Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Maachị 2027 › 18 Maachị
Kalenda Ọtọdọks · 5 Maachị (Kalenda ochie)
Ihe ọgụgụ Ọtọdọks nke ụbọchị — 18 Maachị 2027
Tọọzdee · Izu nke 1 nke Lent Ukwu · Olu 8
Mmemme na ndị nsọ
Martyr Conon of Isauria (1st C)
Oge Lent Ukwu
Obubu ọnụ siri ike (nri akọrọ: achịcha, akwụkwọ nri, mkpụrụ osisi)
Nke a na-eso iwu ndị mọnk. Nʼparish, a na-ekpebi ọtụtụ obubu ọnụ ya na onye na-anụ nkwupụta mmadụ, dịka ahụike, afọ na ọnọdụ si dị.
Ihe ọgụgụ nke ụbọchị
Elekere nke 6
11Anya nke onye nganga ka a ga-eweda nʼala, mpako nke ndị mmadụ ka a ga-ewedakwa nʼala. Ọ bụ naanị Onyenwe anyị ka a ga-ebuli elu nʼụbọchị ahụ. 12Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, nwere ụbọchị ọ kwadooro nye ndị mpako na ndị na-ebuli onwe ha elu, nʼihi na ihe niile e buliri elu (ka a ga-eweda nʼala), 13nye osisi sida niile topụrụ ogologo ma maa mma nke Lebanọn, na osisi ook niile nke Bashan, 14nye ugwu ukwu niile nke dị elu, na ugwu nta niile e buliri elu, 15nye ụlọ elu niile, na mgbidi niile e wusiri ike, 16nye ụgbọ mmiri niile e ji azụ ahịa, na ụgbọ mmiri ndị ọzọ niile buru ibu maa mma. 17Onye nganga ka a ga-eweda nʼala, mpako nke ndị mmadụ niile ka a ga-eweda nʼala. Naanị Onyenwe anyị ka a ga-ebuli elu nʼụbọchị ahụ. 18A ga-ala arụsị niile nʼiyi, mee ka ha ghara ịdịkwa. 19Ndị mmadụ ga-agba ọsọ gbaba nʼọnụ dị na nkume, na nʼọnụ e gwuru nʼala, nʼihi egwu Onyenwe anyị, na nʼihi ịma mma ebube nke ịdị ukwuu ya, mgbe ọ ga-ebili ịyọgharị ụwa. 20Nʼụbọchị ndị ahụ, ha ga-atụfusị arụsị ọlaedo na nke ọlaọcha ha kpụrụ, nke ha kpụrụ ma na-efe, hapụrụ ha ụmụ oke, na ụmụ ụsụ. 21Mgbe ahụ, ha ga-ezo onwe ha nʼoghere niile dị nʼoke nkume, na nʼime ọgba niile nke oke nkume nʼihi ịgbanarị iwe ọkụ Onyenwe anyị, na ịma mma ebube nke ịdị ukwuu ya, mgbe o biliri ịyọgharị ụwa.
Ofufe mgbede: ihe ọgụgụ
4Nke a bụ akụkọ banyere usoro okike eluigwe na ụwa mgbe e kere ha, nʼụbọchị ahụ mgbe Onyenwe anyị Chineke kere eluigwe na ụwa. 5Ahịhịa ọbụla epupụtabeghị nʼọhịa, o nwekwaghị ihe ubi ọbụla sitere nʼala pupụta, nʼihi na Onyenwe anyị Chineke ezitebeghị mmiri ozuzo nʼelu ụwa, o nwekwaghị mmadụ ọbụla nọ na-arụ ọrụ ubi, 6ma mmiri si nʼala na-asọpụta na-asọ nʼelu ala niile. 7Onyenwe anyị Chineke kpụrụ mmadụ site nʼaja nke ala, kunye ya ume ndụ nʼimi ya, nke mere ka mmadụ ghọọ ihe dị ndụ. 8Onyenwe anyị Chineke kụrụ ubi a gbara ogige nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ, nʼIden. O tinyere mmadụ ahụ ọ kpụrụ nʼime ubi a. 9Onyenwe anyị Chineke mere ka osisi dị iche iche si nʼala pupụta, osisi ndị dị mma ile anya na nke dịkwa mma iri eri. Nʼetiti ogige a, e nwere osisi na-enye ndụ, na osisi nke ịmata ihe ọma na ihe ọjọọ. 10E nwere iyi si nʼIden na-asọpụta na-asọbanye nʼime ogige ahụ ime ka ala ahụ nwee mmiri. Site nʼebe ahụ, iyi a kewara nwee ngalaba anọ. 11Aha ngalaba nke mbụ bụ Paịshọn. Ọ sọọrọ ogologo gafee ala niile nke Havila, ebe a na-enweta ọlaedo. 12(Ọlaedo dị nʼala ahụ mara mma. Eso osisi na-esi isi ụtọ na nkume dị oke ọnụahịa a na-akpọ ọniks dịkwa nʼebe ahụ.) 13Aha ngalaba nke abụọ bụ Gaihọn. O sitere nʼala Kush gafee. 14Aha osimiri nke atọ bụ Taịgris. Ọ na-asọla nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ nke ala Ashọ. Aha osimiri nke anọ bụ Yufretis. 15Onyenwe anyị Chineke weere mmadụ ahụ tinye ya nʼogige Iden, ka ọ na-akọ ya ma bụrụkwa onye na-elekọta ya. 16Onyenwe anyị Chineke nyere mmadụ ahụ iwu sị ya “I nwere ike iri mkpụrụ osisi niile dị nʼubi a, 17ma ị gaghị eri mkpụrụ si nʼosisi ịmata ihe ọma na ihe ọjọọ. Nʼihi na ụbọchị i riri ya ị ga-anwụrịrị.” 18Onyenwe anyị Chineke kwuru sị, “Ọ dịghị mma ka nwoke nọrọ naanị ya. Aga m emere ya onye inyeaka nke kwesiri ya.” 19Onyenwe anyị Chineke sitere nʼala kpụọ ụmụ anụmanụ niile nke ọhịa na ụmụ anụ ufe niile nke eluigwe. O dutere ha ka ọ mara ihe mmadụ ahụ ga-akpọ ha. Ihe ọbụla mmadụ ahụ kpọrọ ihe ọbụla ndị a nwere ndụ, nke ahụ bụkwa aha ya.
Ofufe mgbede: ihe ọgụgụ
1Nwa m echezọla ihe niile m ziri gị. Ma debe iwu m nʼobi gị. 2Nʼihi na ha ga-eme ka ndụ gị dị ogologo ruo ọtụtụ afọ, wetakwara gị udo na ọganihu. 3Ekwela ka ịhụnanya na ikwesi ntụkwasị obi hapụ gị, kekwasị ha nʼolu gị, deekwa ha nʼelu mbadamba nkume, bụ obi gị. 4Mgbe ahụ, ị ga-enwe ihuọma na ezi aha nʼanya Chineke na nʼihu mmadụ. 5Tụkwasị Onyenwe anyị obi gị niile, adaberekwala na nghọta gị. 6Nʼihe ọbụla ị na-eme, ka Chineke bute ụzọ, ọ ga-eduzi gị, meekwa ka okporoụzọ gị niile gazie. 7A bụla onye maara ihe nʼanya nke onwe gị. Tụọ Onyenwe anyị egwu, kpọọkwa ihe ọjọọ asị. 8Nke a ga-eme ka i nwee ahụ ike gbaakwa ọkpụkpụ gị ume. 9Sọpụrụ Onyenwe anyị site nʼinye ya mkpụrụ mbụ nke akụnụba gị, na mkpụrụ mbụ nke ihe ubi gị. 10Mgbe ahụ ka ọ ga-eme ka ọba gị niile jubigakwa oke, ebe ịnara mmanya gị ga-ejupụta na mmanya ọhụrụ. 11Nwa m nwoke ajụla ịdọ aka na ntị nke Onyenwe anyị, ike agwụla gị ịnagide ịba mba ya. 12Nʼihi na ọ bụ ndị Onyenwe anyị hụrụ nʼanya ka ọ na-abara mba, dịka nna si abara nwa ya nke ihe ya na-atọ ya ụtọ mba. 13Onye a gọziri agọzi ka mmadụ ahụ bụ onye chọtara amamihe, onye nwetara nghọta. 14Nʼihi na amamihe dị mma karịa ọlaọcha, ọ bakwara uru karịa ọlaedo. 15Ọ dị oke ọnụahịa karịa ọla rubi, ọ dịghị ihe na-amasị gị e ji atụnyere ya. 16Ndụ ogologo dị nʼaka nri ya; nʼaka ekpe ya ka akụnụba na nsọpụrụ dịkwa. 17Ụzọ ya bụ ụzọ dị mma bụrụkwa ụzọ udo. 18Amamihe bụ osisi nke ndụ nye ndị na-ejide ya aka, e, onye ahụ nke na-ejidesi ya aka ike ka ihe na-agara nke ọma.
Ụbọchị ndị a na-eso kalenda Julian nke Nzukọ Rọshịa (dịka Nzukọ Sabia na Jọjia na Ugwu Athos): 5 Maachị na kalenda nzukọ bụ 18 Maachị na kalenda obodo. Nzukọ ndị na-eji kalenda ọhụrụ (Gris, Romania, Bulgaria, Ukraine…) na-eme mmemme ndị na-adịghị agbanwe agbanwe na ndị nsọ n’ụbọchị obodo ahụ n’onwe ya, ụbọchị 13 tupu mgbe ahụ, ụfọdụ ihe ọgụgụ ha dịkwa iche; Ista na ụbọchị ndị dabere na ya bụ otu.
Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike