Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Maachị 2027 › 31 Maachị

Kalenda Ọtọdọks · 18 Maachị (Kalenda ochie)

Ihe ọgụgụ Ọtọdọks nke ụbọchị — 31 Maachị 2027

Wenezdee · Izu nke 3 nke Lent Ukwu · Olu 2

Mmemme na ndị nsọ

Holy Hierarch Cyrill, Archbishop of Jerusalem († 386)

Oge Lent Ukwu

Obubu ọnụ siri ike (nri akọrọ: achịcha, akwụkwọ nri, mkpụrụ osisi)

Nke a na-eso iwu ndị mọnk. Nʼparish, a na-ekpebi ọtụtụ obubu ọnụ ya na onye na-anụ nkwupụta mmadụ, dịka ahụike, afọ na ọnọdụ si dị.

Ihe ọgụgụ nke ụbọchị

Elekere nke 6

Aịz 10:12–20

12Mgbe Onyenwe anyị rụsịrị ọrụ ya niile megide ugwu Zayọn na Jerusalem, ọ ga-asị, “Aga m ata eze ndị Asịrịa ahụhụ nʼihi nganga nke obi ha, na ịnya isi nke anya mpako ya. 13Nʼihi na ọ na-asị, “ ‘Ọ bụ site nʼike aka m, ka m ji mee nke a, ọ bụkwa na amamihe m, nʼihi na m nwere nghọta. Ewezugara m oke ala mba niile dị iche iche, apụnara m ha akụ ha niile; dịka onye dị ike, e wedara m ndị eze ha niile nʼokpuru m. 14Dịka mmadụ si agbatị aka nʼime akwụ nnụnụ, otu a ka m chịkọtara akụnụba mba dị iche iche, dịka mmadụ si achịkọta akwa ahapụrụ ahapụ, otu a ka m chịkọtara mba ụwa niile; Ọ dịghị onye megharịrị otu nku, maọbụ saghee ọnụ ya ime mkpọtụ!’ ” 15Anyụike ọ ga-anya isi sị na ya dị ukwuu karịa onye na-eji ya awa nkụ, ka ọ bụ mma nkwọ, ọ ga-aja onwe ya karịa onye na-eji ya akpọwa ihe? Dịka a ga-asị na okporo igwe ga-ebuli onye na-eweli ya elu, maọbụ mkpọ ọ ga-efegharị onye na-abụghị osisi. 16Nʼihi ya, Onyenwe anyị, bụ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, ga-ezitere ndị agha gị mara abụba ihe otiti; ọ ga-akwanye ọkụ nʼokpuru ihe ngosipụta nke ịdị ebube ya dịka ire ọkụ nke na-ere ere. 17Ìhè nke Izrel, ga-aghọ ọkụ, Onye nsọ ha, ga-aghọkwa ire ọkụ nke ga-ala ihe niile nʼiyi. Nʼotu abalị ka ọ ga-erechapụ ogwu niile na uke niile ọkụ. 18A ga-ala ịma mma nke oke ọhịa ya na ala ya na-amị ezi mkpụrụ nʼiyi kpamkpam, dịka mgbe ọrịa na-ala mmadụ nʼiyi. 19Naanị osisi ole na ole ga-afọdụ, ha ga-adị ntakịrị ruo na nwantakịrị nwere ike gụọ ha ọnụ. 20Nʼụbọchị ahụ, ndị fọdụrụ nʼala Izrel, na ndị fọdụrụ ndụ nʼụlọ Jekọb, agaghịkwa adabere nʼonye ahụ tidara ha, kama ha ga-adabere naanị na Onyenwe anyị, Onye nsọ nke Izrel.

Ofufe mgbede: ihe ọgụgụ

Jen 7:6–9

6Noa gbara narị afọ isii mgbe mmiri ukwu a bidoro izo nʼelu ụwa. 7Noa banyere nʼụgbọ mmiri ahụ, ya na ụmụ ya ndị ikom na nwunye ya, na ndị nwunye ụmụ ya ndị ikom ịgbanarị uju mmiri ahụ. 8Ụmụ anụmanụ ndị dị ọcha, na ndị na-adịghị ọcha, abụọ abụọ, tinyere anụ ufe na ihe niile e kere eke na-akpụgharị nʼala, abụọ abụọ kwa, 9oke na nwunye, bịakwutere Noa soro ya banye nʼụgbọ mmiri ahụ, dịka Chineke nyere Noa nʼiwu.

Ofufe mgbede: ihe ọgụgụ

Ilu 9:12–18

12Ị bụrụ onye nwere amamihe, amamihe gị ga-abara gị uru, ma ị bụrụ onye na-akwa emo, naanị gị ga-ata ahụhụ ya. 13Nwanyị dị nzuzu na-eme mkpọtụ, o nweghị uche; ihere adịghịkwa eme ya. 14Ọ na-anọ ọdụ nʼọnụ ụzọ ụlọ ya, nʼelu oche nʼebe dịkarịsịrị elu nʼobodo, 15na-akpọ ndị na-aga nʼụzọ oku, bụ ndị na-aga mkpa ha, 16“Ka ndị niile amamihe kọrọ bịa nʼụlọ m.” Ọ na-asịkwa ndị na-enweghị uche, 17“Mmiri e zutere nʼohi na-atọ ụtọ, nri e riri na nzuzo na-atọkarịkwa nʼụtọ.” 18Ma ha adịghị aghọta na ndị nʼadịghị ndụ nọ nʼebe ahụ, na ndị ọ kpọrọ oku nri aghọọlarị ndị nọ nʼala mmụọ.

Ụbọchị ndị a na-eso kalenda Julian nke Nzukọ Rọshịa (dịka Nzukọ Sabia na Jọjia na Ugwu Athos): 18 Maachị na kalenda nzukọ bụ 31 Maachị na kalenda obodo. Nzukọ ndị na-eji kalenda ọhụrụ (Gris, Romania, Bulgaria, Ukraine…) na-eme mmemme ndị na-adịghị agbanwe agbanwe na ndị nsọ n’ụbọchị obodo ahụ n’onwe ya, ụbọchị 13 tupu mgbe ahụ, ụfọdụ ihe ọgụgụ ha dịkwa iche; Ista na ụbọchị ndị dabere na ya bụ otu.

Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike