Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Mee 2027 › 4 Mee
Kalenda Katọlik
Ihe ọgụgụ Mass (Katọlik) — 4 Mee 2027
Tiuzdee · Izu nke 6 nke Oge Ista
Mmemme na ndị nsọ
Tiuzdee nke izu nke 6 nke Oge Ista
Ụbọchị izu · Agba ofufe: ọcha
Ihe ọgụgụ nke ụbọchị
Ihe ọgụgụ mbụ
22Igwe mmadụ sonyere imegide ha. Ndị ikpe nyere iwu ka a dọwaa uwe, pịakwa ha ihe. 23Mgbe ha pịachara ha ihe nke ọma, a tụnyere ha nʼime ụlọ mkpọrọ, nyekwa onye nche iwu ka o chee ha nke ọma. 24Nʼihi nke a, o tinyere ha nʼime ime ụlọ mkpọrọ, ebe o jiri ọtọsị kegide ha nʼụkwụ. 25Nʼetiti abalị, mgbe Pọl na Saịlas na-ekpe ekpere na-abụkwa abụ ito Chineke, ndị niile nọ nʼụlọ mkpọrọ ahụ na-ege ha ntị. 26Na mberede, oke ala ọma jijiji bidoro, nke mere ka ntọala ụlọ mkpọrọ ahụ maa jijiji. Ngwangwa, ọnụ ụzọ ya niile meghere, ụdọ igwe niile e jiri kee ndị mkpọrọ tọpụkwara. 27Mgbe onyeisi nche ụlọ mkpọrọ tetara nʼụra ma hụ na ọnụ ụzọ niile ghere oghe. Nʼihi ya, o chere na ndị mkpọrọ niile agbapụla. Ya mere, ọ mịpụtara mma agha ya chọọ igbu onwe ya. 28Ma Pọl tiri mkpu nʼoke olu, sị, “Emerula onwe gị ahụ. Anyị niile nọ nʼebe a!” 29Onyeisi nche ahụ kpọrọ ka eweta ọkụ, ọ gbabara nʼime, daa nʼụkwụ Pọl na Saịlas na-ama jijiji. 30Ọ kpọpụtara ha nʼezi sị, “Ndị nwe m, gịnị ka m ga-eme ka a zọpụta m?” 31Ha sịrị, “Kwere nʼOnyenwe anyị Jisọs, a ga-azọpụta gị na ezinaụlọ gị niile.” 32Mgbe ahụ, ha gwara ya na ndị niile nọ nʼezinaụlọ ya okwu nke Onyenwe anyị. 33Nʼotu elekere ahụ, nʼabalị ahụ, ọ sachara ọnya ha. Nʼatụfughị oge, ha mere ya na ezinaụlọ ya baptizim. 34Ọ kpọbatara ha nʼụlọ ya, nye ha ihe oriri. Ya onwe ya na ezinaụlọ ya ṅụrịrị ọṅụ nʼihi na o kwerela na Chineke.
Abụ Ọma nzaghachi
1Abụ Ọma Devid. O Onyenwe anyị, aga m eji obi m niile too gị; nʼihu chi niile dị iche iche ka m ga-abụku gị abụ otuto. 2Aga m akpọ isiala nʼebe ụlọnsọ ukwu gị dị aga m etokwa aha gị nʼihi ịhụnanya gị na ikwesi ntụkwasị obi gị, nʼihi na i meela ka aha gị na okwu gị dị elu karịa ihe niile. 3Mgbe m kpọkuru gị, ị zara m; i mere m ka m nwee nkwuwa okwu ma guzosiekwa ike. 7A sịkwarị na m na-eje ije nʼetiti nsogbu, ị na-echebe ndụ m; ị na-esetipụ aka gị megide iwe ndị kpọrọ m asị, ị na-eji aka nri gị zọpụta m. 8Onyenwe anyị ga-emezuru m ihe niile o kwadoro m; ịhụnanya gị, o Onyenwe anyị, na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi, ahapụkwala ọrụ aka gị niile.
Oziọma
5Ma ugbu a, ana m alaghachikwuru onye ahụ zitere m. Ma ọ dịghị onye ọbụla nʼetiti unu jụrụ m, ‘Olee ebe ị na-aga?’ 6Ma nʼihi na m gwara unu ihe ndị a, obi unu ejupụtala na mwute. 7Nʼagbanyeghị nke a, aga m agwa unu eziokwu, ọ bụ maka ọdịmma unu ka m ji ala. Ọ bụrụ na m alaghị, Onye Ndụmọdụ ahụ agaghị abịa. Ọ bụrụ na m laa, aga m ezitere unu ya. 8Mgbe ọ bịara, ọ ga-eme ka ụwa mata ezughị oke nke nghọta ya banyere mmehie, na ezi omume na ikpe, 9maka mmehie nʼihi na ha ekwenyeghị na m; 10ma gbasara ezi omume, nʼihi na ana m alakwuru Nna, ebe unu na-apụghị ịhụ m ọzọ, 11maka ikpe, nʼihi na e kpeela onyeisi ụwa a ikpe.
Kalenda Rom n’ozuzu; ọgbakọ ndị bishọp nwere ike ibuga ụfọdụ mmemme (Epifani, Mgbago n’Eluigwe, Ahụ na Ọbara Kraịst) n’ụbọchị Sọnde ma ọ bụ tinye nke ha. Akwụkwọ ọgụgụ: usoro Sọnde B, afọ ụbọchị izu I.
Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike