Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Epreel 2027 › 30 Epreel
Kalenda Katọlik
Ihe ọgụgụ Mass (Katọlik) — 30 Epreel 2027
Fraịdee · Izu nke 5 nke Oge Ista
Mmemme na ndị nsọ
Fraịdee nke izu nke 5 nke Oge Ista
Ncheta a na-ahọrọ · Agba ofufe: ọcha
Onye nsọ Pius nke Ise, Pope · Ncheta a na-ahọrọ
Obubu ọnụ na nchegharị
Ụbọchị nchegharị
Fraịdee ọ bụla bụ ụbọchị nchegharị; ọgbakọ ndị bishọp ọ bụla na-ekpebi otú a ga-esi debe ya: izere anụ ma ọ bụ omume nchegharị ọzọ. Obubu ọnụ na-ejikọ ndị dị afọ 18 ruo 59, izere anụ site nʼafọ 14.
Ihe ọgụgụ nke ụbọchị
Ihe ọgụgụ mbụ
22Mgbe ahụ, ndị ozi na ndị okenye, ha na nzukọ niile, kpebiri ka a họpụta ndị ikom a ga-eziga Antiọk ha na Pọl na Banabas. Ha họpụtara Judas onye a na-akpọkwa Basabas, na Saịlas, ndị ndu so nʼetiti ụmụnna. 23Ha nyekwara ha nʼakwụkwọ ozi dị otu a, Akwụkwọ a sitere nʼaka ndị ozi, na ndị okenye ndị bụ ụmụnna unu. A na-edetara ya unu ndị sitere na mba ọzọ kwere bụ ndị nọ nʼAntiọk, Siria na Silisia. Ekele. 24E mere ka anyị mata na ụfọdụ ndị otu anyị ebuterela unu nsogbu na ọgbaaghara, mee ka obi lọọ unu mmiri, na-emebi mkpụrụobi unu. Ma nʼezie, ha anataghị ike nʼaka anyị ime nke a. 25Nʼihi nke a, anyị zukọrọ, sitekwa nʼotu obi kpebie ịhọpụta ụfọdụ ndị ikom na izitere unu ha, ha na ndị anyị hụrụ nʼanya, bụ Pọl na Banabas, 26ndị ikom werela ndụ ha tụnye nʼaha Onyenwe anyị Jisọs Kraịst. 27Ya mere, anyị na-ezite Judas na Saịlas ndị ga-akọwara unu nʼihu nʼihu, ihe anyị dere nʼakwụkwọ a. 28Nʼihi na ọ bụ ihe ziri ezi nʼanya Mmụọ Nsọ na nʼanya anyị kwa, na o kwesighị ka anyị bokwasị unu ibu arọ karịa ihe ndị a dị mkpa. 29Ma o kwesiri ka unu hapụ iri ihe ọbụla e jiri chụọ aja nye arụsị, ya na iri anụ ọbụla a nyagburu anyagbu, maọbụ ọbara. Kewapụkwanụ onwe unu site nʼịkwa iko. Ọ bụrụ na unu eme ihe ndị a, unu mere nke ọma. Nọọnụ nke ọma. 30Ya mere, e zipụrụ ha, ha jeruokwa Antiọk. Mgbe ha kpọkọrọ nzukọ ahụ, ha nyere ha akwụkwọ ozi ahụ. 31Mgbe ndị otu ọgbakọ ahụ gụsịrị ya, ha ṅụrịrị ọṅụ nke ukwuu nʼihi agbamume ha natara.
Abụ Ọma nzaghachi
7Obi m dị njikere, o Chineke, obi m dị njikere sikwaa ike; aga m abụ abụ, kụkwaa egwu. 8Teta nʼụra mkpụrụobi m! Teta, ụbọ akwara na une! Aga m akpọte chi ọbụbọ. 9O Onyenwe anyị, aga m eto gị nʼetiti mba niile; aga m abụ abụ banyere gị nʼetiti ndị niile dị iche iche. 10Nʼihi na ịhụnanya gị dị ukwuu na-eru na mbara eluigwe; ikwesi ntụkwasị obi gị na-erukwa mbara eluigwe. 11O Chineke, ka e bulie gị elu karịa eluigwe; ka ebube gị dị nʼelu ụwa niile.
Oziọma
12Nke a bụkwa iwu m, ka unu hụrịta onwe unu nʼanya dị ka m siri hụ unu nʼanya. 13Ọ dịghị onye ọbụla nwere ịhụnanya karịrị nke a na mmadụ tọgbọrọ ndụ ya nʼihi ndị enyi ya. 14Unu onwe unu bụkwa ndị enyi m ma ọ bụrụ na unu edebe ihe m nyere nʼiwu. 15Anaghị m akpọkwa unu ndị ohu ọzọ. Nʼihi na ohu adịghị amatazu ihe niile onyenwe ya na-eme. Ma ana m akpọ unu ndị enyi m nʼihi na agwala m unu ihe niile m nụrụ nʼọnụ Nna m. 16Ọ bụkwaghị unu onwe unu họọrọ m. Ọ bụ m họọrọ unu, wepụtakwa unu iche ka unu gaa mịa ọtụtụ mkpụrụ, mkpụrụ nke ga-adịgidekwa. Ya mere, Nna m ga-enye unu ihe ọbụla unu ga-arịọ nʼaha m. 17Ihe ndị a ka m na-enye unu nʼiwu, hụrịtanụ onwe unu nʼanya.
Ndị nsọ nke ụbọchị
- Onye nsọ Pius nke Ise, Pope
Kalenda Rom n’ozuzu; ọgbakọ ndị bishọp nwere ike ibuga ụfọdụ mmemme (Epifani, Mgbago n’Eluigwe, Ahụ na Ọbara Kraịst) n’ụbọchị Sọnde ma ọ bụ tinye nke ha. Akwụkwọ ọgụgụ: usoro Sọnde B, afọ ụbọchị izu I.
Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike