Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Maachị 2027 › 19 Maachị
Kalenda Katọlik
Ihe ọgụgụ Mass (Katọlik) — 19 Maachị 2027
Fraịdee · Izu nke 5 nke Lent
Mmemme na ndị nsọ
Onye nsọ Josef, Di nke Nwaagbọghọ Meri Agọziri Agọzi
Mmemme ukwu · Agba ofufe: ọcha
Ihe ọgụgụ nke ụbọchị
Ihe ọgụgụ mbụ
4Ma nʼabalị ahụ, okwu Onyenwe anyị rutere Netan ntị, na-asị, 5“Gaa gwa ohu m Devid sị ya, ‘Otu a ka Onyenwe anyị kwuru, Ọ bụ gị ga-ewuru m ụlọ ebe m ga-ebi? 12Mgbe ụbọchị gị nʼụwa zuru, mgbe i ga-esoro nna nna gị ha dinaa nʼọnwụ, aga m eme ka otu mkpụrụ gị bilie nọchie ọnọdụ gị, onye bụ anụ ahụ na ọbara gị, aga m emekwa ka alaeze ya guzosie ike. 13Ọ bụ ya ga-ewuru m ụlọ. Aga m eme ka ocheeze nke alaeze ya guzosie ike ruo mgbe ebighị ebi. 14Mụ onwe m ga-abụrụ ya nna. Ya onwe ya ga-abụkwara m nwa. Ọ bụrụ na o jehie, aga m eji mkpanaka mmadụ taa ya ahụhụ. Werekwa ihe otiti si nʼaka ndị mmadụ dụọ ya ọdụ. 16Ụlọ gị na alaeze gị ga-adịgide ruo mgbe ebighị ebi nʼihu m. A ga-eme ka ocheeze gị bụrụ ihe guzosiri ike ruo mgbe ebighị ebi.’ ”
Abụ Ọma nzaghachi
1Abụ maskil nke Etan, onye Ezra. Aga m abụ abụ banyere oke ịhụnanya Onyenwe anyị ruo mgbe ebighị ebi; aga m eji ọnụ m mee ka ọgbọ niile mara maka ikwesi ntụkwasị obi gị. 2Aga m ekwupụta na ịhụnanya gị na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi; na i mere ka ikwesi ntụkwasị obi gị, guzosie ike nʼeluigwe. 3Onyenwe anyị sịrị, “Mụ na onye m họpụtara agbaala ndụ. Aṅụọkwala m iyi nye ohu m Devid sị, 4‘Aga m eme ka agbụrụ gị guzosie ike ruo mgbe ebighị ebi meekwa ka ocheeze gị dịgide ruo ọgbọ niile.’ ” Sela 26Ọ ga-akpọ m sị m, ‘Ị bụ Nna m, bụrụkwa Chineke m, na oke Nkume nzọpụta m.’ 28Aga m eme ka ịhụnanya m nwere nʼebe ọ nọ dịgide ruo ebighị ebi, ọgbụgba ndụ mụ na ya ga-adịgidekwa.
Ihe ọgụgụ nke abụọ
13Nkwa o kwere Ebraham na agbụrụ ya na ha ga-eketa ụwa abụghị site nʼidebe iwu, kama ọ bụ site nʼezi omume nke okwukwe. 16Ya mere, nkwa ahụ na-abịa site nʼokwukwe, ka ọ bụrụ naanị site nʼamara ka e ji mee ka ụmụ ya niile nweta ya, ọ bụghị naanị nye ndị nọ nʼokpuru iwu, kama ọ bụkwa nye ndị nwere ụdị okwukwe Ebraham. Nʼihi na ọ bụ nna anyị niile. 17Dịka e dere ya, “Emeela m gị nna nke ọtụtụ mba.” Ya mere, nʼihu Chineke ahụ bụ onye o kweenyere nʼime ya, bụ onye ahụ na-eme ka ndị nwụrụ anwụ dịkwa ndụ ọzọ, onye na-akpọkwa ihe ndị na-adịbụghị, mee ka ha dịrị. 18Ọ bụladị mgbe olileanya gasịrị, o kwenyere na ya ga-abụ nna nke ọtụtụ mba, dịka ihe a gwara ya si dị, “Otu a ka mkpụrụ gị ga-adị.” 22Ọ bụ nʼihi ya ka e ji gụọ nke a nye ya dị ka ezi omume.
Oziọma
ma ọ bụ: Luk 2:41–51
16Jekọb mụrụ Josef onye bụ di Meri nne Jisọs, onye a na-akpọ Kraịst. 18Otu a ka ọmụmụ Jisọs, onye a na-akpọ Kraịst siri dị: Nne ya Meri bụ onye e kwenyere na ọ ga-alụ Josef, ma tupu ha ebikọọ ọnụ a chọpụtara na Meri di ime site na Mmụọ Nsọ. 19Ma Josef di ya bụ onye ezi omume, ọ chọghị imenye ya ihere, nʼihi ya, o zubere ịchụ ya na nzuzo. 20Mgbe Josef nwechara mkpebi a, mmụọ ozi Onyenwe anyị bịakwutere ya na nrọ sị ya, “Josef nwa Devid, atụla egwu ịkpọrọ Meri ka ọ bụrụ nwunye gị, nʼihi na nwa ahụ ọ dị ime ya sitere nʼike Mmụọ Nsọ. 21Ọ ga-amụkwa nwa nwoke, onye ị ga-akpọ aha ya Jisọs, nʼihi na ọ ga-azọpụta ndị nke ya site na mmehie ha.” 24Mgbe Josef si nʼụra teta, o mere dịka mmụọ ozi Onyenwe anyị nyere ya nʼiwu. Ọ kpọọrọ Meri ka ọ bụrụ nwunye ya.
Ndị nsọ nke ụbọchị
- Onye nsọ Josef, Di nke Nwaagbọghọ Meri Agọziri Agọzi
Kalenda Rom n’ozuzu; ọgbakọ ndị bishọp nwere ike ibuga ụfọdụ mmemme (Epifani, Mgbago n’Eluigwe, Ahụ na Ọbara Kraịst) n’ụbọchị Sọnde ma ọ bụ tinye nke ha. Akwụkwọ ọgụgụ: usoro Sọnde B, afọ ụbọchị izu I.
Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike