Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Epreel 2027 › 19 Epreel
Kalenda Katọlik
Ihe ọgụgụ Mass (Katọlik) — 19 Epreel 2027
Mọnde · Izu nke 4 nke Oge Ista
Mmemme na ndị nsọ
Mọnde nke izu nke 4 nke Oge Ista
Ụbọchị izu · Agba ofufe: ọcha
Ihe ọgụgụ nke ụbọchị
Ihe ọgụgụ mbụ
1Ndị ozi na ụmụnna ndị bi na Judịa niile nụrụ na ndị mba ọzọ anabatala okwu Chineke. 2Mgbe Pita ruru Jerusalem, ndị kwere ekwe e biri ugwu tara ya ụta, 3na-asị, “Gịnị mere ị ji gakwuru ndị a na-ebighị ugwu soro ha rie ihe?” 4Pita kọwaara ha ihe niile mere na otu o si mee, na-asị. 5“Otu ụbọchị, mgbe m nọ nʼobodo Jopa, ahụrụ m ọhụ nʼoge m na-ekpe ekpere. Nʼime ọhụ a, ahụrụ m ihe yiri akwa ọcha dị obosara nke e sitere nʼakụkụ anọ ya na-ewedata site nʼeluigwe. E budatara ya nʼihu m. 6Nʼime ya, ahụrụ m anụmanụ ndị nwere ụkwụ anọ, na anụ ọhịa, na anụ ndị na-akpụ akpụ nʼala na ụmụ nnụnụ nke eluigwe. 7Mgbe ahụ, anụrụ m olu gwara m sị, ‘Pita, bilie, gbuo ma riekwa.’ 8“Ma asịrị m, ‘Mba, Onyenwe m, ọ dịbeghị mgbe ihe na-adịghị ọcha maọbụ ihe rụrụ arụ bara m nʼọnụ.’ 9“Olu ahụ siri nʼeluigwe zaghachi nke ugboro abụọ, ‘Akpọla ihe ọbụla ihe rụrụ arụ bụ nke Chineke mere ka ọ dị ọcha.’ 10Nke a mere ugboro atọ, ma emesịa dọlie ha niile laa nʼeluigwe. 11“Nʼotu oge ahụ, ndị ikom atọ ndị e zipụrụ site Sizaria ịkpọ m bịarutere kwụsị nʼọnụ ụzọ nʼụlọ ebe m nọ. 12Mmụọ Nsọ gwara m ka m ghara inwe obi abụọ isoro ha na-akpaghị oke ọbụla. Mmadụ isii ndị a nʼetiti ụmụnna anyị sokwa m, bịarute nʼụlọ nwoke ahụ. 13Ọ gwara anyị otu o si hụ mmụọ ozi nʼụlọ ya, onye sịrị, ‘Ziga ndị ozi jee Jopa ka ha kpọta Saimọn onye a na-akpọ Pita. 14Ọ ga-ewetara gị ozi nke a ga-esite na ya zọpụta gị nʼezinaụlọ gị niile.’ 15“Mgbe m ka kpụ okwu ahụ nʼọnụ, Mmụọ Nsọ bịakwasịrị ha dịka o siri bịakwasị anyị na mbụ. 16Mgbe ahụ, echetara m okwu ahụ Onyenwe anyị kwuru sị, ‘Jọn ji mmiri mee unu baptizim, ma a ga-eji Mmụọ Nsọ mee unu baptizim.’ 17Ya mere, ọ bụrụ na Chineke nyere ha otu onyinye ahụ o nyere anyị mgbe anyị kweere nʼOnyenwe anyị Jisọs Kraịst, onye ka m bụ iguzogide Chineke?” 18Mgbe ha nụrụ nke a, ha agaghị nʼihu nʼịrụ ụka kama ha toro Chineke, na-asị, “Nʼezie, Chineke enyela ohere ka ọ bụladị ndị mba ọzọ chegharịa baa na ndụ.”
Abụ Ọma nzaghachi
1Abụ Ọma nke dịrị onyeisi abụ. Abụ Maskil nke ụmụ Kora. Dịka agụụ ịṅụ mmiri si na-agụ nne ele, otu a ka agụụ ihe banyere gị si na-agụ m, O Chineke. 2Akpịrị nke ihe banyere Chineke, bụ Chineke ahụ dị ndụ, na-akpọ m nkụ. Olee mgbe m pụrụ ịga zute Chineke? 43:3Zipụ ìhè gị na eziokwu gị, ka ha duo m; ka ha kpọbata m nʼugwu nsọ gị, bụ ebe i bi. 4Mgbe ahụ, aga m aga nʼebe ịchụ aja Chineke, gakwuru Chineke, bụ ọṅụ m na obi ụtọ m. Aga m eji ụbọ akwara too gị, O Chineke, bụ Chineke m.
Oziọma
1“Nʼezie, nʼezie, agwa m unu, onye ọbụla na-adịghị esite nʼọnụ ụzọ aba nʼọgba atụrụ kama ọ na-arị elu ka o site nʼelu ụlọ ahụ wufee, bụ onye ohi bụrụkwa onye na-apụnara mmadụ ihe. 2Onye na-esite nʼọnụ ụzọ abanye bụ onye ọzụzụ atụrụ. 3Onye nche ọnụ ụzọ na-emeghere ya ụzọ, atụrụ ya na-anụkwa olu ya. Ọ na-akpọ atụrụ nke ya aha, ma duru ha pụọ. 4Mgbe ọ kpọpụtasịrị ndị niile bụ nke ya, ọ na-aga nʼihu ha. Atụrụ ya na-esokwa ya nʼazụ nʼihi na ha maara olu ya. 5Ha agaghị eso onye ọbịa, kama ha gbaara ya ọsọ. Nʼihi na ha amaghị olu onye ọbịa.” 6Jisọs ji ihe yiri ihe gwa ha okwu. Ma ha aghọtaghị ihe ọ nọ na-agwa ha. 7Ọzọ, Jisọs sịrị, “Nʼezie, nʼezie, ana m agwa unu, mụ onwe m bụ ọnụ ụzọ ọgba atụrụ ahụ. 8Ndị niile bịara tupu mụ onwe m abịa bụ ndị ohi na ndị na-apụnara mmadụ ihe nʼike. Ụmụ atụrụ aṅakwaghị ha ntị. 9Mụ onwe m bụ ụzọ. Onye ọbụla sitere na m banye, a ga-azọpụta ya. Ọ ga na-apụ na-abata na-achọtakwa nri. 10Onye ohi na-abịa naanị ka o zuo ohi, gbuo ma bibiekwa; abịara m ka ha nwe ndụ ma nwebigakwa ya oke.
Kalenda Rom n’ozuzu; ọgbakọ ndị bishọp nwere ike ibuga ụfọdụ mmemme (Epifani, Mgbago n’Eluigwe, Ahụ na Ọbara Kraịst) n’ụbọchị Sọnde ma ọ bụ tinye nke ha. Akwụkwọ ọgụgụ: usoro Sọnde B, afọ ụbọchị izu I.
Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike