Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Epreel 2027 › 19 Epreel
Kalenda Ọtọdọks · 6 Eprel (Kalenda ochie)
Ihe ọgụgụ Ọtọdọks nke ụbọchị — 19 Epreel 2027
Mọnde · Izu nke 6 nke Lent Ukwu · Olu 5
Mmemme na ndị nsọ
Holy Hierarch Eutychius, Patriarch of Constantinople († 582)
Oge Lent Ukwu
Obubu ọnụ siri ike (nri akọrọ: achịcha, akwụkwọ nri, mkpụrụ osisi)
Nke a na-eso iwu ndị mọnk. Nʼparish, a na-ekpebi ọtụtụ obubu ọnụ ya na onye na-anụ nkwupụta mmadụ, dịka ahụike, afọ na ọnọdụ si dị.
Ihe ọgụgụ nke ụbọchị
Elekere nke 6
17Otu a ka Onyenwe anyị sịrị, Onye mgbapụta unu, bụ Onye nsọ Izrel, “Mụ onwe m bụ Onyenwe anyị Chineke gị, onye na-ezi unu ihe nʼihi ọdịmma unu, na-eduzikwa unu nʼụzọ unu kwesiri iso. 18A sịkwarị na unu ṅara ntị nʼiwu m niile, udo unu gaara na-eru dịka osimiri, ọdịmma unu adịkwa ka mmali nke ebili oke osimiri. 19Mkpụrụ gị gaara amụba dịka aja, ụmụ unu gaara a dị ka mkpụrụ ọkụkụ a na-enweghị ike ịgụta ọnụ, a gaghị ehichapụkwa aha ha, maọbụ bibie nʼihu ha.” 20Sitenụ na Babilọn pụọ, gbanarịnụ ndị Kaldịa! Werenụ olu iti mkpu ọṅụ kwusaa inwere onwe unu a. Meenụ ka ndị bi na nsọtụ niile nke ụwa nụrụ ya sịnụ, “ Onyenwe anyị agbapụtala ohu ya Jekọb.” 21Mgbe O duuru ndị ya jee ije nʼọzara, ala kpọrọ nkụ, akpịrị akpọghị ha nkụ. O mere ka mmiri si nʼoke nkume sọpụtara ha, e, ọ kpọwara oke nkume mee ka mmiri sọpụta. 22Onyenwe anyị sịrị, “Ọ dịghị udo dịrị ndị na-emebi iwu.” 49:1Geenụ m ntị, unu niile ndị bi nʼala mmiri gbara gburugburu, nụrụkwanụ nke a, unu ndị nọ na mba dị anya. Onyenwe anyị kpọrọ m tupu amụọ m. Ọ kpọrọ m aha m mgbe m ka nọ nʼime afọ nne m. 2O mere ka okwu sị m nʼọnụ dịrị nkọ dịka mma agha. O zobere m nʼaka ya kpuchie m. O mere m ka m dịrị ka àkụ dị nkọ nke o zoro nʼime akpa àkụ ya. 3Ọ sịrị m, “Ị bụ ohu m, Izrel. Ọ bụkwa site na gị ka m ga-eji gosi ịma mma na ike m.” 4Ma mụ onwe m sịrị, “Ọ bụ nʼefu ka m dọgburu onwe m nʼọrụ. Etufuola m ike m niile nʼihi ihe na-abụghị ihe. Ma ihe ruru m dị nʼaka Onyenwe anyị, ụgwọ ọrụ m dịkwa nʼaka Chineke m.”
Ofufe mgbede: ihe ọgụgụ
1Mgbe Aịzik ghọrọ agadi, nʼoge anya ya na-adịghị ahụzi ụzọ nke ọma, ọ kpọrọ Ịsọ ọkpara ya, sị ya, “Nwa m nwoke.” Ọ zara sị, “Lee m nʼebe a.” 2Aịzik gwara ya sị, “Ugbu a, emeela m agadi, amakwaghị m ụbọchị ọnwụ m. 3Ya mere, were ihe ịchụ nta gị, ụta gị na àkụ gị, gaa nʼọhịa, gbutere m anụ. 4Siere m nri ụtọ otu ahụ o si amasị m, butere m ya ka m rie, ka mụ onwe m gọzie gị tupu m nwụọ.” 5Ma Ribeka nọ na-ege ntị mgbe Aịzik na-agwa nwa ya Ịsọ okwu. Nke mere na mgbe Ịsọ gawara nʼọhịa ịchụ nta, 6Ribeka gwara Jekọb nwa ya okwu sị ya, “Lee, anụrụ m ka nna gị na-agwa nwanne gị Ịsọ okwu sị ya, 7‘Gaa nʼọhịa gbute anụ, siere m nri ụtọ, ka m nọdụ nʼihu Onyenwe anyị nye gị ngọzị ikpeazụ tupu m nwụọ.’ 8Ugbu a, nwa m nwoke, gee ntị nke ọma, mee ihe niile m gwara gị. 9Gaa ugbu a nʼigwe anụ ụlọ wetara m ụmụ nwa ewu abụọ dị mma ka m jiri ha siere nna gị nri dị ụtọ, ụdị ahụ na-amasị ya. 10Ị ga-eburu ya bujere nna gị ka o rie, ka ya onwe ya gọzie gị tupu ọ nwụọ.” 11Ma Jekọb gwara Ribeka nne ya okwu sị ya, “Nwanne m nwoke Ịsọ bụ onye gbara ajị. Ahụ nke m na-akwọ mụrụmụrụ. 12Gịnị ga-eme ma nna m metụ m aka nʼahụ? Nʼihi ya, aga m abụ onye na-aghọ ya aghụghọ, aga m esi otu a wetara onwe m ịbụ ọnụ kama ngọzị.” 13Nne ya gwara ya sị, “Nwa m nwoke ka ọbụbụ ọnụ gị dakwasị m. Naanị mee ihe m kwuru. Gaa wetara m ha.” 14Ya mere, ọ gara weta ha nye nne ya. O ji ha sie nri dị ụtọ, ụdị nke na-amasị nna ya. 15Emesịa, Ribeka chịpụtara uwe Ịsọ ọkpara ya, ndị dị mma, ndị ọ debere nʼụlọ ya, nye ya nwa ya nta bụ Jekọb. 16O jikwa akpụkpọ anụ ụmụ ewu nwere ajị ajị kee Jekọb nʼaka na nʼakụkụ olu ya na-akwọ mụrụmụrụ. 17O bunyere nwa ya nwoke Jekọb nri ahụ na-atọ ụtọ, na achịcha o mere. 18O jekwuuru nna ya sị ya, “Nna m.” Ọ zara sị, “Ahaa, nwa m, onye ka ị bụ?” 19Jekọb zara nna ya sị ya, “Abụ m Ịsọ, ọkpara gị. Emeela m ihe ị sị m mee. Biko bilie ka i rie anụ m gbutere nʼọhịa, ka gị onwe gị gọzie m.” 20Ma Aịzik jụrụ nwa ya nwoke sị, “Olee otu i si chọta ya ngwangwa, nwa m?” Jekọb zara ya sị, “Ọ bụ Onyenwe anyị Chineke gị mere ka ihe gaara m nke ọma.” 21Mgbe ahụ Aịzik gwara Jekọb sị, “Bịa nso ka m metụ gị aka nwa m nwoke, ka m mata ma ị bụ Ịsọ nʼeziokwu.” 22Jekọb jere nna ya Aịzik nso, onye metụrụ ya aka kwuo sị, “Olu bụ olu Jekọb ma aka gị bụ aka Ịsọ.” 23Ọ chọpụtaghị na ọ bụ Jekọb, nʼihi na aka ya dị ajị ajị dịka nke Ịsọ. Ya mere, ọ gọziri ya. 24Ma ọ jụkwara ya ajụjụ ọzọ sị ya, “Ị bụ nwa m nwoke Ịsọ nʼeziokwu?” Jekọb zara sị ya, “E, abụ m ya.” 25Mgbe ahụ, Aịzik zara sị ya, “Butere m ụfọdụ nʼime anụ ahụ i gbutere ka m rie, nye gị ngọzị m.” Jekọb butere ya bunye ya. O riri ya. 26Mgbe ahụ, nna ya Aịzik sịrị ya, “Bịa nʼebe a nwa m nwoke, sutu m ọnụ.” 27Ya mere, o jekwuuru ya sutu ya ọnụ. Mgbe Aịzik nụrụ isisi uwe ya, ọ gọziri ya, sị, “Nʼezie, isisi nwa m nwoke dịka isisi ala ubi nke Onyenwe anyị gọziri. 28Ka Chineke nye gị site nʼigirigi nke eluigwe, na mmanụ nke ala, ụba nke mkpụrụ ubi na mmanya ọhụrụ 29Ka ọtụtụ mba jeere gị ozi, ka ndị mmadụ kpọọ isiala nye gị. Bụrụ onye ọchịchị nʼebe ụmụnna gị nọ, ka ụmụ nne gị mụrụ kpọọ isiala nye gị. Ka ndị niile na-abụ gị ọnụ bụrụ ndị a bụrụ ọnụ, ka ndị na-agọzi gị bụrụ ndị a gọziri agọzi.” 30Mgbe Aịzik gọzichara Jekọb, ka Jekọb si nʼihu ya na-apụ, lee Ịsọ ka o si ịchụ nta na-alọbata. 31Ya onwe ya sikwara nri na-atọ ụtọ butere nna ya. Mgbe ahụ, ọ gwara ya sị, “Ka nna m, bilie, rie anụ nwa ya si nʼọhịa gbute, ka gị onwe gị nye m ngọzị gị.” 32Aịzik zara sị ya, “Ị bụ onye?” Ọ zara sị, “Abụ m nwa gị nwoke Ịsọ, ọkpara gị Ịsọ.” 33Oke ahụ ọma jijiji mara Aịzik, ọ sị, “Onye kwanụ bụ onye ahụ gara gbute anụ butere m ya? Eriri m ya tupu ị bata. Agọziri m ya. Nʼezie, onye a gọziri agọzi ka ọ ga-abụ.” 34Mgbe Ịsọ nụrụ okwu ndị a si nʼọnụ nna ya, o jiri oke olu kwaa akwa nke obi ilu gwa nna ya sị ya, “Gọzie m, mụ onwe m, nna m.” 35Ma ọ zara sị ya, “Nwanne gị ejirila ụzọ aghụghọ bịa nara ngọzị gị.” 36Ịsọ kwuru sị, “E meziri kpọọ ya Jekọb, onye aghụghọ. Lee, ọ ghọgbuola m ugboro abụọ. Nke mbụ, ọ naara m ọnọdụ ịbụ ọkpara m, ugbu a ọ narakwala m ngọzị m.” Ọ jụrụ ajụjụ sị, “Ọ bụ na i nweghị ngọzị ọ bụla fọdụrụ nke ị ga-agọzi m?” 37Aịzik zara sị ya, “Emeela m ya ka ọ bụrụ onyeisi nʼebe ị nọ, mee ụmụnna ya niile ndị na-ejere ya ozi. Enyela m ya mkpụrụ ubi niile na mmanya ọhụrụ. Gịnị ọzọ ka m nwere ike imere gị, nwa m nwoke?” 38Ịsọ jụrụ nna ya sị, “Nna m, ọ bụ naanị otu ngọzị ka i nwere? Gọziekwa m nna m!” Ịsọ kwara akwa nʼoke olu. 39Nna ya Aịzik zara sị ya, “Ebe obibi gị ga-adịpụ adịpụ, site nʼebe akụnụba nke ala dị, site nʼebe igirigi nke eluigwe dị. 40Nriju afọ gị ga-abụ site na mma agha, ị ga-ejekwara nwanne gị ozi. Ma mgbe i mesịrị nwere onwe gị, ị ga-atọpụ agbụ ya, site nʼolu gị.” 41Ịsọ buru iro nʼobi megide Jekọb nʼihi ngọzị ahụ nna ya nyere ya. O kwuru nʼime onwe ya sị, “Oge a ga-eru ụjụ nʼihi nna m na-abịa nso, nʼoge ahụ aga m egbu nwanne m Jekọb.”
Ofufe mgbede: ihe ọgụgụ
16Onye na-edebe iwu Chineke na-enweta ndụ, ma onye na-akpọ ya asị na-anwụ. 17Onye ọbụla na-egosi ndị ogbenye obi ebere na-ebinye Onyenwe anyị ihe, ọ ga-akwụghachi ha nʼihi ihe ọma ha mere. 18Dọọ nwa gị aka na ntị mgbe ọ ka dị na nwantakịrị nʼihi na oge ahụ ka olileanya dị. Ma i meghị otu a, ọ bụ ndụ ya ka ị na-emebi. 19Onye oke iwe ga-anata nra so ya, nʼihi na ọ bụrụ na ị napụta ya, ị ga-anapụtakwa ya ọzọ. 20Gee ntị na ndụmọdụ a na-enye gị, nabata ịdọ aka na ntị. Nʼikpeazụ, ị ga-abụ onye maara ihe. 21Ọtụtụ atụmatụ dị nʼobi mmadụ; maọbụ uche Onyenwe anyị ga-emezu. 22Obi ebere mmadụ na-eme ka a na-achọsi ya ike. Ọ ka mma ịbụ ogbenye karịa ịbụ mmadụ nke eziokwu ọbụla na-adịghị nʼọnụ ya. 23Ịtụ egwu Onyenwe anyị na-eweta ndụ na ọṅụ, na nchebe site nʼihe mmerụ ahụ. 24Onye umengwụ na-amanye aka nʼefere nri, ọ gaghị eweghachi ya ọ bụladị tinye nʼọnụ ya. 25Tie onye na-akwa emo ihe, onye na-enweghị uche ga-aghọ onye nwere ezi uche, baara onye nwere nghọta mba, ha ga-enweta ihe ọmụma.
Ụbọchị ndị a na-eso kalenda Julian nke Nzukọ Rọshịa (dịka Nzukọ Sabia na Jọjia na Ugwu Athos): 6 Epreel na kalenda nzukọ bụ 19 Epreel na kalenda obodo. Nzukọ ndị na-eji kalenda ọhụrụ (Gris, Romania, Bulgaria, Ukraine…) na-eme mmemme ndị na-adịghị agbanwe agbanwe na ndị nsọ n’ụbọchị obodo ahụ n’onwe ya, ụbọchị 13 tupu mgbe ahụ, ụfọdụ ihe ọgụgụ ha dịkwa iche; Ista na ụbọchị ndị dabere na ya bụ otu.
Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike