Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Epreel 2027 › 6 Epreel
Kalenda Katọlik
Ihe ọgụgụ Mass (Katọlik) — 6 Epreel 2027
Tiuzdee · Izu nke 2 nke Oge Ista
Mmemme na ndị nsọ
Tiuzdee nke izu nke 2 nke Oge Ista
Ụbọchị izu · Agba ofufe: ọcha
Ihe ọgụgụ nke ụbọchị
Ihe ọgụgụ mbụ
32Ndị niile kwere ekwe nwere otu obi nʼotu mkpụrụobi. O nweghị onye ọbụla gụrụ ihe ọbụla o nwere dịka nke aka ya, kama ha mere ka onye ọbụla nʼime ha keta oke nʼihe ibe ya nwere. 33Ndị ozi sitere nʼike gaa nʼihu na-agba ama banyere mbilite nʼọnwụ Onyenwe anyị Jisọs, oke amara bakwaara ha niile ụba. 34O nweghị onye mkpa kpara nʼime ha, nʼihi na site nʼoge ruo nʼoge, ndị nwere ala maọbụ ụlọ na-ere ha, ma wetakwa ego ha retara na ha, 35nye ndị ozi, a na-ekekwa ya nye onye ọbụla dị ka mkpa ya si dị. 36Josef onye ikwu Livayị, onye sitere na Saiprọs, onye ndị ozi na-akpọ Banabas (nke pụtara “nwa nke nkasiobi”). 37O rere ala o nwere, weta ego ya, ma tọgbọ ya nʼụkwụ ndị ozi.
Abụ Ọma nzaghachi
1Onyenwe anyị bụ eze, ọ na-eyikwasị ịma mma dịka uwe; Onyenwe anyị na-eyikwasị ịma mma dịka uwe, ọ dịkwa ike nke ukwuu; nʼezie, ụwa niile na-eguzosikwa ike; apụghịkwa iwezuga ya nʼọnọdụ ya. 2Ocheeze gị eguzosiela ike siterị na mgbe ochie; ị na-adịkwa site nʼebighị ebi ruo ebighị. 5Ụkpụrụ gị niile, Onyenwe anyị na-eguzosi ike; ịdị nsọ bụ ihe e ji chọọ ụlọ gị mma ruo ụbọchị na-enweghị ọgwụgwụ.
Oziọma
7Ya ejula gị anya na m sịrị gị, ‘Agaghị ịmụ unu ọzọ.’ 8Ifufe na-efe nʼebe ọbụla masịrị ya. I nwere ike nụ ụzụ ya ma ịmataghị ebe o si abịa maọbụ ebe ọ na-aga. Otu a ka ọ dịkwara onye ọbụla a mụrụ site na Mmụọ.” 9Nikọdimọs zara sị ya, “Olee otu ihe ndị a ga-esi mee?” 10Jisọs zara sị ya, “Ị bụ onye ozizi ndị Izrel, ma ị ghọtaghị ihe ndị a? 11Nʼezie, nʼezie agwa m unu. Anyị na-ekwu banyere ihe anyị maara, na-akọwapụtakwa ihe anyị hụrụ, ma unu onwe unu adịghị anabata akaebe anyị. 12Ekwuola m banyere ihe dị nʼụwa ma unu ekweghị ya, oleekwanụ otu unu ga-esi kwere, ma ọ bụrụ na mụ agwa unu banyere ihe ndị dị nʼeluigwe? 13O nwebeghị onye ọbụla rigooro nʼeluigwe ewezuga Nwa nke Mmadụ bụ onye siri nʼeluigwe rịdata. 14Dị ka Mosis weliri agwọ elu nʼime ọzara, otu a ka a ga-ewelikwa Nwa nke Mmadụ elu. 15Ka onye ọbụla kwere na ya nwee ndụ ebighị ebi.”
Kalenda Rom n’ozuzu; ọgbakọ ndị bishọp nwere ike ibuga ụfọdụ mmemme (Epifani, Mgbago n’Eluigwe, Ahụ na Ọbara Kraịst) n’ụbọchị Sọnde ma ọ bụ tinye nke ha. Akwụkwọ ọgụgụ: usoro Sọnde B, afọ ụbọchị izu I.
Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike