Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Mee 2027 › 3 Mee
Kalenda Katọlik
Ihe ọgụgụ Mass (Katọlik) — 3 Mee 2027
Mọnde · Izu nke 6 nke Oge Ista
Mmemme na ndị nsọ
Ndị nsọ Filip na Jemis, Ndị ozi
Mmemme · Agba ofufe: uhie
Ihe ọgụgụ nke ụbọchị
Ihe ọgụgụ mbụ
1Ụmụnna m, ugbu a achọrọ m ime ka unu cheta oziọma ahụ m ziri unu mgbe m buru ụzọ bịakwute unu, nke unu kweere na ya, na nke unu guzosikwara ike nʼelu ya. 2E si nʼoziọma a zọpụta unu, ma ọ bụrụ na unu ejiri obi unu niile jidesie ihe unu kweere na ya ike. Inwe okwukwe nʼihe ọzọ dị iche agaghị enyere unu aka. 3Ihe m nyefere unu nʼaka na mbụ bụ ozi ahụ m natara ị debe, nke dị oke mkpa, na Kraịst nwụrụ ọnwụ nʼihi mmehie anyị, dịka akwụkwọ nsọ kwuru na ọ ga-anwụ. 4Na e liri ya, ma e mere ka o si nʼọnwụ bilie nʼụbọchị nke atọ, dịka akwụkwọ nsọ kwukwara na ọ ga-eme. 5O gosiri Sefas onwe ya, emesịa, ndị ozi iri na abụọ ahụ hụkwara ya. 6Emesịakwa, o gosiri ihe karịrị narị mmadụ ise nʼime ụmụnna onwe ya, nʼotu mgbe, ọtụtụ nʼime ndị ahụ ka nọ ndụ taa, ọ bụ ezie na ụfọdụ nʼime ha adaala nʼụra ọnwụ. 7Emesịa, Jemis hụrụ ya; o mekwara ka ndị ozi niile hụ ya. 8Nʼikpeazụ, mụ onwe m hụkwara ya, dịka a ga-asị na m bụ nwa a na-amụghị nʼoge.
Abụ Ọma nzaghachi
1Abụ Ọma nke dịrị onyeisi abụ. Abụ ọma Devid. Eluigwe na-ezipụta ebube Chineke; mbara eluigwe na-egosikwa ọrụ aka ya. 2Ụbọchị niile, ha na-ekwupụta okwu, ehihie na abalị, ha na-egosipụta ihe ọmụma. 3Ha nweghị asụsụ, ha nweghị okwu, ma a na-anụ ụda ha. 4Nʼụwa niile ka olu ha na-apụ gazuo, okwu ọnụ ha niile erukwaala nʼebe ụwa sọtụrụ. Ọ bụ na mbara eluigwe ka Chineke maara ụlọ ikwu nye anyanwụ.
Oziọma
6Jisọs sịrị ya, “Mụ onwe m bụ ụzọ, na eziokwu, na ndụ. O nweghị onye na-abịakwute Nna m ma ọ bụghị site na m. 7Ọ bụrụ na unu maara onye m bụ, unu gaara amatakwa Nna m. Site ugbu a, unu amatala ya. Ma hụkwa ya.” 8Filip sịrị ya, “Onyenwe anyị, zi anyị Nna ahụ, afọ ga-ejukwa anyị.” 9Jisọs sịrị ya, “Ọtụtụ oge ndị a mụ na unu nọrọ ọ bụ na ị matabeghị onye m bụ, Filip? Onye ọbụla hụrụ m ahụla Nna. Olee otu i si asị, ‘zi anyị Nna ahụ?’ 10Ọ bụ na i kweghị na m nọ nʼime Nna, na Nna nọkwa nʼime m? Okwu niile m na-agwa unu esitekwaghị nʼebe m nọ pụta, kama ọ bụ Nna bi nʼime m na-arụ ọrụ ya. 11Kwere ihe m kwuru na anọ m nʼime Nna, na Nna nọkwa nʼime m. Ma ọ bụghị otu a, kwerenụ nʼihi ọrụ ebube ndị a. 12Nʼezie, nʼezie, agwa m unu, onye ọbụla kwere na m ga-arụ ọrụ ndị m rụrụ, rụọkwa ọrụ karịrị ndị a, nʼihi na m na-alakwuru Nna m. 13Ihe ọbụla unu ga-arịọ site nʼaha m, aga m enye unu ya, ka e nwe ike nye Nna ahụ otuto site nʼỌkpara ya. 14Ihe ọbụla unu rịọrọ nʼaha m, aga m eme ya.
Ndị nsọ nke ụbọchị
- Ndị nsọ Filip na Jemis, Ndị ozi
Kalenda Rom n’ozuzu; ọgbakọ ndị bishọp nwere ike ibuga ụfọdụ mmemme (Epifani, Mgbago n’Eluigwe, Ahụ na Ọbara Kraịst) n’ụbọchị Sọnde ma ọ bụ tinye nke ha. Akwụkwọ ọgụgụ: usoro Sọnde B, afọ ụbọchị izu I.
Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike