Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Epreel 2027 › 1 Epreel
Kalenda Ọtọdọks · 19 Maachị (Kalenda ochie)
Ihe ọgụgụ Ọtọdọks nke ụbọchị — 1 Epreel 2027
Tọọzdee · Izu nke 3 nke Lent Ukwu · Olu 2
Mmemme na ndị nsọ
Holy Martyrs Chrysanthus and Daria and with them Martyrs Claudius the Tribune with his wife Hilaria and their sons Jason and Maurus, and Diodorus the Priest and Marianus the Deacon at Rome († 283)
Oge Lent Ukwu
Obubu ọnụ siri ike (nri akọrọ: achịcha, akwụkwọ nri, mkpụrụ osisi)
Nke a na-eso iwu ndị mọnk. Nʼparish, a na-ekpebi ọtụtụ obubu ọnụ ya na onye na-anụ nkwupụta mmadụ, dịka ahụike, afọ na ọnọdụ si dị.
Ihe ọgụgụ nke ụbọchị
Elekere nke 6
10Nʼụbọchị ahụ, mgbọrọgwụ Jesi ga-eguzo ka ọkọlọtọ nye ndị dị iche iche. Mba niile ga-abịakwute ya; ebe izuike ya ga-ejupụtakwa nʼebube. 11Nʼụbọchị ahụ, Onyenwe anyị ga-esetikwa aka nke ugboro abụọ inwetaghachiri onwe ya ndị ya fọdụrụ site na Asịrịa, sitekwa na ndịda Ijipt, sitekwa na Mgbago Ijipt, sitekwa na Kush, sitekwa na Elam, sitekwa na Babilọn, bụ Shaịna, sitekwa na Hamat na obodo niile dị nʼala niile osimiri gbara gburugburu. 12Ọ ga-ebuliri mba niile ọkọlọtọ ọ ga-akpọghachite ụmụ Izrel achụpụrụ achụpụ, ọ ga-esite na nsọtụ anọ nke ụwa kpokọta ndị Juda niile site nʼebe a chụsasịrị ha. 13Ekworo Ifrem ga-akwụsị, a ga-ebipụ ndị iro Juda. Nʼikpeazụ, ekworo ahụ nke dị nʼetiti Izrel na Juda ga-akwụsị; ha agaghị alụsokwa onwe ha ọgụ ọzọ. 14Ha ga-ejikọta aka ha buso ndị Filistia nọ nʼakụkụ ọdịda anyanwụ ala ha agha; ha ga-ebusokwa ndị bichiri nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ ala ahụ agha. Ha ga-emeri ndị Edọm na Moab. Ndị Amọn ga-erubekwara ha isi. 15Onyenwe anyị ga-eme ka warawara ọnụ osimiri Ijipt taa. Ọ ga-eji ifufe siri ike, nke na-ekpo ọkụ mikọrọ mmiri dị nʼosimiri Yufretis. Ọ ga-ekewa ya ka ọ bụrụ isi iyi asaa, nke mmadụ nwere ike iji ụkwụ gafee. 16Ọ ga-esite nʼAsịrịa kpawaa ụzọ nʼihi ndị ya fọdụrụ nʼebe ahụ, dịka o si meere ndị Izrel nʼoge gara aga, mgbe ha si nʼIjipt na-alọta. 12:1Nʼụbọchị ahụ, ị ga-ekwu sị, “Aga m eto gị Onyenwe anyị. Ọ bụ ezie na ị wesara m iwe, ma ugbu a, iwe gị adajụọla; ị kasịkwara m obi. 2Nʼezie, Chineke bụ onye nzọpụta m; aga m atụkwasị ya obi, ụjọ agaghị atụkwa m. Onyenwe anyị, Onyenwe anyị ya onwe ya, bụ ike m bụrụkwa abụ m, ọ ghọrọla m onye nzọpụta.”
Ofufe mgbede: ihe ọgụgụ
11Nʼafọ narị isii nke ndụ Noa, nʼọnwa nke abụọ, nʼụbọchị nke iri na asaa, bụ ụbọchị isi iyi niile dị nʼime ime ala nupụtara nʼelu ala, mmiri niile dị na mbara eluigwe ka a hapụrụ ka ha wụdata nʼụwa. 12Mmiri zogịdere na-esepụghị aka iri ụbọchị anọ, ehihie na abalị. 13Nʼụbọchị ahụ kpomkwem, Noa banyere nʼụgbọ mmiri ahụ, ya na Shem, Ham na Jafet, bụ ụmụ Noa, na nwunye Noa, na ndị nwunye atọ nke ụmụ ya. 14Ha onwe ha, na anụ ọhịa ọbụla, nʼụdị ya, na anụ ụlọ ọbụla, nʼụdị ya na ihe ọbụla e kere eke na-akpụgharị nʼala, nʼụdị ya, na anụ ufe ọbụla nʼụdị ya, na aha nnụnụ ọbụla na ihe ọbụla nwere nku. 15Ha bịakwutere Noa nʼime ụgbọ mmiri ahụ, abụọ abụọ site nʼihe niile ọbụla e kere eke, nke nwere ume ndụ nʼime ha. 16Ma ndị banyerenụ bụ oke na nwunye, site na ihe niile nwere ndụ dịka Chineke nyere ya nʼiwu. Mgbe ahụ, Onyenwe anyị mechiri ọnụ ụzọ dị nʼụgbọ mmiri ahụ. 17Uju mmiri nọgidere nʼụwa iri ụbọchị anọ. Mgbe mmiri ndị a na-aba ụba, ha buliri ụgbọ mmiri ahụ elu site nʼelu ala. 18Mmiri ndị a toro na-ala elu na-abawanyekwa ụba nʼelu ụwa. Ụgbọ mmiri ahụ segooro nʼelu mmiri. 19Mmiri ndị ahụ toro laa elu kpuchie ugwu ukwu niile dị nʼokpuru mbara eluigwe. 20Mmiri ndị a toro kpuchiri ugwu niile, ruo na ịla elu mmiri ndị a site nʼelu ugwu ukwu niile ruru mita asaa. 21Ihe niile nwere ndụ nke na-ejegharị nʼelu ụwa kubiri ume. Anụ ufe, na anụ ụlọ, na anụ ọhịa, na ihe niile e kere eke jupụtara nʼụwa, na ụmụ mmadụ niile. 22Ee, ihe niile na-eku ume nke bi nʼelu ala nwụrụ. 23Ihe niile nwere ume ndụ nʼelu ụwa ka e kpochapụrụ. Mmadụ na anụmanụ, na anụ na-akpụgharị nʼala na nnụnụ niile. A lara ha niile nʼiyi. Ma ọ bụ naanị Noa na ndị niile so ya nọdụ nʼụgbọ mmiri ahụ ka a hapụrụ ndụ. 24Narị ụbọchị na iri ụbọchị ise ka mmiri dọọrọ nʼelu ụwa dum. 8:1Ma Chineke chetara Noa na ụmụ anụ ọhịa niile, na ụmụ anụ ụlọ niile so ya nọdụ nʼụgbọ mmiri ahụ. O zitere ifufe, mee ka o fee nʼelu mmiri ahụ ime ka mmiri ahụ bido ịta. 2A kpọchiri isi iyi mmiri niile dị nʼime ime ala, kpọchiekwa ọnụ ụzọ mmiri ozuzo nke mbara eluigwe. Mmiri kwụsịrị isi na mbara eluigwe na-ezokwasị ụwa. 3Mmiri ahụ dị nʼụwa ji nwayọọ na-ata. Mgbe narị ụbọchị na iri ụbọchị ise gafesịrị, mmiri ahụ atalatala.
Ofufe mgbede: ihe ọgụgụ
1Ilu dị iche iche nke Solomọn: Nwata maara ihe na-eme ka nna ya ṅụrịa ọṅụ; ma nwantakịrị dị nzuzu na-ewetara nne ya nʼiru ụjụ. 2Akụ a kpatara nʼụzọ na-ezighị ezi adịghị aba uru, ma ezi omume na-azọpụta mmadụ site nʼọnwụ. 3Onyenwe anyị agaghị ekwe ka onye ezi omume nwụọ nʼagụụ, ọ gakwaghị ekwe ka ihe nọgide na-agara onye ajọ omume nke ọma. 4Aka ndị umengwụ na-eweta ogbenye, ma aka na-arụsị ọrụ ike na-eweta ụba. 5Onye na-ekpokọta nʼoge ọkọchị bụ nwa maara ihe, ma nwa ahụ nke na-arahụ ụra nʼoge ọrụ bụ nwa na-eweta ihere. 6Onye ezi omume na-anata ngọzị, ma naanị nkọcha jupụtara nʼọnụ onye ajọ omume. 7Aha onye ezi omume ka eji enye ngọzị, ma aha onye ajọ omume ga-ere ure. 8Onye obi ya maara ihe na-anabata ihe e nyere nʼiwu, ma onye nzuzu ekwurekwu ga-ala nʼiyi. 9Onye ụzọ ya ziri ezi na-aga ije nʼatụghị egwu, ma onye ụzọ ya ezighị ezi ka a ga-achọpụta. 10Onye ọbụla na-egbu ikuanya na-ebute ihe mwute, onye nzuzu ekwurekwu ga-abịa nʼịla nʼiyi. 11Ọnụ onye ezi omume bụ isi iyi nke ndụ, ma naanị nkọcha jupụtara nʼọnụ onye ajọ omume. 12Ịkpọ asị na-akpali esemokwu, ma ịhụnanya na-ekpuchi mmehie niile. 13Ndị nwere nghọta na-ekwu okwu nwere isi, ma ndị na-enweghị uche ka a na-eti ihe dịka ohu. 14Onye amamihe na-akpakọba ihe ọmụma, ma onye nzuzu na-eji ọnụ ya akpọ ịla nʼiyi oku. 15Akụ ndị ọgaranya bụrụ ha obodo e wusiri ike, ma ụbịam bụ ịla nʼiyi nke ndị ogbenye. 16Ụgwọ ọrụ onye ezi omume bụ ndụ, ma ihe nweta nke onye ajọ omume bụ mmehie na ọnwụ. 17Onye na-ege ntị na ndụmọdụ na-egosi ụzọ nke ndụ, ma onye na-adịghị anabata ndụmọdụ na-eme ka ndị ọzọ kpafuo. 18Onye ji egbugbere ọnụ ụgha ekpuchi ịkpọ asị na onye na-agbasa okwu nkwutọ bụ onye nzuzu. 19Nʼọtụtụ okwu mmehie adịghị akwụsị ma ndị nwere uche na-ejide ire ha. 20Ire nke onye ezi omume bụ ọlaọcha kachasị mma, ma obi onye ajọ omume bụ ihe ọnụahịa nta. 21Egbugbere ọnụ onye ezi omume na-azụju ọtụtụ mmadụ afọ, ma ndị nzuzu na-anwụ nʼihi amamihe nke kọrọ ha. 22Ngọzị Onyenwe anyị na-eme mmadụ ọgaranya, ọ naghị atụkwasị ya nsogbu.
Ụbọchị ndị a na-eso kalenda Julian nke Nzukọ Rọshịa (dịka Nzukọ Sabia na Jọjia na Ugwu Athos): 19 Maachị na kalenda nzukọ bụ 1 Epreel na kalenda obodo. Nzukọ ndị na-eji kalenda ọhụrụ (Gris, Romania, Bulgaria, Ukraine…) na-eme mmemme ndị na-adịghị agbanwe agbanwe na ndị nsọ n’ụbọchị obodo ahụ n’onwe ya, ụbọchị 13 tupu mgbe ahụ, ụfọdụ ihe ọgụgụ ha dịkwa iche; Ista na ụbọchị ndị dabere na ya bụ otu.
Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike