Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Epreel 2027 › 20 Epreel

Kalenda Katọlik

Ihe ọgụgụ Mass (Katọlik) — 20 Epreel 2027

Tiuzdee · Izu nke 4 nke Oge Ista

Mmemme na ndị nsọ

Tiuzdee nke izu nke 4 nke Oge Ista

Ụbọchị izu · Agba ofufe: ọcha

Ihe ọgụgụ nke ụbọchị

Ihe ọgụgụ mbụ

Ọrụ 11:19–26

19Ugbu a, ndị ahụ niile gbasasịrị nʼihi mkpagbu ahụ bidoro mgbe a tụgburu Stivin na nkume, jeruru akụkụ Fonisia na Saiprọs na Antiọk na-ekwusa oziọma ahụ naanị nʼetiti ndị Juu. 20Ma otu ọ dị, ụfọdụ nʼime ndị ikom ndị ahụ sitere nʼakụkụ Saiprọs na Sirini gara Antiọk, malite ikwusara ndị Griik oziọma banyere Onyenwe anyị Jisọs. 21Onyenwe anyị gọziri mgbalị ha niile. Nʼihi na ọtụtụ mmadụ chegharịrị kwere nʼOnyenwe anyị. 22Mgbe nzukọ dị na Jerusalem nụrụ ihe ndị a, ha zipụrụ Banabas ka ọ gaa Antiọk. 23Mgbe o rutere, hụ ihe amara Chineke rụrụ nʼetiti ha. Ọ ṅụrịrị ọṅụ, mgbakwaa ha niile ume, gwa ha ka ha were obi ha niile nọgide nʼime Onyenwe anyị. 24Ọ bụ ezigbo mmadụ, onye jupụtara na Mmụọ Nsọ na okwukwe. O nwekwara okwukwe dị ebube, nʼihi ya ọtụtụ mmadụ chegharịkwara bịakwute Onyenwe anyị. 25Emesịa, ọ gara Antiọk obodo Tasọs ịchọ Sọl. 26Mgbe ọ chọpụtara ya, o duuru ya bịa nʼAntiọk. Ihe ha ka otu afọ, ka ha na-ezukọ nʼụlọ chọọchị na-akụziri ọtụtụ igwe mmadụ ihe. Ọ bụ nʼime Antiọk ka e buru ụzọ kpọọ ndị na-eso ụzọ ya ndị Kraịst.

Abụ Ọma nzaghachi

Abụ 87:1–7

1Abụ Ọma ụmụ Kora. Otu Abụ. Chineke atọọla ntọala ya nʼelu ugwu nsọ ahụ; 2Onyenwe anyị hụrụ ọnụ ụzọ ama Zayọn nʼanya, karịa ebe obibi niile nke Jekọb. 3Ihe dị iche iche nke dị ebube ka a na-ekwu banyere gị, O obodo Chineke; Sela 4“Aga m agụnye Rehab na Babilọn, dịka ndị na-asọpụrụ m, aga m agụnyekwa ndị Filistia, na ndị Taịa, na ndị Kush, aga m asị, ‘A mụrụ nke a na Zayọn.’ ” 5Nʼezie, a ga-ekwu okwu banyere Zayọn sị, “A mụrụ nke a na nke ọzọ nʼime ya, ya onwe ya, bụ Onye kachasị ihe niile elu, ga-eme ka o guzosie ike.” 6Onyenwe anyị ga-ede nʼime akwụkwọ usoro nke ndị mmadụ: “A mụrụ onye a na Zayọn.” 7Dịka ha na-eti egwu, ha ga-abụ abụ sị, “Isi iyi m niile dị na gị.”

Oziọma

Jọn 10:22–30

22Nʼoge ahụ, mmemme icheta mgbe e doro ụlọnsọ ukwu ahụ nsọ ruru na Jerusalem. Ọ bụ oge oke oyi, 23ma Jisọs nọ na-ejegharị nʼụlọnsọ ukwu, nʼịba Solomọn. 24Ndị Juu gbara ya gburugburu sị ya, “Ruo ole mgbe ka ị ga-edebe anyị nʼọnọdụ olileanya? Ọ bụrụ na ị bụ Kraịst ahụ, gwaghee anyị ọnụ.” 25Jisọs zara ha, “Agwara m unu, ma unu ekweghị. Ọrụ m na-arụ nʼaha Nna m na-agba ama banyere m. 26Ma unu ekwenyeghị, nʼihi na unu esoghị nʼigwe atụrụ m. 27Atụrụ m na-anụ olu m. Amaara m ha, ha na-esokwa m. 28Ana m enye ha ndụ ebighị ebi. Ha agaghị ala nʼiyi. Mmadụ ọbụla enwekwaghị ike ịpụnarị ha nʼaka m. 29Nna m onye nyere m ha dị ukwuu karịa ihe niile. O nweghị onye nwere ike ịnapụ ha site nʼaka Nna m. 30Mụ na nna m bụ otu.”

Kalenda Rom n’ozuzu; ọgbakọ ndị bishọp nwere ike ibuga ụfọdụ mmemme (Epifani, Mgbago n’Eluigwe, Ahụ na Ọbara Kraịst) n’ụbọchị Sọnde ma ọ bụ tinye nke ha. Akwụkwọ ọgụgụ: usoro Sọnde B, afọ ụbọchị izu I.

Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike