Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Maachị 2027 › 23 Maachị
Kalenda Katọlik
Ihe ọgụgụ Mass (Katọlik) — 23 Maachị 2027
Tiuzdee · Izu Nsọ
Mmemme na ndị nsọ
Tiuzdee nke Izu Nsọ
Ụbọchị izu · Agba ofufe: odo odo
Ihe ọgụgụ nke ụbọchị
Ihe ọgụgụ mbụ
1Geenụ m ntị, unu niile ndị bi nʼala mmiri gbara gburugburu, nụrụkwanụ nke a, unu ndị nọ na mba dị anya. Onyenwe anyị kpọrọ m tupu amụọ m. Ọ kpọrọ m aha m mgbe m ka nọ nʼime afọ nne m. 2O mere ka okwu sị m nʼọnụ dịrị nkọ dịka mma agha. O zobere m nʼaka ya kpuchie m. O mere m ka m dịrị ka àkụ dị nkọ nke o zoro nʼime akpa àkụ ya. 3Ọ sịrị m, “Ị bụ ohu m, Izrel. Ọ bụkwa site na gị ka m ga-eji gosi ịma mma na ike m.” 4Ma mụ onwe m sịrị, “Ọ bụ nʼefu ka m dọgburu onwe m nʼọrụ. Etufuola m ike m niile nʼihi ihe na-abụghị ihe. Ma ihe ruru m dị nʼaka Onyenwe anyị, ụgwọ ọrụ m dịkwa nʼaka Chineke m.” 5Ma ugbu a Onyenwe anyị na-asị, Onye ahụ kpụrụ m nʼafọ nne m ka m bụrụ onye na-ejere ya ozi; ka ọ kpọghachite Jekọb nye ya ka achịkọtakwa ndị Izrel nyekwa ya onwe ya, nʼihi na-abụ m onye nsọpụrụ dịrị nʼanya Onyenwe anyị, Chineke m aghọkwaarala m ike m. 6Ọ sịrị, “Ọ bụ ihe dị nta karịa, gị ị bụrụ m ohu, ịkpọghachita ebo niile nke Jekọb na ịkpọghachita ndị Izrel ndị m chebere. Aga m emekwa ka ị bụrụ ìhè nye ndị mba ọzọ, ka nzọpụta m site nʼaka gị ruo ndị bi na nsọtụ ụwa niile.”
Abụ Ọma nzaghachi
1Onyenwe anyị, nʼime gị ka m gbabara izere ndụ; ekwela ka ihere mee m. 2Site nʼezi omume gị, gbapụta m, mee ka m nwere onwe m; tọọ ntị gị nʼala nụrụ olu m ma zọpụta m. 3Ghọọrọ m oke nkume nke ebe mgbaba, ebe m nwere ike ịgbaba mgbe ọbụla; nye iwu maka nzọpụta m, nʼihi na ị bụ oke nkume m na ebe m e wusiri ike. 4O Chineke m, site nʼaka ndị ajọ omume na ndị mmadụ na-eme ihe ọjọọ, ndị afọ tara mmiri, gbapụta m. 5Nʼihi na gị onwe gị bụrịị olileanya m, Onyenwe m Onyenwe anyị, ntụkwasị obi m site na mgbe m bụ nwantakịrị. 6Ọ bụ gị ka m tụkwasịrị obi, site nʼoge amụrụ m; gị onwe gị wepụtara m site nʼafọ nne m. Aga m anọgide na-eto gị. 15Ọnụ m ga-ekwu banyere ezi omume gị na nzọpụta gị ogologo ụbọchị niile, ọ bụ ezie na-amaghị m ọtụtụ ya. 17O Chineke, site na mgbe m bụ nwantakịrị, i kuzielera m ihe, ruo taa, ana m ekwupụta banyere ọrụ ebube gị niile.
Oziọma
21Mgbe Jisọs kwusiri ihe ndị a, o nweghị udo nʼime mmụọ ya. Ọ gbara ama sị, “Nʼezie, nʼezie, a sị m unu, na otu onye nʼime unu ga-arara m nye.” 22Ndị na-eso ụzọ ya lerịtara onwe ha anya na-eche nʼime obi ha onye ọ na-ekwu maka ya. 23Otu nʼime ndị na-eso ụzọ ya nke Jisọs hụrụ nʼanya dabere ya nso. 24Saimọn Pita fufeere ya isi, ka ọ, Jụọ ya onye ọ na-ekwu maka ya. 25Ebe ọ dabere Jisọs nso, ọ sịrị ya, “Onyenwe anyị, onye ka ọ bụ?” 26Jisọs zara, “Ọ bụ onye ahụ m ga-enye iberibe achịcha a mgbe m sunyere ya nʼime efere nri.” Mgbe o sunyesịrị achịcha ahụ nʼime efere ahụ, o nyere ya Judas nwa Saimọn Iskarịọt. 27Mgbe ọ narasịrị iberibe achịcha ahụ, ekwensu bara nʼime ya. Jisọs sịrị ya, “Ihe ọbụla ị chọrọ ime, mee ya ngwangwa.” 28Ma ọ dịghị onye ọbụla so nọrọ nʼoche nri ghọtara ihe mere o ji gwa ya otu a. 29Nʼihi na ụfọdụ na-eche, ebe Judas ji akpa ego ha, Jisọs na-asị ya ka ọ gaa zụta ihe ndị dị mkpa maka mmemme, maọbụ ka ọ gaa nye ndị ogbenye ihe. 30Mgbe ọ natachara iberibe achịcha ahụ, ọ pụrụ na-atụfughị oge, ọchịchịrị agbaala. 31Mgbe ọ pụrụ, Jisọs sịrị, “Ugbu a ka a na-enye Nwa nke Mmadụ otuto, a na-enyekwa Chineke otuto nʼime ya. 32Ọ bụrụ na e nye Chineke otuto nʼime ya, Chineke ga-enyekwa Ọkpara ya otuto nʼime onwe ya, ọ ga-enyekwa ya otuto ahụ ngwangwa. 33“Ụmụntakịrị m, enwere m oge ntakịrị nke mụ na unu ga-anọ. Unu ga-achọ m, ma dị ka m gwara ndị Juu ka m na-agwa unu ugbu a. Ebe m na-aga unu enweghị ike ịbịa ya. 36Saimọn Pita sịrị ya, “Onyenwe anyị ebee ka ị na-aga?” Jisọs zaghachiri ya, “Ebe m na-aga, i nweghị ike iso m gaa ya ugbu a. Ma ị ga-abịa ma emesịa.” 37Pita sịrị ya, “Onyenwe anyị, gịnị mere na m apụghị isoro gị ugbu a? Aga m atọgbọ ndụ m nʼihi gị.” 38Jisọs zaghachiri, “I jikeere ịtọgbọ ndụ gị nʼihi m? Nʼezie, nʼezie, asị m gị, tupu oke ọkụkụ akwaa akwa, ị ga-agọnarị m ugboro atọ.”
Ndị nsọ nke ụbọchị
- Onye nsọ Turibiọs nke Mogrovejo, Bishọp
Kalenda Rom n’ozuzu; ọgbakọ ndị bishọp nwere ike ibuga ụfọdụ mmemme (Epifani, Mgbago n’Eluigwe, Ahụ na Ọbara Kraịst) n’ụbọchị Sọnde ma ọ bụ tinye nke ha. Akwụkwọ ọgụgụ: usoro Sọnde B, afọ ụbọchị izu I.
Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike