Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Mee 2027 › 5 Mee

Kalenda Katọlik

Ihe ọgụgụ Mass (Katọlik) — 5 Mee 2027

Wenezdee · Izu nke 6 nke Oge Ista

Mmemme na ndị nsọ

Wenezdee nke izu nke 6 nke Oge Ista

Ụbọchị izu · Agba ofufe: ọcha

Ihe ọgụgụ nke ụbọchị

Ihe ọgụgụ mbụ

Ọrụ 17:15, 22–18:1

15Ma ndị dupuru Pọl sooro ya ruo obodo Atens. Ha lawara, hapụrụ Saịlas na Timoti ozi ka ha bịakwute ya na-atụfughị oge. 22Mgbe ahụ Pọl guzoro na nzukọ Areopagọs sị, “Unu ndị Atens, ahụla m na ọ na-anụ unu ọkụ nʼobi ịsọpụrụ mmụọ nke unu na-efe ofufe. 23Nʼihi na mgbe m na-ejegharị nʼobodo unu, ahụrụ m ụlọ chi dị iche iche, ahụrụ m otu ebe ịchụ aja nke e dekwasịrị nʼelu ya: Ihe e nyere chi nke amaghị ama. Ya mere, ihe ahụ unu na-efe ofufe nʼamaghị ama nke a ka m na-ekwusara unu. 24“Chineke onye kere ụwa na ihe niile dị nʼime ya. Ebe ọ bụ onye nwe eluigwe na ụwa, ọ dịghị ebikwa nʼụlọnsọ e jiri aka wuo. 25Otu aka ahụ, ọ dịghị anara ije ozi site nʼaka mmadụ, dịka a ga-asị na o nwere ihe kọrọ ya. Ya onwe ya na-enye ndụ na ume na ihe niile. Ọ na-egbokwa mkpa niile. 26O sitere nʼaka otu onye, bụ mmadụ mbụ ahụ, kee agbụrụ niile nke mmadụ nʼotu nʼotu, ka ha biri nʼelu ụwa dum. O jiri aka ya kewachaa oge ọgbọ ọbụla ga-anọ na oke niile nke ebe obibi ha. 27Ma nzube ya banyere ihe niile bụ ka onye ọbụla chọsie Chineke ike. Eleghị anya, mmadụ nwere ike lezie ụzọ ya anya, si otu a chọta ya. Ọ nọkwaghị mmadụ ọbụla nʼebe dị anya. 28‘Nʼihi nʼime ya ka anyị na-ebi, anyị na-ejegharịkwa nʼime ya na-adịkwa ndụ.’ Dịka ụfọdụ nʼime unu ndị ode abụ na-ekwu sị, ‘Anyị onwe anyị bụ ụmụ ya.’ 29“Ebe anyị bụ ndị Chineke mụrụ, o kwesighị ka anyị na-eche na ihe akpọrọ Chineke yiri ọlaọcha maọbụ ọlaedo, maọbụ nkume, ihe apịrị apị site na ǹka na ihe dị nʼobi mmadụ. 30Ma Chineke lefuru enweghị nghọta nke mmadụ anya banyere ihe ndị a niile nʼoge gara aga. Ma ugbu a, ọ chọrọ ka mmadụ niile chegharịa. 31Nʼihi na o debela otu ụbọchị mgbe ọ ga-ekpe ụwa niile ikpe nʼụzọ ezi omume, site nʼaka otu nwoke ọ họpụtara. O mekwara ka nke a guzosie ike, mgbe o mere ka onye ahụ sị nʼọnwụ bilie.” 32Mgbe ha nụrụ ihe banyere mbilite nʼọnwụ nke ndị nwụrụ anwụ, ha chịrị ya ọchị. Ma ụfọdụ nʼime ha sịrị, “Nʼoge ọzọ anyị ga-achọ ịnụ okwu ndị a.” 33Nʼoge a, Pọl hapụrụ ha. 34Mmadụ ole na ole sooro ya, bụrụkwa ndị kwere ekwe. Otu onye nʼime ha bụ Dionisiọs onye Areopagọs. Onye ọzọ bụ nwanyị a na-akpọ Damaris na ndị ọzọkwa. 18:1Ka nke a mechara, Pọl hapụrụ Atens gaa Kọrint.

Abụ Ọma nzaghachi

Abụ 148:1–2, 11–14

1Toonu Onyenwe anyị. Toonu Onyenwe anyị site nʼeluigwe, toonu ya nʼebe niile kachasị elu. 2Toonu ya, ndị mmụọ ozi ya niile, toonu ya, unu usuu ndị agha ya niile. 11ndị eze niile nke ụwa na mba niile dị iche iche, unu ụmụ eze na ndị niile na-achị achị nʼụwa, 12ụmụ okorobịa na ụmụ agbọghọ, ndị okenye na ụmụntakịrị. 13Ka ha niile too aha Onyenwe anyị, nʼihi na ọ bụ naanị aha ya ka e buliri elu; ebube ya dị ukwuu karịa eluigwe na ụwa. 14O meela ka mpi ndị ya dị elu, otuto ndị nsọ ya niile, nke Izrel ndị ọ hụrụ nʼanya. Toonu Onyenwe anyị.

Oziọma

Jọn 16:12–15

12“Enwere m ọtụtụ ihe ọzọ m ga-agwa unu. Ma ugbu a, unu agaghị anabatalị ha. 13Ma mgbe Mmụọ eziokwu ahụ bịara, ọ ga-eduba unu nʼeziokwu niile. Ọ gaghị ekwu ihe banyere onwe ya, kama ọ bụ ihe niile ọ nụrụ ka ọ ga-ekwu. Ọ ga-ezikwa unu ihe niile gaje ịbịa. 14Ọ ga-enye m otuto, nʼihi na ọ ga-esite nʼaka m nata ihe ọ ga-akọrọ unu. 15Ihe niile Nna nwere bụ nke m. Ọ bụ ya mere m ji sị, na ọ ga-ewere site nʼihe bụ nkem, kọwara ya unu.

Kalenda Rom n’ozuzu; ọgbakọ ndị bishọp nwere ike ibuga ụfọdụ mmemme (Epifani, Mgbago n’Eluigwe, Ahụ na Ọbara Kraịst) n’ụbọchị Sọnde ma ọ bụ tinye nke ha. Akwụkwọ ọgụgụ: usoro Sọnde B, afọ ụbọchị izu I.

Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike