Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Epreel 2027 › 1 Epreel

Kalenda Katọlik

Ihe ọgụgụ Mass (Katọlik) — 1 Epreel 2027

Tọọzdee · Ụbọchị asatọ nke Ista

Mmemme na ndị nsọ

Tọọzdee nʼime ụbọchị asatọ nke Ista

Mmemme ukwu · Agba ofufe: ọcha

Ihe ọgụgụ nke ụbọchị

Ihe ọgụgụ mbụ

Ọrụ 3:11–26

11Ma dị ka o jidere Pita na Jọn aka, ndị mmadụ niile jiri mgbagwoju anya gbara ọsọ bịakwute ha nʼakụkụ ụlọnsọ ahụ ebe a na-akpọ mgbe ụlọ Solomọn. 12Mgbe Pita hụrụ nke a, ọ gwara igwe mmadụ ahụ, “Ndị Izrel, gịnị mere ihe a ji eju unu anya? Gịnị mere unu ji ele anyị anya dịka a ga-asị na ọ bụ site nʼike nke anyị maọbụ nʼịdị nsọ anyị ka anyị jiri mee ka nwoke a gawa ije? 13Chineke nke Ebraham, nke Aịzik na nke Jekọb, Chineke nke nna anyị ha, ebuliela onye na-ejere ya ozi, bụ Jisọs elu, onye unu nyefere ka e gbuo, ma gọnarịkwa ya nʼihu Pailet, nʼagbanyeghị na o kpebiri ịhapụ ya ka ọ laa. 14Unu gọnarịrị onye ahụ dị nsọ bụrụkwa onye ezi omume, ma rịọ ka a hapụrụ unu ogbu mmadụ. 15Unu gburu onye ahụ na-enye ndụ, ma Chineke akpọlitela ya site nʼọnwụ. Anyị bụ ndị akaebe ihe ndị a. 16Ọ bụ site nʼokwukwe nʼaha ya, ọ bụ aha ya naanị mere nwoke a ka ọ dị ike onye nke unu na-ahụ ma marakwa. Okwukwe nʼime Jisọs mere ka ahụ ya zuo oke nʼihu unu niile. 17“Ugbu a ụmụnna m, amaara m na unu kpara agwa na-amaghị ama, dịka ndị ndu unu sikwara kpaa. 18Ma Chineke siri otu a mezuo ihe o kwuru site nʼọnụ ndị amụma niile na Kraịst ya aghaghị ịhụ ahụhụ. 19Ya mere, chegharịanụ ugbu a ma lọghachikwutekwanụ Chineke, ka e nwee ike ihichapụ mmehie unu, 20ka enyekwa unu ntute nke ime mmụọ nke sitere nʼihu Onyenwe anyị, ma zitekwara unu Kraịst ahụ, bụ onye ahọpụtara nye unu, nke bụ Jisọs. 21Onye eluigwe na-aghaghị ịnabata tutu ruo oge ahụ Chineke ga-eweghachi ihe niile nʼọnọdụ ha, dịka o kwere na nkwa nʼogologo oge gara aga site nʼọnụ ndị amụma ya dị nsọ. 22Mosis sịrị, ‘Onyenwe anyị bụ Chineke ga-eme ka onye amụma ga-adị ka m biliere unu site nʼetiti ụmụ nne unu, unu aghaghị ige ntị nʼihe niile ọ ga-agwa unu. 23Onye ọbụla jụrụ ige onye amụma ahụ ntị, ka a ga-ekewapụ kpamkpam site nʼetiti ndị ya ma bibiekwa ya.’ 24“Nʼezie ndị amụma niile site na Samuel na ndị ọzọ so ya nʼazụ, bukwara amụma banyere ụbọchị ndị a. 25Ma unu bụ ndị nketa nke ndị amụma, nakwa nke ọgbụgba ndụ ahụ Chineke na nna nna unu gbara, mgbe ọ gwara Ebraham, ‘Site na mkpụrụ gị ka a ga-agọzi mba niile nke ụwa.’ 26Mgbe Chineke kpọlitere onyeozi ya, o buuru ụzọ zitere unu ya, ka ọ gọzie unu site nʼime ka onye ọbụla nʼime unu chegharịa site nʼụzọ ọjọọ ya.”

Abụ Ọma nzaghachi

Abụ 8:1, 4–8

1Abụ Ọma dịrị onyeisi abụ. Abụ Ọma Devid nʼusoro gittit. O Onyenwe anyị Onyenwe anyị, lee ka ịdị ukwuu nke aha gị si jupụta ụwa niile! I meela ka ebube gị dị elu nʼime eluigwe. 4gịnị ka mmadụ bụ i ji na-eche banyere ha? Gịnịkwa ka mmadụ bụ iji na-elekọta ha? 5I mere ka ha dị ala nwantakịrị nʼebe ndị mmụọ ozi nọ, I jikwa ebube na nsọpụrụ kpube ya nʼisi dịka okpueze. 6I mekwaala ya ka ọ bụrụ onyeisi nke ihe niile i kere eke, tinyekwa ihe niile nʼokpuru ụkwụ ya. 7Ọ na-achị igwe ewu na atụrụ, na ehi, na ụmụ anụ ọhịa ndị ọzọ niile, 8na nnụnụ niile, na azụ niile, na anụ ndị ọzọ na-ebi nʼime mmiri.

Oziọma

Luk 24:35–48

35Mgbe ahụ, ha kọọrọ ha ihe mere nʼụzọ, ya na otu ha siri mata ya mgbe ọ nyawara achịcha. 36Mgbe ha ka na-ekwu banyere nke a, ya onwe ya guzooro nʼetiti ha sị ha, “Udo dịrị unu.” 37Oke egwu tụrụ ha, obi lọkwara ha mmiri nʼihi na ha chere na ha ahụla mmụọ. 38Ma ọ sịrị ha, “Gịnị mere ụjọ ji atụ unu, gịnị mere unu ji nwee obi abụọ? 39Leenụ m anya nʼaka na nʼụkwụ. Ọ bụ mụ onwe m! Metụnụ m aka ka unu hụrụ, nʼihi na mmụọ adịghị enwe anụ ahụ na ọkpụkpụ dị ka unu hụrụ m nwere.” 40Mgbe o kwuchara nke a, o gosiri ha aka ya na ụkwụ ya. 41Ma dị ka o siiri ha ike ikwere nʼihi ọṅụ na oke mgbagwoju anya, ọ sịrị ha, “Ọ dị ihe oriri unu nwere ebe a?” 42Ha nyere ya otu ntakịrị azụ a mịkpọrọ amịkpọ. 43Ma ọ naara ya rie ya nʼihu ha. 44Mgbe ahụ, ọ sịrị ha, “Okwu ndị a ka m gwara unu mgbe mụ na unu nọ, na ihe niile e dere nʼiwu Mosis na ndị Amụma na nʼAbụ Ọma banyere m ga-emezucha.” 45Mgbe ahụ, o meghere akọnuche ha ka ha ghọta akwụkwọ nsọ. 46Ọ sịrị ha, “Nke a bụ ihe e dere na, Kraịst ahụ ga-ahụ ahụhụ ma sitekwa nʼọnwụ bilie nʼụbọchị nke atọ. 47Na a ga-ekwusa nchegharị na mgbaghara mmehie site nʼaha ya nye mba niile, malite na Jerusalem. 48Unu bụ ndị akaebe nke ihe ndị a.

Kalenda Rom n’ozuzu; ọgbakọ ndị bishọp nwere ike ibuga ụfọdụ mmemme (Epifani, Mgbago n’Eluigwe, Ahụ na Ọbara Kraịst) n’ụbọchị Sọnde ma ọ bụ tinye nke ha. Akwụkwọ ọgụgụ: usoro Sọnde B, afọ ụbọchị izu I.

Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike