Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Mee 2027 › 4 Mee

Kalenda Ọtọdọks · 21 Eprel (Kalenda ochie)

Ihe ọgụgụ Ọtọdọks nke ụbọchị — 4 Mee 2027

Tiuzdee · Izu Ìhè · Olu 3

Mmemme na ndị nsọ

Tiuzdee nke Izu Ìhè

Izu na-enweghị obubu ọnụ

Ọ dịghị obubu ọnụ

Nke a na-eso iwu ndị mọnk. Nʼparish, a na-ekpebi ọtụtụ obubu ọnụ ya na onye na-anụ nkwupụta mmadụ, dịka ahụike, afọ na ọnọdụ si dị.

Ihe ọgụgụ nke ụbọchị

Akwụkwọ ozi

Ọrụ 2:14–21

14Pita guzoro, ya na ndị ozi iri na otu ahụ welie olu gwa ọgbakọ ahụ okwu, “Ndị Juu na unu ndị bi na Jerusalem, matanụ nke a, geekwanụ ntị na ihe m na-ekwu. 15Ọ bụghị mmanya na-egbu ndị a dị ka unu chere. Lee, ọ bụ naanị elekere itoolu nke ụtụtụ na-akụ. 16Mba, nke a bụ mmezu ihe Juel onye amụma kwuru, 17“ ‘Chineke sịrị, nʼoge ikpeazụ, aga m awụkwasị mmadụ niile Mmụọ m. Ụmụ unu ndị ikom na ụmụ unu ndị inyom ga-ebu amụma, ụmụ okorobịa unu ga-ahụkwa ọhụ, ndị okenye nwoke unu ga-arọ nrọ. 18Ọ bụladị ndị ohu m, nwoke ha na nwanyị nʼime ha, ka m ga-awụkwasị Mmụọ m. Ha ga-ebukwa amụma. 19Aga m egosi ihe ịtụnanya na mbara eluigwe, gosikwa ihe ịrịbama nʼụwa na nʼokpuru ụwa, ọbara na ọkụ na alulu anwụrụ ọkụ. 20Anyanwụ ga-agbanwe ghọọ ọchịchịrị, ọnwa ga-aghọkwa ọbara, tupu ụbọchị Onyenwe anyị abịa, bụ ụbọchị ahụ dị ukwu dịkwa ebube. 21Ọ ga-erukwa, na onye ọbụla nke na-akpọku aha Onyenwe anyị, ka a ga-azọpụta.’

Oziọma

Luk 24:12–35

12Ma otu ọ dị, Pita gbaara ọsọ ruo nʼili ahụ, hulata ala hụ ka akwa ozu ndị ahụ tọgbọọrọ onwe ha; ọ lara na-atụgharị uche nʼime onwe ya ihe ihe ndị a pụtara. 13Nʼotu ụbọchị ahụ, mmadụ abụọ nʼime ha gaje nʼobodo nta a na-akpọ Emaus, nke dị ihe ruru kilomita iri na abụọ site na Jerusalem. 14Ha na-ekwurịta nʼetiti onwe ha banyere ihe niile mere. 15Dị ka ha na-ekwu na-akparịta ụka banyere ihe ndị a, Jisọs nʼonwe ya bịara soro ha na-aga ije. 16Ma e mechiri anya ha ịmata na ọ bụ ya. 17Ọ sịrị ha, “Gịnị ka unu na-ekwurịta nʼetiti onwe unu dị ka unu na-aga nʼụzọ.” Ha kwụsịrị ebe ahụ, gbarụọ ihu ha. 18Otu onye nʼime ha a na-akpọ Kleopas, sịrị ya, “Ị bụ onye ọbịa na Jerusalem nke mere na ị maghị ihe mere nʼime ya nʼụbọchị ndị a?” 19Ọ sịrị ha, “Gịnị bụ ihe mere?” Ha sịrị ya, “Banyere Jisọs onye Nazaret! Ọ bụ onye amụma bụrụkwa onye dị ike, ma nʼokwu ma nʼomume nʼihu Chineke na mmadụ niile. 20Na otu ndịisi nchụaja na ndị ọchịchị anyị nyefere ya ka a maa ya ikpe ọnwụ, ma kpọgbukwaa ya nʼobe. 21Anyị nwererịị olileanya na ọ bụ ya ga-agbapụta Izrel. Nke ka nke, taa mere ya abalị atọ kemgbe ihe ndị a mere. 22Tụkwasị ihe ndị a, ụfọdụ ụmụ nwanyị anyị mere ka anyị nwee ihe ịtụnanya. Ha gara nʼili ahụ nʼisi ụtụtụ a. 23Ma ha ahụghị ahụ ya. Ha bịara kọrọ anyị na ha hụrụ ọhụ nke ndị mmụọ ozi, bụ ndị gwara ha na ọ dị ndụ. 24Ya mere ụfọdụ nʼime ndị otu anyị gara nʼili ahụ chọpụta na ihe niile ụmụ nwanyị a kwuru mere otu ahụ ha siri kwuo ya. Ma ha ahụkwaghị ya.” 25Ọ sịrị ha, “Unu bụ nnọọ ndị nzuzu! Leenụ ka o si siere unu ike ikwere ihe niile ndị amụma kwuru. 26Ọ bụ na o kwesighị ka Kraịst taa ahụhụ ndị a tupu ọ banye nʼebube ya?” 27Ya mere, ọ kọwaara ha ihe e dere nʼakwụkwọ nsọ banyere ya onwe ya malite na nke Mosis ruo na ndị amụma niile. 28Mgbe ha na-eru obodo nta ahụ ha na-aga, o mere dị ka ọ na-aga nʼihu na njem ya. 29Ma ha rịọ ya nʼebe ọ dị ukwuu sị, “Nọnyerenụ anyị nʼihi na chi ebidola iji, ụbọchị agamiekwala ugbu a.” Nʼihi ya ọ banyere ịga nọnyere ha. 30Mgbe ya na ha nọdụrụ na tebul iri nri, o were achịcha, kelee Chineke ekele, nyawaa ya were ya nye ha. 31Mgbe ahụ, e meghere anya ha, ha amata onye ọ bụ, ha ahụkwaghị ya anya ọzọ. 32Mgbe ahụ, ha gwara onwe ha sị, “Ọ bụ na ọ dịghị ka ọkụ ọ na-enwu nʼobi anyị mgbe anyị na ya nọ nʼụzọ, ya na-ekpughere anyị akwụkwọ nsọ?” 33Ha biliri ngwangwa laghachi Jerusalem. Ebe ahụ, ha hụrụ mmadụ iri na otu ahụ na ndị so ha ka ha nọkọtara nʼotu ebe, 34na-asị, “Ọ bụ eziokwu, Onyenwe anyị ebiliela, o gosila Saimọn onwe ya.” 35Mgbe ahụ, ha kọọrọ ha ihe mere nʼụzọ, ya na otu ha siri mata ya mgbe ọ nyawara achịcha.

Ụbọchị ndị a na-eso kalenda Julian nke Nzukọ Rọshịa (dịka Nzukọ Sabia na Jọjia na Ugwu Athos): 21 Epreel na kalenda nzukọ bụ 4 Mee na kalenda obodo. Nzukọ ndị na-eji kalenda ọhụrụ (Gris, Romania, Bulgaria, Ukraine…) na-eme mmemme ndị na-adịghị agbanwe agbanwe na ndị nsọ n’ụbọchị obodo ahụ n’onwe ya, ụbọchị 13 tupu mgbe ahụ, ụfọdụ ihe ọgụgụ ha dịkwa iche; Ista na ụbọchị ndị dabere na ya bụ otu.

Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike