Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Maachị 2027 › 24 Maachị

Kalenda Katọlik

Ihe ọgụgụ Mass (Katọlik) — 24 Maachị 2027

Wenezdee · Izu Nsọ

Mmemme na ndị nsọ

Wenezdee nke Izu Nsọ

Ụbọchị izu · Agba ofufe: odo odo

Ihe ọgụgụ nke ụbọchị

Ihe ọgụgụ mbụ

Aịz 50:4–9

4Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị enyela m amamihe ya ka m nwee ike ịmata ihe m ga-agwa ndị a ike gwụrụ. Ụtụtụ niile ka ọ na-akpọte mmụọ m, meghee akpa uche m, ime ka m ghọta uche ya. 5Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị emeghela ntị m abụọ, ma enupughị m isi, a tụgharịkwaghị m azụ. 6Azụ m ka m megheere ndị tiri m ihe; agba nti m abụọ ka m hapụụrụ ndị hopusiri m afụọnụ m. Ezopụghị m ihu m nʼebe ndị na-akwa emo, na ndị na-agbụ ọnụ mmiri nọ. 7Ebe ọ bụ na Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị na-enyere m aka, ihere agaghị eme m. Nʼihi ya, ejikerela m onwe m ime uche ya; agaghị m elekwa anya nʼazụ, a maara m na ihere agaghị eme m. 8Nʼihi na onye na-agụ m nʼonye ezi omume nọ nso. Onye ga-apụta ibo m ebubo? Ya pụta ka anyị guzo ihu na ihu! Onye nwere ebubo megide m? Ya bịa ka anyị kwuo ya. 9Lee, Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị bụ onye na-enyere m aka. Onye pụrụ ịma m ikpe? Lee, ha niile ga-aka nka dịrị ka uwe, nla ga-erichapụkwa ha.

Abụ Ọma nzaghachi

Abụ 69:7–9, 20–21, 30, 32–33

7Ọ bụ nʼihi gị ka m na-anagide ịkwa emo, ihere ekpuchiela m ihu. 8Abụ m ọbịa nʼebe ụmụnna m nọ, nʼebe ụmụnne nọ, abụ m onye mba ọzọ. 9Nʼihi na ihe gbasara ụlọ gị na-anụ m ọkụ nʼobi, ịta ụta niile nke ndị na-akparị gị adakwasịla m. 20Ọchị ha na-achị m etiwaala m obi, ma hapụ m nʼọnọdụ enweghị inyeaka. Elere m anya onye ga-emere m ebere, ma ọ dịghị onye ọbụla m hụrụ; lee anya ndị ga-akasị m obi, ma ọ dịkwaghị onye m chọtara. 21Ha tinyere oluilu nʼime nri m, nyekwa m mmanya gbara ụka ka m ṅụọ. 30Aga m eji ịbụ abụ too aha Chineke, jirikwa ekele bulie ya elu. 32Ndị ogbenye ga-ahụ ya ma ṅụrịakwa ọṅụ; unu ndị na-achọ Chineke, ka obi unu na-adị ndụ. 33Onyenwe anyị na-anụ ekpere ndị nọ na mkpa, ọ naghị eledakwa ndị ya a dọtara nʼagha anya.

Oziọma

Mat 26:14–25

14Mgbe ahụ otu nʼime mmadụ iri na abụọ na-eso ụzọ ya, onye aha ya bụ Judas Iskarịọt, jekwuuru ndịisi nchụaja. 15Ọ jụrụ ha sị, “Gịnị ka unu ga-enye m ma m rara ya nye nʼaka unu?” Ha kwụrụ ya iri mkpụrụ ọlaọcha atọ. 16Site nʼoge ahụ na-aga, ọ chọrọ ohere ịrara ya nye nʼaka ha. 17Nʼụbọchị mbụ nke mmemme achịcha na-ekoghị eko, ndị na-eso ụzọ Jisọs bịakwutere ya jụọ ya sị, “Ebee ka ị chọrọ ka anyị gaa kwadoro gị ihe gị maka oriri Ngabiga?” 18Ọ zara ha sị, “Jekwurunụ otu nwoke nʼime obodo sị ya, Onye ozizi sị, ‘Oge m abịala nso. Mụ na ndị na-eso ụzọ m ga-eri oriri Ngabiga nʼụlọ gị.’ ” 19Ndị na-eso ụzọ ya mere dị ka Jisọs gwara ha, doziekwa oriri Ngabiga ahụ nʼebe ahụ. 20Nʼuhuruchi ụbọchị ahụ, ya na ndị na-eso ụzọ ya iri na abụọ ahụ nọdụrụ ala nʼoche nri ahụ. 21Mgbe ha na-eri nri, o kwuru sị, “Nʼezie ana m agwa unu, na otu onye nʼime unu ga-arara m nye.” 22Ha nwere oke mwute, ma malite ịjụ ya nʼotu nʼotu sị, “Onyenwe anyị, ọ bụ m?” 23Ma ọ zara ha sị, “Ọ bụ onye ahụ mụ na ya na-amanyekọta aka nʼotu efere ga-arara m nye. 24Lee Nwa nke Mmadụ ga-ala dị ka e si buo ya nʼamụma. Ma ahụhụ ga-adịrị nwoke ahụ onye a ga-esite nʼaka ya rara Nwa nke Mmadụ nye. Ọ gaara akara onye ahụ mma ma a sị na a mụghị ya amụ.” 25Judas, onye ahụ raara ya nye jụrụ ya sị, “Onye ozizi ọ bụ m?” Ọ zara sị, “Gị onwe gị ekwuola ya.”

Kalenda Rom n’ozuzu; ọgbakọ ndị bishọp nwere ike ibuga ụfọdụ mmemme (Epifani, Mgbago n’Eluigwe, Ahụ na Ọbara Kraịst) n’ụbọchị Sọnde ma ọ bụ tinye nke ha. Akwụkwọ ọgụgụ: usoro Sọnde B, afọ ụbọchị izu I.

Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike