Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Maachị 2027 › 20 Maachị
Kalenda Ọtọdọks · 7 Maachị (Kalenda ochie)
Ihe ọgụgụ Ọtọdọks nke ụbọchị — 20 Maachị 2027
Satọdee · Izu nke 1 nke Lent Ukwu · Olu 8
Mmemme na ndị nsọ
Hieromartyrs Basil, Ephraim, Eugene, Elpidius, Agathodorus, Aetherius, and Kapiton of Cherson (4th C)
Oge Lent Ukwu
Obubu ọnụ: ya na mmanụ
Nke a na-eso iwu ndị mọnk. Nʼparish, a na-ekpebi ọtụtụ obubu ọnụ ya na onye na-anụ nkwupụta mmadụ, dịka ahụike, afọ na ọnọdụ si dị.
Ihe ọgụgụ nke ụbọchị
Akwụkwọ ozi
1Na mgbe ochie, Chineke gwara nna nna anyị ha okwu nʼoge dị iche iche site nʼọnụ ndị amụma, na site nʼụzọ ndị ọzọ dị iche iche. 2Ma nʼoge ikpeazụ ndị a, ọ gwala anyị okwu site nʼọnụ Ọkpara ya, onye o nyefere ihe niile nʼaka. Ọ bụ site nʼaka ya ka o siri kee ụwa niile na ihe dị nʼime ya. 3Ọ na-enwupụta ebube ya na-anọchitekwa anya ụdịdị ya, ebe o ji okwu ya dị ike na-ejikọta ihe niile. Mgbe ọ sachapụrụ ma hichapụkwa mmehie niile, ọ nọdụrụ nʼaka nri nke Onye dị ukwuu, dị elu nʼeluigwe. 4Ya mere, ọ bụrụla onye dị ukwu karịa ndị mmụọ ozi dị ka aha e nyere ya si dị elu karịa nke ha. 5Onye nʼetiti ndị mmụọ ozi ka ọ gwarala sị, “Ị bụ Ọkpara m. Taa abụrụla m Nna gị”? Maọbụ ọzọkwa, “Aga m abụrụ ya Nna, ya onwe ya ga-abụkwara m Nwa”? 6Ọzọkwa, mgbe o mere ka nwa mbụ ya bịa nʼụwa, o nyere iwu sị, “Ka ndị mmụọ ozi Chineke niile fee ya ofufe.” 7O kwukwara banyere ndị mmụọ ozi ya, ọ sịrị, “Ọ na-eme ndị mmụọ ozi ya ka ha bụrụ ikuku, na-emekwa ndị na-ejere ya ozi ka ha bụrụ ire ọkụ.” 8Ma banyere Ọkpara ahụ, ọ sịrị, “Ocheeze gị, O Chineke, ga-adịgide ruo mgbe ebighị ebi. Mkpara omume ziri ezi ka mkpara alaeze gị ga-abụ. 9Ị hụrụ ezi omume nʼanya ma kpọọ ihe ọjọọ asị. Nʼihi nke a, Chineke, nke bụ Chineke gị, emeela ka ịdị elu karịa ndị ibe gị niile site na ite gị mmanụ nke ọṅụ.” 10Ọ sịkwara, “Na mmalite, Onyenwe anyị, ọ bụ gị tọrọ ntọala ụwa, eluigwe bụkwa ọrụ aka gị. 11Ha ga-ala nʼiyi, ma gị onwe gị ga-anọgide. Ha niile ga-aka nka dịka uwe. 12Ị ga-apịakọta ha, gbanwee ha dị ka akwa. Ma gị onwe gị enweghị mgbanwe. Ọnụọgụgụ afọ gị agaghị enwe ọgwụgwụ ruo mgbe ebighị ebi.”
Akwụkwọ ozi (maka Onye nsọ Teodọ)
1Ya mere, nwa m, bụrụ onye dị ike site nʼamara ahụ Kraịst Jisọs na-enye. 2Ihe niile nke ị nụrụ nʼọnụ m nʼihu ọtụtụ ndị ama ka ị ga-enyefe nʼaka ndị kwesiri ntụkwasị obi, bụ ndị nwekwara ike izi ndị ọzọ ihe ndị a. 3Soro m kere oke nʼahụhụ dị ka ezi onye agha Jisọs Kraịst. 4Ọ dịghị onye agha ọbụla na-ekekọta onwe ya nʼihe nke ụwa a, kama ọ na-achọ ime ihe ga-atọ onye họpụtara ya dị ka onye agha ụtọ. 5Otu aka ahụ, onye na-agba ọsọ agaghị enweta okpu mmeri, ma ọ bụrụ na ọ gbaghị ọsọ ya dịka usoro iwu ịgba ọsọ si dị. 6Onye ọrụ ubi na-adọgbu onwe ya nʼọrụ kwesiri ịbụ onye ga-ebu ụzọ rie mkpụrụ sitere nʼubi ya. 7Na-atụgharị uche nʼihe m kwuru, nʼihi na Onyenwe anyị ga-enye gị nghọta nʼime ha niile. 8Echefula Jisọs Kraịst, onye a kpọlitere site nʼọnwụ, onye sikwa nʼagbụrụ Devid, nke a bụ oziọma m. 9Ọ bụ nʼihi na m na-ekwu eziokwu ndị a ka m ji nọọ na-ahụ ahụhụ dị otu a dị ka onye ọjọọ, ma otu ọ dị, ekeghị okwu Chineke agbụ. 10Ya mere, ana m anagide ihe niile nʼihi ndị a họpụtara, ka ha bụrụkwa ndị ga-anata nzọpụta dị nʼime Kraịst Jisọs, na ebube ebighị ebi.
Oziọma
23Otu ụbọchị izuike, ya na ndị na-eso ụzọ ya na-agafe nʼubi a kụrụ ọka. Dị ka ha na-agafe, ndị na-eso ụzọ ya malitere ịghọ ụfọdụ ogbe ọka nʼime ọka ndị ahụ. 24Ndị Farisii siri ya, “Lee, gịnị mere ha ji na-eme ihe megidere iwu nʼụbọchị izuike.” 25Ma ọ sịrị ha, “Unu agụtaghị ihe Devid na ndị so ya mere mgbe agụụ gụrụ ha? 26Nʼoge Abịata bụ onyeisi nchụaja, ọ banyere nʼụlọ Chineke taa achịcha e chere nʼihu ya, nke ziri ezi na ọ bụ naanị ndị nchụaja kwesiri ịta ya. O nyetụkwara ndị ya na ha so.” 27Mgbe ahụ, ọ gwakwara ha sị, “E mere ụbọchị izuike maka mmadụ, emeghị mmadụ maka ụbọchị izuike.” 28Ya mere, Nwa nke Mmadụ bụ Onyenwe ọ bụladị ụbọchị izuike. 3:1Nʼoge ọzọ, ọ banyere nʼụlọ ekpere, otu nwoke aka ya kpọnwụrụ akpọnwụ nọkwa nʼebe ahụ. 2Ụfọdụ ha nọ na-achọ ụzọ ha ga-esi boo ya ebubo, ya mere ha lekwasịrị ya anya ịhụ ma ọ ga-agwọ ya ọrịa nʼụbọchị izuike. 3Ma ọ gwara nwoke ahụ aka ya kpọnwụrụ akpọnwụ sị, “Bilie guzoro nʼetiti ebe a.” 4Mgbe ahụ ọ jụrụ ha sị, “Olee nke ziri ezi nʼiwu ime nʼụbọchị izuike: ọ bụ ime ezi ihe ka ọ bụ ime ihe ọjọọ, ịzọpụta ndụ ka ọ bụ ịla ndụ nʼiyi?” Ma ha gbachiri nkịtị. 5O lere ha anya nʼiwe, o wutere ya nʼihi na obi ha kpọrọ nkụ. Ọ sịrị nwoke ahụ, “Setịpụ aka gị.” O setịpụrụ aka ya, aka ya dizikwara nke ọma.
Oziọma (maka Onye nsọ Teodọ)
17Ihe ndị a ka m na-enye unu nʼiwu, hụrịtanụ onwe unu nʼanya. 18“Ọ bụrụ na ụwa akpọọ unu asị, chetanụ na o buru ụzọ kpọọ m asị. 19A sị na unu bụ nke ụwa, ụwa ga-ahụ unu nʼanya dịka ndị nke ya. Ma otu ọ dị unu abụghị nke ụwa. Kama, esi m nʼime ụwa họrọ unu. Ọ bụkwa nʼihi ya ka ụwa ji akpọ unu asị. 20Chetakwanụ ihe m gwara unu, ‘Ohu adịghị adị ukwuu karịa Onyenwe ya.’ Ya mere, ebe ha kpagburu m, ha ga-akpagbukwa unu. Ọ bụrụ na ha debere okwu m, ha ga-edebekwa nke unu. 21Ee, ha ga-eme unu ihe niile ndị a nʼihi aha m, na nʼihi na ha amaghị onye ahụ zitere m. 22Ọ bụrụ na abịaghị m, gwa ha okwu, ikpe mmehie agaraghị ama ha. Ma ugbu a, ha enweghị ngọpụ ọbụla banyere mmehie ha. 23Onye ọbụla kpọrọ m asị kpọkwara Nna m asị. 24A sị na ọrụ niile m rụrụ nʼetiti ha akarịghị ọrụ nke onye ọbụla ọzọ rụrụ, ha agaraghị abụ ndị ikpe mmehie mara. Ma ugbu a ha ahụzuola ọrụ ebube ndị a niile, ma ha nọgidekwara na-akpọ mụ na Nna m asị. 25Nke a bụ imezu ihe e dere nʼakwụkwọ iwu ha. ‘Ha kpọrọ m asị na-enweghị ihe m mere.’ 26“Mgbe Onye Ndụmọdụ ahụ ga-abịa, onye m ga-ezitere unu site nʼaka Nna, bụ Mmụọ eziokwu ahụ sitere na Nna pụta, ọ ga-agba ama banyere m. 27Ma unu onwe unu aghaghị ịgba ama, nʼihi na mụ na unu anọọla site na mmalite. 16:1“Ihe ndị a niile ka m gwara unu ka unu ghara ịda. 2Ha ga-esite nʼụlọ ekpere ha chụpụ unu. Nʼezie, oge na-abịa mgbe onye ọbụla ga-egbu unu ga-echekwa na ọ na-efe Chineke mgbe ha na-eme nke a.
Ụbọchị ndị a na-eso kalenda Julian nke Nzukọ Rọshịa (dịka Nzukọ Sabia na Jọjia na Ugwu Athos): 7 Maachị na kalenda nzukọ bụ 20 Maachị na kalenda obodo. Nzukọ ndị na-eji kalenda ọhụrụ (Gris, Romania, Bulgaria, Ukraine…) na-eme mmemme ndị na-adịghị agbanwe agbanwe na ndị nsọ n’ụbọchị obodo ahụ n’onwe ya, ụbọchị 13 tupu mgbe ahụ, ụfọdụ ihe ọgụgụ ha dịkwa iche; Ista na ụbọchị ndị dabere na ya bụ otu.
Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike