Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Epreel 2027 › 5 Epreel
Kalenda Katọlik
Ihe ọgụgụ Mass (Katọlik) — 5 Epreel 2027
Mọnde · Izu nke 2 nke Oge Ista
Mmemme na ndị nsọ
Mkpọsa nke Onyenwe anyị
Mmemme ukwu · Agba ofufe: ọcha
Ihe ọgụgụ nke ụbọchị
Ihe ọgụgụ mbụ
10Ọ dịghị anya, Onyenwe anyị ziri Ehaz ozi ndị a sị, 11“Jụọ m bụ Onyenwe anyị Chineke gị, ka m meere gị ihe ịrịbama nke ga-egosi gị na m ga-ebibi ndị iro gị niile dịka m kwuru. Rịọọ m ihe masịrị gị, nʼebe dị elu nʼeluigwe maọbụ nʼebe kachasị omimi nʼụwa.” 12Ma Ehaz zara sị, “Mba, agaghị arịọ, agaghị m anwakwa Onyenwe anyị m otu a.” 13Ma Aịzaya sịrị, “Ṅaanụ ntị unu ụlọ Devid. Ọ bụ na o zurughị unu ime ka ike gwụ mmadụ? Unu ga-emekwa ka ike gwụ Chineke nʼonwe ya? 14Ya mere, Onyenwe anyị nʼonwe ya ga-enye gị ihe ịrịbama! Lee, nwaagbọghọ ahụ na-amaghị nwoke ga-atụrụ ime, mụọ nwa nwoke. Ọ ga-akpọ aha ya Ịmanụel, nke pụtara, Chineke nọnyeere anyị. 8:10Tụọnụ atụmatụ unu ma a ga-ekposa ya. Wepụtanụ atụmatụ unu ma ọ gaghị eguzo nʼihi na Chineke nọnyere anyị.
Abụ Ọma nzaghachi
6Aja na onyinye abụghị ihe ị chọrọ ma ị megheela ntị abụọ; aja nsure ọkụ na aja a chụrụ maka mmehie abụghị ihe ị chọrọ. 7Mgbe ahụ, ekwuru m sị, “Lee m, abịala m, e dere banyere m nʼime akwụkwọ mpịakọta. 8O Chineke m, ọ bụ ọchịchọ m ime ihe ị na-achọ, iwu gị dị nʼime obi m.” 9Ana m anọ nʼetiti ọgbakọ ukwuu na-ekwusa ihe ziri ezi; dịka ị maara, o Onyenwe anyị, anaghị m emechi ọnụ m. 10Ekpuchighị m ezi omume gị nʼime obi m, ana m ekwupụta maka ikwesi ntụkwasị obi gị na nzọpụta gị. Adịghị m ekpuchi ịhụnanya na eziokwu gị, nʼebe ọgbakọ ukwuu nọ.
Ihe ọgụgụ nke abụọ
4Nʼihi na ọ bụ ihe na-apụghị ime eme na ọbara oke ehi na nke ụmụ ewu dị iche iche ga-asachapụ mmehie. 5Ya mere mgbe Kraịst bịara nʼụwa, ọ sịrị, “Aja na onyinye abụghị ihe ị chọrọ kama ị kwadoro ahụ nye m. 6Aja nsure ọkụ na aja a chụrụ maka mmehie, ha abụghị ihe dị ezi mma nye gị. 7Mgbe ahụ ka m sịrị, ‘Lee, abịala m Chineke m, ime ihe ị na-achọ. Nke a bụkwa ihe e dere banyere m nʼime akwụkwọ mpịakọta.’ ” 8O kwuru na mbụ, “Aja dị iche iche, na onyinye, na aja nsure ọkụ na aja mmehie adịghị atọ gị ụtọ, ha adịghịkwa amasị gị” (a chụrụ aja ndị a dịka iwu si dị). 9O kwukwara ọzọ, “Lee abịala m ime uche gị.” Ọ kagburu aja nke mbụ ahụ ma were aja nke abụọ dochie nʼọnọdụ ya. 10Site nʼime uche Chineke, e mere ka anyị dị nsọ site nʼaja Jisọs Kraịst ji onwe ya chụọ naanị otu ugboro.
Oziọma
26Ma nʼọnwa isii ya, Chineke zigara mmụọ ozi ya, bụ Gebrel, ka ọ gaa nʼobodo Nazaret nke dị nʼime Galili. 27Ka o jekwuru otu nwaagbọghọ na-amaghị nwoke bụ onye otu nwoke aha ya bụ Josef, onye sitere nʼagbụrụ Devid, kwere nkwa ịlụ. Aha nwaagbọghọ a bụ Meri. 28O jekwuru ya sị ya, “Ekele! Gị onye ihuọma dịkwasịrị. Onyenwe anyị nọnyekwara gị.” 29Ma obi lọrọ ya mmiri nke ukwuu nʼihi okwu ya. O bidokwara ịtụgharị nʼuche ya ihe ekele a pụtara. 30Ma mmụọ ozi ahụ sịrị ya, “Atụla egwu Meri, nʼihi na i chọtala ihuọma nʼebe Chineke nọ. 31Ma lee ị ga-atụrụ ime, mụọ nwa nwoke. Ị ga-akpọkwa aha ya Jisọs. 32Ọ ga-abụ nnukwu mmadụ onye a ga-akpọ Ọkpara Onye kachasị ihe niile elu. Onyenwe anyị Chineke ga-enye ya ocheeze nna ya Devid. 33Ọ ga-achị ụlọ Jekọb ruo ebighị ebi, alaeze ya agaghị enwekwa ọgwụgwụ.” 34Meri sịrị mmụọ ozi ahụ, “Olee otu nke a ga-esi mee ebe m bụ nwaagbọghọ na-amaghị nwoke?” 35Mmụọ ozi ahụ sịrị ya, “Mmụọ Nsọ ga-abịakwasị gị, ike nke Onye kachasị ihe niile elu ga-ekpuchikwa gị. Ya mere onye nsọ ahụ a ga-amụ, a ga-akpọ ya Ọkpara Chineke. 36Lekwa Elizabet onye ikwu gị atụrụla ime nwa nwoke nʼagadi ya. Nke a bụ ọnwa isii ya, bụ onye ahụ ha na-akpọ nwanyị aga. 37Nʼihi na ọ dịghị okwu sitere na Chineke nke na-agaghị ere.” 38Meri zaghachiri sị, “Abụ m ohu Onyenwe anyị, ka ọ dịrị m dị ka i kwuru.” Mgbe ahụ mmụọ ozi ahụ hapụrụ ya laa.
Ndị nsọ nke ụbọchị
- Onye nsọ Vinsent Ferrer, Onye ụkọchukwu
Kalenda Rom n’ozuzu; ọgbakọ ndị bishọp nwere ike ibuga ụfọdụ mmemme (Epifani, Mgbago n’Eluigwe, Ahụ na Ọbara Kraịst) n’ụbọchị Sọnde ma ọ bụ tinye nke ha. Akwụkwọ ọgụgụ: usoro Sọnde B, afọ ụbọchị izu I.
Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike