Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Epreel 2027 › 18 Epreel
Kalenda Katọlik
Ihe ọgụgụ Mass (Katọlik) — 18 Epreel 2027
Sọnde · Izu nke 4 nke Oge Ista
Mmemme na ndị nsọ
Sọnde nke 4 nke Oge Ista
Sọnde · Agba ofufe: ọcha
Ihe ọgụgụ nke ụbọchị
Ihe ọgụgụ mbụ
8Nʼoge ahụ, Pita jupụtara na Mmụọ Nsọ. Ọ gwara ha, “Unu ndị na-achị ala anyị, na ndị okenye. 9Ọ bụrụ na unu kpọpụtara anyị ịchọpụta otu nwoke ngwụrọ a si bụrụ onye ahụ dị mma maọbụ otu e si gwọọ ya, 10ya mere maranụ nke a, unu na ndị Izrel niile, a gwọrọ nwoke a guzo nʼetiti unu site nʼaha Jisọs Kraịst onye Nazaret, onye unu kpọgidere nʼobe, ma Chineke kpọlitere ya site nʼọnwụ. 11Jisọs a bụ “ ‘nkume ahụ unu ndị na-ewu ụlọ jụrụ, nke ghọrọ nkume isi ntọala ụlọ.’ 12Nzọpụta adịghị nʼime onye ọbụla ọzọ, nʼihi na o nweghị aha ọzọ e nyere nʼetiti mmadụ nʼokpuru eluigwe nke e nwere ike isite na ya zọpụta anyị.”
Abụ Ọma nzaghachi
Abụ 118:1, 8–9, 21–23, 26, 28–29
1Keleenụ Onyenwe anyị nʼihi na ọ dị mma; ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi. 8Ọ kachasị mma ịgbaba nʼime Onyenwe anyị karịa ịtụkwasị ụmụ mmadụ obi. 9Ọ kachasị mma ịgbaba nʼime Onyenwe anyị karịa ịtụkwasị ndị amara aha ha obi. 21Aga m enye gị ekele, nʼihi na ị zara m; ị ghọọla nzọpụta m. 22Nkume ahụ ndị na-ewu ụlọ jụrụ, aghọọla nkume isi ntọala ụlọ; 23nke a bụ ọrụ aka Onyenwe anyị, ọ bụkwa ihe ịtụnanya nʼanya anyị. 26Onye a gọziri agọzi ka onye ahụ bụ, nke na-abịa nʼaha Onyenwe anyị. Anyị sitere nʼụlọ Onyenwe anyị na-agọzi gị. 28Ị bụ Chineke m, aga m eto gị; ị bụ Chineke m, aga m ebuli gị elu. 29Keleenụ Onyenwe anyị nʼihi na ọ dị mma, ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi.
Ihe ọgụgụ nke abụọ
1Lee ụdị oke ịhụnanya nke Nna ahụ nwere nʼebe anyị nọ, na-aga akpọ anyị ụmụ Chineke. Nʼezie, nke a bụ ihe anyị bụ. Ihe mere na ụwa amaghị anyị bụ nʼihi na ọ maghị ya. 2Ndị hụrụ nʼanya, ugbu a anyị abụrụla ụmụ Chineke. Ọ bụ ezie na anyị enweghị ike ịghọta ihe ọnọdụ anyị ga-abụ nʼoge dị nʼihu, ma anyị maara nke ọma na mgbe a ga-eme ka ọ pụta ìhè, a ga-emekwa ka anyị bụrụ ndị yiri ya, nʼihi na anyị ga-ahụ ya dịka ọ dị.
Oziọma
11“Mụ onwe m bụ onye ọzụzụ atụrụ ọma. Ezi onye ọzụzụ atụrụ na-atọgbọ ndụ ya nʼihi atụrụ ya. 12Onye e goro ọrụ, nke na-abụghị onye nche atụrụ, onye atụrụ na-abụghị nke ya, ọ na-ahapụ ha gbaa ọsọ mgbe ọ hụrụ agụ ka ọ na-abịa; mgbe ahụ agụ na-achụso atụrụ ahụ chụsasịa ha. 13Onye e goro ọrụ na-agbapụ, nʼihi na ọ bụ onye e goro ọrụ, ọ naghị echegbu onwe ya banyere atụrụ ndị ahụ. 14“Abụ m onye ọzụzụ atụrụ ọma; amaara m atụrụ m, atụrụ nke m makwaara m. 15Dị ka Nna ahụ maara m, mụ onwe m makwa Nna ahụ. Ana m atọgbọ ndụ m nʼihi atụrụ ahụ. 16Enwere m ụmụ atụrụ ọzọ ndị na-anọghị nʼọgba atụrụ a. Aghaghị m ịkpọbatakwa ha. Ha onwe ha ga-anụ olu m, a ga-enwekwa otu igwe atụrụ na otu onye ọzụzụ atụrụ. 17Maka nke a ka Nna jiri hụ m nʼanya, nʼihi na ana m atọgbọ ndụ m, ka m wereghachikwa ya ọzọ. 18O nweghị onye ọbụla pụrụ ịnara m ya, kama ana m atọgbọ ya nʼike nke onwe m. Enwere m ikike ịtọgbọ ya, nweekwa ikike iwereghachi ya ọzọ. Anatara m iwu a site nʼaka Nna m.”
Kalenda Rom n’ozuzu; ọgbakọ ndị bishọp nwere ike ibuga ụfọdụ mmemme (Epifani, Mgbago n’Eluigwe, Ahụ na Ọbara Kraịst) n’ụbọchị Sọnde ma ọ bụ tinye nke ha. Akwụkwọ ọgụgụ: usoro Sọnde B, afọ ụbọchị izu I.
Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike