị bishọp nwere ike ibuga ụfọdụ mmemme (Epifani, Mgbago n’Eluigwe, Ahụ na Ọbara Kraịst) n’ụbọchị Sọnde ma ọ bụ tinye nke ha. Akwụkwọ ọgụgụ: usoro Sọnde B, afọ ụbọchị izu I.
Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike