Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Epreel 2027 › 2 Epreel

Kalenda Ọtọdọks · 20 Maachị (Kalenda ochie)

Ihe ọgụgụ Ọtọdọks nke ụbọchị — 2 Epreel 2027

Fraịdee · Izu nke 3 nke Lent Ukwu · Olu 2

Mmemme na ndị nsọ

Venerable Fathers slain at the Monastery of Saint Sabbas: John, Sergius, Patrick and others († 796)

Oge Lent Ukwu

Obubu ọnụ siri ike (nri akọrọ: achịcha, akwụkwọ nri, mkpụrụ osisi)

Nke a na-eso iwu ndị mọnk. Nʼparish, a na-ekpebi ọtụtụ obubu ọnụ ya na onye na-anụ nkwupụta mmadụ, dịka ahụike, afọ na ọnọdụ si dị.

Ihe ọgụgụ nke ụbọchị

Elekere nke 6

Aịz 13:2–13

2Welienụ ọkọlọtọ agha nʼelu ugwu tọgbọrọ nʼefu. Kpọkuonụ ndị agha. Feerenụ ha aka, ka ha site nʼọnụ ụzọ ama nke ndị a maara aha ha bata nʼime obodo ukwu ahụ na-anya isi. 3Enyela m ndị m kwadoro maka agha iwu; akpọọla m ndị ọka agha m oku, bụ ndị na-aṅụrị ọṅụ na mmeri m, ka ha gosipụta oke iwe m. E, ndị m kpọrọ bụ ndị ahụ na-aṅụrị ọṅụ ịhụ na m meriri ndị iro m. 4Gee ntị nụrụ ụzụ na-ada nʼugwu niile; gee ntị nụrụ ụzụ yiri ụzụ nke igwe mmadụ na-eme. Gee ntị nụrụ mkpọtụ na-ada nʼetiti alaeze dị iche iche. Dịka mkpọtụ na-eme mgbe ọtụtụ mba na-ezukọta nʼotu ebe. Ọ bụ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile na-achịkọta ndị agha ya nʼihi ibu agha. 5Ha si nʼobodo dị iche iche, nke dị anya na nke dị na nsọtụ ụwa na-abịa. Ha bu ngwa agha na-egosi oke iwe Onyenwe anyị na-abịa imebi ala ahụ niile. 6Kwasienụ akwa ike nʼihi na ụbọchị Onyenwe anyị dị nso, ụbọchị ahụ oke mbibi ga-esi nʼaka Onye pụrụ ime ihe niile bịara unu. 7Nʼihi nke a, aka ndị mmadụ ga-ada mba, obi ga-alọkwa ndị mmadụ mmiri. 8Ha ga-ama jijiji nʼihi oke egwu. Ahụ mgbu ga-abịakwasị ha mee ka ha sụọ ude dịka nwanyị ime na-eme. Ha ga-elerịta onwe ha anya nʼọnọdụ mgbagwoju anya, ha agaghị amakwa ihe ha ga-eme. Ọnọdụ dị otu a ga-apụta ihe nʼihu ha. 9Nʼihi na lee, ụbọchị Onyenwe anyị na-abịa, ụbọchị nke obi ebere na-agaghị adịkwa, ụbọchị iwe na oke ọnụma. A ga-ekpochapụ ala ahụ, ya na ndị mmehie niile dị nʼime ya. 10Nʼihi na kpakpando niile nke eluigwe na kpakpando ndị ọzọ gbara ha gburugburu agaghị egosipụta ìhè ha. Anyanwụ ga-agba ọchịchịrị nʼọwụwa ya ọnwa agakwaghị enye ìhè ya. 11Aga m ata ụwa ahụhụ nʼihi mmehie ya, taakwa ndị na-emebi iwu ahụhụ nʼihi mmehie ha. Ịnya isi nke onye mpako ka m ga-egwepịa, ya na nganga onye na-adịghị eme ebere. 12Aga m eme ka mmadụ dị ụkọ karịa ọlaedo a nụchara anụcha, ha ga-akọ ụkọ karịa ọlaedo si Ọfịa. 13Nʼihi na m ga-eme ka eluigwe maa jijiji, meekwa ka e wezuga ụwa site nʼọnọdụ ya, nʼihi oke iwe ga-ewe Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile. Ha ga-emezu nʼụbọchị ahụ ọ ga-ezipụta oke iwe ya dị ọkụ.

Ofufe mgbede: ihe ọgụgụ

Jen 8:4–21

4Nʼụbọchị iri na asaa nke ọnwa asaa, ụgbọ mmiri ahụ gara nọkwasị nʼelu ugwu Ararat. 5Mmiri a gara nʼihu na-ata ruo ọnwa nke iri. Nʼụbọchị nke mbụ nke ọnwa iri, e bidoro ịhụ elu ugwu ndị ọzọ anya. 6Mgbe iri ụbọchị anọ gafere, Noa meghere oghereikuku ọ rụnyere nʼakụkụ ụgbọ mmiri ahụ, 7site nʼebe ahụ zipụ otu ugolọma nke na-efepụ na-efebatakwa, tutu ruo mgbe mmiri kọrọ nʼelu ala. 8Emesịa, o zipụrụ otu nduru iji mata ma mmiri ọ kọọla nʼala, 9ma nduru ahụ achọtaghị ebe o nwere ike ibe, nʼihi na mmiri ka tojuru elu ụwa niile. Nʼihi ya, nduru ahụ lọghachikwutere Noa nʼime ụgbọ ahụ. Noa setịpụrụ aka ya nwụbata nduru ahụ nʼụgbọ. 10Mgbe abalị asaa gafere, Noa zipụrụ nduru ahụ ọzọ 11Nʼoge anyasị, nduru a lọghachiri. Ọ kpụ akwụkwọ oliv ọhụrụ ọ kụbitere nʼọnụ ya. Nke a gosiri Noa na mmiri ahụ ataala nʼelu ala. 12Mgbe abalị asaa gafere, Noa zipụkwara nduru ahụ ọzọ. Ma nʼoge a, ọ lọtakwaghị ọzọ. 13Nʼụbọchị mbụ nke ọnwa mbụ nʼafọ narị isii na otu nke ndụ Noa, mmiri ahụ atachaala nʼelu ala. Mgbe ahụ, Noa kpughepụrụ ihe mkpuchi nke ụgbọ mmiri ahụ, hụ na mmiri atachaala nʼelu ala. 14Ma ọ bụ nʼụbọchị iri abụọ na asaa nke ọnwa abụọ ka mmiri ji takọrọchaa nʼelu ala. 15Mgbe ahụ, Chineke gwara Noa okwu sị ya, 16“Site nʼụgbọ mmiri pụta, gị na nwunye gị, na ụmụ gị ndị ikom, na ndị nwunye ụmụ gị ndị ikom. 17Kpọpụta anụ niile dị ndụ nke gị na ha nọ, anụ ufe, na ụmụ anụmanụ, na ihe e kere eke niile na-akpụgharị nʼala, ka ha gaa nʼụwa mụọ ọmụmụ, baa ụba, jupụta nʼelu ya.” 18Ya mere, Noa si nʼụgbọ mmiri ahụ pụta, ya na ụmụ ya, na nwunye ya, na ndị nwunye ụmụ ya. 19Ma anụmanụ niile ọbụla nke dị ndụ, na ihe niile na-akpụgharị nʼala, na anụ ufe niile, ihe niile na-ejegharị nʼụwa, ka ụdị ha si dị, sitere nʼụgbọ mmiri ahụ pụta. 20Mgbe ahụ, Noa wuru ebe ịchụ aja nye Onyenwe anyị. Ọ họọrọ site nʼanụ ụlọ ndị dị ọcha na anụ ufe ndị dị ọcha chụọ aja nsure ọkụ. 21Onyenwe anyị nụrụ isisi ụtọ nke aja nsure ọkụ ahụ kwuo nʼobi ya sị, “Agaghị m abụ ala ọnụ ọzọ nʼihi mmadụ, ebe ọ bụ na izuzu obi mmadụ bụ ime ihe ọjọọ site na mgbe ọ bụ nwata, agakwaghị m ala ihe niile e kere eke na-eku ume ndụ iyi ọzọ, dịka m mere.

Ofufe mgbede: ihe ọgụgụ

Ilu 10:31–11:12

31Nʼọnụ onye ezi omume ka mkpụrụ amamihe si abịa, ma ire na-ekwu okwu nduhie ka a ga-eme ka o dere duu. 32Egbugbere ọnụ onye ezi omume mara ihe na-eweta ihuọma, ma ọnụ ndị ajọ omume bụ naanị okwu nduhie. 11:1Ihe ọtụtụ aghụghọ bụ arụ nʼihu Onyenwe anyị ma ihe ọtụtụ zuru ezu na-anata ihuọma nʼebe ọ nọ. 2Nganga bịa, nlelị a na-eso ya, ma onye dị umeala nʼobi na-amụta ihe. 3Eziokwu nke ndị ziri ezi nʼobi na-edu ha; ma omume gbagọrọ agbagọ nke ndị aghụghọ nʼala ha nʼiyi. 4Akụnụba gị agaghị azọpụta gị nʼụbọchị ikpe; ọ bụ naanị ezi omume na-anapụta site nʼọnwụ. 5Ezi omume nke ndị na-enweghị ịta ụta na-eme ka ụzọ ha zie ezi, ma ajọ omume nke ndị na-emebi iwu na-akwada ha. 6Ezi omume nke onye ziri ezi na-azọpụta ya; ma ọchịchọ ọjọọ nke ndị na-aghọ aghụghọ ka a ga-eji jide ha. 7Mgbe onye ajọ omume nwụrụ, olileanya ya niile alala nʼiyi, ihe niile ọ na-ele anya inweta site nʼike ya alaakwala nʼiyi. 8Chineke na-azọpụta ndị ezi omume site na nsogbu ha, ma ndị ajọ omume ka ọ na-ahapụ ka ha daba nʼime ya. 9Okwu ọjọọ ka onye ajọ omume ji emebi onye agbataobi ya. Ma site nʼihe ọmụma ka onye ezi omume ga-eji dọpụta ndụ ya. 10Ọganihu nke onye ezi omume na-atọ mmadụ niile ụtọ, otu aka ahụ kwa, ọnwụ onye ajọ omume na-atọ mmadụ niile ụtọ. 11A na-esite na ngọzị nke ndị ziri ezi bulie obodo elu, ma a nʼala ya nʼiyi site nʼokwu ọnụ ndị ajọ omume. 12Ikwu okwu nleda megide onye agbataobi gị bụ nzuzu; ma onye ahụ nwere nghọta na-agba nkịtị.

Ụbọchị ndị a na-eso kalenda Julian nke Nzukọ Rọshịa (dịka Nzukọ Sabia na Jọjia na Ugwu Athos): 20 Maachị na kalenda nzukọ bụ 2 Epreel na kalenda obodo. Nzukọ ndị na-eji kalenda ọhụrụ (Gris, Romania, Bulgaria, Ukraine…) na-eme mmemme ndị na-adịghị agbanwe agbanwe na ndị nsọ n’ụbọchị obodo ahụ n’onwe ya, ụbọchị 13 tupu mgbe ahụ, ụfọdụ ihe ọgụgụ ha dịkwa iche; Ista na ụbọchị ndị dabere na ya bụ otu.

Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike