Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Epreel 2027 › 5 Epreel
Kalenda Ọtọdọks · 23 Maachị (Kalenda ochie)
Ihe ọgụgụ Ọtọdọks nke ụbọchị — 5 Epreel 2027
Mọnde · Izu nke 4 nke Lent Ukwu · Olu 3
Mmemme na ndị nsọ
Martyr Nikon in Sicily and his 199 Disciples († 251)
Oge Lent Ukwu
Obubu ọnụ siri ike (nri akọrọ: achịcha, akwụkwọ nri, mkpụrụ osisi)
Nke a na-eso iwu ndị mọnk. Nʼparish, a na-ekpebi ọtụtụ obubu ọnụ ya na onye na-anụ nkwupụta mmadụ, dịka ahụike, afọ na ọnọdụ si dị.
Ihe ọgụgụ nke ụbọchị
Elekere nke 6
24Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile aṅụọla iyi kwuo sị, “Nʼezie, dịka m si tụọ ya nʼobi m, otu a ka ọ ga-emekwa. Ọ ga-eguzosikwa ike dịka m si zube ya. 25M ga-etipịa ndị Asịrịa nʼala m, nʼelu ugwu m ka m ga-anọ zọpịa ha nʼokpuru ụkwụ. A ga-ebupụ ibu arọ ya site nʼahụ ndị m, a ga-ewezugakwa ibu arọ ya site nʼubu ha.” 26Nke a bụ nzube ahụ nke ezubere maka ụwa niile; nke a bụkwa aka ahụ esetipụrụ nʼelu mba niile dị iche iche. 27Nʼihi na Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, bụ dike nʼagha, ezubela ime ya. Onye kwa pụrụ ịgbanwe nzube ya? O setịpụla aka ya, onye pụrụ ime ka o weghachi ya azụ? 28Amụma a bịara nʼafọ ahụ eze Ehaz nwụrụ: 29Unu aṅụrịla ọṅụ, unu ndị Filistia, maka na mkpọrọ e ji eti unu ihe agbajiela; Ọ bụ ezie na ọ gbajiela, ma ihe ga-esite nʼọdụdụ agwọ ahụ pụta bụ ajụala, mkpụrụ ya ga-abụ agwọ ọjọọ, nke na-amagharị ebe niile. 30Ndị bụ nnọọ ogbenye ga-achọta ihe oriri, ndị mkpa na-akpa ga-ebikwa nʼudo. Ma aga m eji agụụ na ụnwụ laa ndị fọdụrụ ndụ nʼetiti unu nʼiyi. 31Kwasie akwa ike gị ọnụ ụzọ ama! Tie mkpu gị obodo! Tụọnụ oke egwu unu ndị Filistia. Nʼihi na lee, ndị agha a zụziri azụzi si nʼugwu na-abịa imegide gị. Ọ dịghị onye na-aga iche nʼetiti ahịrị ha. 32Ọsịsa dị aṅaa ka anyị ga-enye ndị ozi si na mba ahụ? Gwa ha na Onyenwe anyị emeela ka Zayọn guzosie ike. Ọ bụkwa nʼime ya ka ndị ya e wedara nʼala ga-achọtara onwe ha ebe mgbaba.
Ofufe mgbede: ihe ọgụgụ
21Onyenwe anyị nụrụ isisi ụtọ nke aja nsure ọkụ ahụ kwuo nʼobi ya sị, “Agaghị m abụ ala ọnụ ọzọ nʼihi mmadụ, ebe ọ bụ na izuzu obi mmadụ bụ ime ihe ọjọọ site na mgbe ọ bụ nwata, agakwaghị m ala ihe niile e kere eke na-eku ume ndụ iyi ọzọ, dịka m mere. 22“Ogologo oge niile ụwa ga-anọgide, oge ịkụ mkpụrụ na oge iwe ihe ubi, oge oyi na oge okpomọkụ, ọkọchị na udu mmiri, ehihie na abalị, agaghị ebi.” 9:1Mgbe ihe ndị a gasịrị, Chineke gọziri Noa na ụmụ ya sị ha: “Mụọnụ, baanụ, jupụtanụ nʼụwa. 2Egwu unu na ụjọ unu ga-adakwasị anụmanụ niile nke ụwa nke dị ndụ, na anụ ufe niile nke eluigwe, na ihe e kere eke niile na-akpụgharị nʼala, na azụ niile dị nʼosimiri. Ewerela m ha niile nyefee unu nʼaka. 3Ihe ọbụla dị ndụ nke na-ejegharị ejegharị ga-abụ nri unu. Enyela m unu ihe niile ugbu a dịka m si nye unu ahịhịa ndụ niile. 4“Ma unu agaghị eri anụ ọbụla nke ọbara ndụ ya dị ya nʼahụ. 5Ma gbasara ọbara ndụ unu, unu ga-asara ọnụ unu nʼihu m. Anụmanụ ọbụla ga-asara ọnụ ya nʼihu m. Mmadụ ọbụla kwa ga-asara ọnụ ya nʼihu m banyere ndụ mmadụ ibe ya. 6“Onye ọbụla wufuru ọbara mmadụ, nʼaka mmadụ ka a ga-awụfu ọbara nke ya, nʼihi nʼoyiyi Chineke ka Chineke mere mmadụ. 7Ma unu onwe unu, mịanụ mkpụrụ, mụbaanụ, jupụtanụ ụwa, baakwanụ ụba nʼime ya.”
Ofufe mgbede: ihe ọgụgụ
19Onye na-eguzosi ike ime ihe ziri ezi ga-enwe ndụ; ma onye na-agbaso ihe ọjọọ ga-ahụ ọnwụ. 20Onyenwe anyị na-akpọ ndị obi ha gbagọrọ agbagọ asị ma ndị ụzọ ha na-enweghị ihe ịta ụta na-amasị ya. 21Ọ bụ ihe doro anya na ndị na-emebi iwu ga-ata ahụhụ, ma ndị ezi omume ka a ga-anapụta. 22Nwanyị mara mma, nke na-enweghị uche, dịka ọlaedo a gbanyere ezi nʼimi. 23Olileanya onye ezi omume bụ ọṅụ, ma onye na-emebi iwu na-ele naanị anya ihe ọjọọ. 24Otu onye na-agbasapụ aka ya na-enye enye ma na-enweta akụ karịa, ma onye ọzọ na-egbochi egbochi ma na-ada ogbenye. 25E, onye na-agbasa aka ya ga-aba ọgaranya; onye ọbụla na-atụte ndị ọzọ ka a ga-atụtekwa. 26Ndị mmadụ na-abụ onye na-achịkọba mkpụrụ ọka na-ereghị ya ere ọnụ, ma ha na-ekpetara onye nke dị njikere ire nke ya ngọzị Chineke. 27Onye na-achọ ihe ọma na-enweta ihuọma, ma ihe ọjọọ na-abịakwasị onye na-achọ ya. 28Ndị tụkwasịrị obi nʼakụnụba ha ga-ada, ma onye ezi omume ga-epupụta dịka akwụkwọ ndụ. 29Onye na-ewetara ezinaụlọ ha nsogbu ga-eketa naanị ifufe, onye nzuzu ga-abụ ohu nke onye maara ihe. 30Mkpụrụ nke ndị ezi omume bụ osisi na-enye ndụ, onye na-erita mkpụrụobi nʼuru bụ onye maara ihe. 31Ọ bụrụ na a ga-akwụ ndị ezi omume ụgwọ ọrụ ha nʼụwa a; a ga-esi aṅaa ghara ịkwụ ndị na-amaghị Chineke na ndị mmehie ụgwọ ọrụ. 12:1Onye ọbụla na-ahụ ịdọ aka na ntị nʼanya na-ahụ ihe ọmụma nʼanya, ma onye na-akpọ ịba mba asị bụ onye na-enweghị ụbụrụ isi. 2Ezi mmadụ na-anata ihuọma site nʼaka Onyenwe anyị, ma onye na-atụpụta atụmatụ ọjọọ ka ọ na-ama ikpe. 3Onye ajọ omume agaghị anọgide, ma apụghị ihopu onye ezi omume. 4Ezi nwanyị bụ ọṅụ na okpueze di ya, ma nwanyị na-eweta ihere dịka ire ure nʼọkpụkpụ di ya. 5Echiche obi niile nke onye ezi omume bụ ihe ziri ezi, ma ndụmọdụ onye ajọ omume jupụtara nʼaghụghọ. 6Okwu niile nke ndị ajọ omume bụ ihe na-eweta ọnwụ, ma okwu ndị omume ha ziri ezi na-anapụta ha.
Ụbọchị ndị a na-eso kalenda Julian nke Nzukọ Rọshịa (dịka Nzukọ Sabia na Jọjia na Ugwu Athos): 23 Maachị na kalenda nzukọ bụ 5 Epreel na kalenda obodo. Nzukọ ndị na-eji kalenda ọhụrụ (Gris, Romania, Bulgaria, Ukraine…) na-eme mmemme ndị na-adịghị agbanwe agbanwe na ndị nsọ n’ụbọchị obodo ahụ n’onwe ya, ụbọchị 13 tupu mgbe ahụ, ụfọdụ ihe ọgụgụ ha dịkwa iche; Ista na ụbọchị ndị dabere na ya bụ otu.
Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike