Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Maachị 2027 › 19 Maachị

Kalenda Ọtọdọks · 6 Maachị (Kalenda ochie)

Ihe ọgụgụ Ọtọdọks nke ụbọchị — 19 Maachị 2027

Fraịdee · Izu nke 1 nke Lent Ukwu · Olu 8

Mmemme na ndị nsọ

42 Martyrs of Ammoria in Phrygia († c. 845): Theodore, Constantine, Aetius, Theophilus, Basoes, Callistus, and others

Oge Lent Ukwu

Obubu ọnụ siri ike (nri akọrọ: achịcha, akwụkwọ nri, mkpụrụ osisi)

Nke a na-eso iwu ndị mọnk. Nʼparish, a na-ekpebi ọtụtụ obubu ọnụ ya na onye na-anụ nkwupụta mmadụ, dịka ahụike, afọ na ọnọdụ si dị.

Ihe ọgụgụ nke ụbọchị

Elekere nke 6

Aịz 3:1–14

1Nʼihi na, lee, Onyenwe anyị, bụ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, na-akwado isite na Jerusalem na Juda wezuga ihe nnweta na ihe nkwado niile, ya na ihe oriri niile na mmiri ọṅụṅụ niile. 2Ọ ga-ewezugakwa ndị bụ dike nʼetiti ha, na onye agha, na onye ikpe, na onye amụma, na onye na-ajụ ase, na ndị okenye ha, 3na onyeisi agha na-achị ndị agha iri ise, na onye a na-asọpụrụ, na onye ndụmọdụ, na onye ọka maara ọrụ, na onye nwere ezi mmụọ nghọta ịkọ mmadụ ibe ya ọgwụ. 4“Aga m eme ka ụmụ okorobịa ghọọ ndị ozi ha, meekwa ka ụmụ na-aṅụ ara bụrụ ndị ịchị isi dị nʼaka ha.” 5Ndị mmadụ ga-emegbu ibe ha, otu onye megide onye ọzọ, onye agbataobi megide onye agbataobi ibe ya. Ụmụ okorobịa ga-ebili megide ndị okenye, ndị a na-elelị ga-emegide ndị a na-asọpụrụ. 6Otu nwoke ga-ejide nwanne ya nwoke nʼụlọ nna ya sị ya, “I nwere akwa mgbochi, bụrụ onyendu anyị; lekọta mkpọmkpọ ebe a anya.” 7Ma ọ ga-azaghachi nʼụbọchị ahụ sị, “O nweghị ihe m pụrụ ime. Enweghị m nri maọbụ akwa mgbochi nʼụlọ m. Emela m onyendu ndị a.” 8Lee na Jerusalem na-asọ ngọngọ. Juda na-adakwa. Nʼihi na ndị bi nʼime ya ekwujọọla Onyenwe anyị. Ha na-elelịkwa, ma na-enupu isi nʼebube Onyenwe anyị. 9Ihu ha na-egosi ihe ha bụ. Ọ na-ezipụta ajọ omume ha. Ha na-anya isi nʼime mmehie ha dịka Sọdọm. Ihere adịghịkwa eme ha. Ahụhụ ga-adịrị ha, nʼihi na ha ejirila aka ha kpatara onwe ha ahụhụ. 10Zie ndị ezi omume niile ozi sị ha, na ihe ga-agara ha nke ọma, nʼihi na mkpụrụ sitere nʼomume ha niile ka ha ga-eri. 11Ma gwa ndị na-emebi iwu na ahụhụ dịrị ha. Mbibi adakwasịla ha! Ha ga-eketa oke ruoru ha, nʼihi ihe aka ha kpataara ha. 12Ụmụ okorobịa na-emegbu ndị m, ụmụ nwanyị na-achịkwa ha. Ndị m, lee na ndị na-achị unu na-eduhie unu ụzọ. Ha na-eme ka unu kpafuo; ha esitela nʼezi ụzọ wezuga unu. 13Onyenwe anyị anyị ewerela ọnọdụ ya nʼụlọikpe; ọ na-eguzo ikpe ndị ya niile ikpe. 14Onyenwe anyị na-aba nʼikpe megide ndị okenye na ndị ndu nke ndị ya niile. Ọ bụ unu bụ ndị lara ubi vaịnị m nʼiyi; ihe unu ji aka ike pụnara ndị ogbenye jupụtara nʼụlọ unu.

Ofufe mgbede: ihe ọgụgụ

Jen 2:20–3:20

20Ya mere, mmadụ ahụ nyere anụ ụlọ niile na anụ ufe niile na anụ ọhịa niile aha. Ma nʼebe Adam nọ, o nweghị onye inyeaka kwesiri ya. 21Ya mere, Onyenwe anyị Chineke mere ka nwoke ahụ daa nʼụra. Mgbe ọ nọ na-arahụ ụra, o wepụtara otu ọgịrịga site na ngụ dị ya nʼahụ, mechikwaa ebe o si wepụta ya. 22Mgbe ahụ, Onyenwe anyị Chineke ji otu ọgịrịga o si nʼahụ nwoke ahụ wepụta, mee nwanyị, dutere ya nwoke ahụ. 23Nwoke ahụ kwuru sị, “Nke a bụ ọkpụkpụ si nʼọkpụkpụ m, na anụ ahụ si nʼahụ m, a ga-akpọ ya ‘nwanyị,’ nʼihi na e si nʼime nwoke wepụta ya.” 24Ọ bụ nke a mere nwoke ga-eji hapụ nne na nna ya, e jikọta ya na nwunye ya, ha ga-abụ otu anụ ahụ. 25Nwoke ahụ na nwunye ya gba ọtọ, ma ihere emeghị ha. 3:1Agwọ dị aghụghọ karịa ụmụ anụ ọhịa niile Onyenwe anyị Chineke kere. Ọ bịakwutere nwanyị ahụ sị ya, “Ọ bụ ezie na Chineke sị unu erila mkpụrụ si nʼosisi niile dị nʼogige a?” 2Nwanyị ahụ zara sị ya, “Anyị nwere ike rie mkpụrụ si nʼosisi niile dị nʼogige a 3ma Chineke kwuru sị, ‘Unu erila mkpụrụ si nʼosisi dị nʼetiti ogige a, unu emetụkwala ya aka, ka unu ghara ịnwụ.’ ” 4Agwọ gwara nwanyị ahụ sị, “Unu agaghị anwụ. 5Nʼihi na Chineke maara na ọ bụrụ na unu erie ya, anya unu ga-emeghe, unu ga-amata ezi ihe na ajọ ihe.” 6Nwanyị ahụ hụrụ na mkpụrụ si nʼosisi ahụ dị mma iri eri, na ọ dị mma nʼanya, na ọ bụ osisi mara mma e si enweta amamihe. Ọ ghọọrọ mkpụrụ ahụ rie, nyekwa di ya, onye nke na ya nọ, o rie. 7Mgbe ahụ, anya ha abụọ meghere, ha chọpụtara na ha gba ọtọ. Ya mere, ha dụkọtara ahịhịa fiig, jiri ya mere onwe ha akwa. 8Mgbe nwoke ahụ na nwunye ya nụrụ ụda njegharị Onyenwe anyị Chineke nʼogige ahụ nʼoge uhuruchi, ha zoro onwe ha site nʼebe Onyenwe anyị Chineke nọ nʼetiti osisi ndị dị nʼogige ahụ. 9Ma Onyenwe anyị Chineke kpọrọ nwoke ahụ oku sị ya, “Ebee ka ị nọ?” 10Ọ zara si, “Anụrụ m ụda ụkwụ gị nʼogige, nʼihi ya, atụrụ m ụjọ, ebe ọ bụ na m gba ọtọ. Ezokwara m onwe m.” 11Onyenwe anyị Chineke jụrụ ya sị, “Onye gwara gị na ị gba ọtọ? I riela mkpụrụ si nʼosisi ahụ m nyere gị iwu sị gị erila?” 12Nwoke ahụ sịrị, “Nwanyị ahụ i mere ka mụ na ya nọdụ, ọ bụ ya nyere m mkpụrụ sitere nʼosisi ahụ, m rie.” 13Mgbe ahụ, Onyenwe anyị Chineke sịrị nwanyị ahụ, “Gịnị bụ ihe a i mere?” Nwanyị ahụ zara sị, “Ọ bụ agwọ ghọgburu m, mee m ka m rie ya.” 14Ya mere, Onyenwe anyị Chineke gwara agwọ ahụ sị, “Nʼihi ihe a i mere, “Ihe a bụrụ ọnụ ka ị bụ nʼetiti anụ ụlọ niile na nʼetiti anụ ọhịa niile. Afọ gị ka ị ga-eji na-aga ije, aja ka ị ga na-eri ogologo ụbọchị ndụ gị niile. 15Aga m eme ka iro dịrị nʼetiti gị na nwanyị ahụ, nʼetiti mkpụrụ gị na mkpụrụ ya, mkpụrụ ya ga-etipịa gị isi, gị onwe gị ga-ata ya arụ nʼikiri ụkwụ.” 16Ọ gwara nwanyị ahụ sị ya, “Aga m eme ka ihe mgbu nke ịmụ nwa gị baa ụba nke ukwuu, ọ bụ site nʼihe mgbu ka ị ga-eji mụpụta ụmụ gị. Ọchịchọ nke obi gị ga-adị nʼaka di gị, ọ bụ ya ga-achịkwa gị.” 17Ọ gwara Adam sị, “Nʼihi na ị ṅara nwunye gị ntị, rie mkpụrụ site nʼosisi ahụ m nyere gị iwu sị, ‘Gị erila mkpụrụ sitere na ya,’ “Ala bụ ihe a bụrụ ọnụ nʼihi gị, site nʼoke ndọgbu nʼọrụ ka ị ga-eri ihe si na ya pụta ogologo ụbọchị ndụ gị niile. 18Ọ ga-erupụtara gị ogwu na uke, ị ga-erikwa ahịhịa nke ubi. 19Site nʼọsụsọ nke ga-agbapụta gị nʼihu ka ị ga-eri nri gị tutu ruo mgbe ị lọghachiri nʼala ebe ọ bụ site nʼala ka e si mepụta gị nʼihi na aja ka ị bụ, nʼaja ka ị ga-alaghachikwa.” 20Adam gụrụ nwunye ya Iiv, nʼihi na ọ bụ nne mmadụ niile dị ndụ.

Ofufe mgbede: ihe ọgụgụ

Ilu 3:19–34

19Ọ bụ site nʼamamihe ka Onyenwe anyị ji tọọ ntọala ụwa; ọ bụkwa nghọta ya mere ka eluigwe dịrị ebe ọ dị. 20Esitere nʼihe ọmụma ya kewaa ogbu mmiri niile, igwe ojii na-atụdakwa igirigi. 21Nwa m nwoke, ekwela ka ihe abụọ ndị a site nʼihu gị wezuga onwe ha: amamihe na nghọta nke ime ihe dị mma nʼizuzu zuruoke, 22nʼihi na ha na-enye gị ndụ ọhụrụ, ha bụkwaara gị ihe ịchọ mma amara nʼolu gị. 23Ha na-eme ka ị na-aga ije nʼụzọ gị na-enweghị ihe egwu maọbụ ihe mkpọbi ụkwụ. 24Mgbe ị ga-edina ala, ị gaghị atụ egwu, ị ga-edina ala ụra gị ga-adị ụtọ. 25Ị gaghị atụ egwu ihe mbibi mberede ọbụla maọbụ tụọ egwu ịla nʼiyi nke na-abịakwasị ndị ajọ omume. 26Nʼihi na Onyenwe anyị bụ ebe ndabere gị, ọ ga-echebekwa gị. 27Ejigidele ihe ọma ị pụrụ imere onye ọzọ mgbe ọ dị gị nʼaka ime ya. 28A sịkwala onye agbataobi gị laa, bịaghachi azụ echi mgbe i nwere ike ime ya taa. 29Agbala izu ọjọọ megide onye agbataobi gị, nʼihi na o nwere ntụkwasị obi nʼebe ị nọ. 30Ebola mmadụ ebubo na-enweghị isi, mgbe onye ahụ na-emeghị gị ihe ọjọọ ọbụla. 31Ekwosola onye na-eme ihe ike ekworo maọbụ họrọ ụzọ ya ọbụla. 32Nʼihi na ndị dị otu a bụ ihe arụ nʼanya Onyenwe anyị, ma ọ na-emeso ndị na-eme ihe ziri ezi mmeso ọma. 33Ọbụbụ ọnụ Onyenwe anyị dị nʼụlọ ndị na-eme ajọ omume, ma ọ na-agọzi ụlọ ndị ezi omume. 34Ndị mpako na-akwa emo ka ya onwe ya na-akwakwa emo, ma ndị dị umeala nʼobi ka ọ na-enye amara.

Ụbọchị ndị a na-eso kalenda Julian nke Nzukọ Rọshịa (dịka Nzukọ Sabia na Jọjia na Ugwu Athos): 6 Maachị na kalenda nzukọ bụ 19 Maachị na kalenda obodo. Nzukọ ndị na-eji kalenda ọhụrụ (Gris, Romania, Bulgaria, Ukraine…) na-eme mmemme ndị na-adịghị agbanwe agbanwe na ndị nsọ n’ụbọchị obodo ahụ n’onwe ya, ụbọchị 13 tupu mgbe ahụ, ụfọdụ ihe ọgụgụ ha dịkwa iche; Ista na ụbọchị ndị dabere na ya bụ otu.

Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike