Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Maachị 2027 › 18 Maachị

Kalenda Katọlik

Ihe ọgụgụ Mass (Katọlik) — 18 Maachị 2027

Tọọzdee · Izu nke 5 nke Lent

Mmemme na ndị nsọ

Tọọzdee nke izu nke 5 nke Lent

Ncheta a na-ahọrọ · Agba ofufe: odo odo

Onye nsọ Sirịl nke Jerusalem, Bishọp na Onye nkuzi nke Chọọchị · Ncheta nkenke

Ihe ọgụgụ nke ụbọchị

Ihe ọgụgụ mbụ

Jen 17:3–9

3Ebram dara nʼala, kpudo ihu ya nʼala. Chineke gwara ya sị, 4“Lee, nke a bụ ọgbụgba ndụ dị nʼetiti mụ na gị. Ị ga-abụ nna ọtụtụ mba. 5Aha gị agaghị abụkwa Ebram, kama ọ ga-abụ Ebraham, nʼihi na emeela m gị nna nke ọtụtụ mba. 6Aga m eme gị ka ị mụbaa nke ukwuu. Aga m eme ka ị ghọọ ọtụtụ mba dị iche iche, ndị eze ga-esitekwa na gị pụta. 7Aga m eme ka ọgbụgba ndụ mụ na gị gbara guzosie ike, ka ọ dịkwara ụmụ ụmụ ndị ga-esote gị nʼọgbọ niile na-abịa. Ọ bụ ọgbụgba ndụ na-egosi na m bụ Chineke gị, na Chineke ụmụ ụmụ gị niile ga-eso gị. 8Ala Kenan niile, ebe ị nọ ugbu a dịka ọbịa ka m ga-enye gị na ụmụ ụmụ gị ga-esote gị dịka ihe nketa ebighị ebi. Aga m abụ Chineke ha.” 9Chineke gwara Ebraham okwu sị ya, “Ma nʼebe ị nọ, ị ghaghị irube isi imezu ihe ọgbụgba ndụ m kwuru, gị onwe gị na ụmụ ụmụ gị ndị ga-esote gị, ruo ọgbọ niile.

Abụ Ọma nzaghachi

Abụ 105:4–9

4Na-achọnụ Onyenwe anyị na ike ya, chọọnụ ihu ya mgbe niile. 5Chetanụ ọrụ ebube niile nke ọ rụrụ, ihe ịrịbama ya niile na ikpe ziri ezi niile si nʼọnụ ya pụta, 6unu ụmụ ụmụ Ebraham, bụ ohu ya, unu ụmụ ụmụ Jekọb, ndị ọ họpụtara. 7Ya onwe ya bụ Onyenwe anyị Chineke anyị; ikpe ya dị nʼụwa niile. 8Ọ na-echeta ọgbụgba ndụ ya ruo mgbe ebighị ebi, bụ nkwa o kwere nye puku ọgbọ, 9ọgbụgba ndụ ahụ nke ya na Ebraham gbara na iyi ọ ṅụrụ nye Aịzik.

Oziọma

Jọn 8:51–59

51Nʼezie, nʼezie, agwa unu, onye ọbụla na-edebe okwu m agaghị anwụ ọzọ.” 52Mgbe ahụ ndị Juu sịrị ya, “Anyị maara ugbu a na mmụọ ọjọọ bi nʼime gị. Ebraham nwụrụ anwụ ya na ndị amụma, ma gị onwe gị na-asị na onye ọbụla kwere na gị agaghị anwụ ruo mgbe ebighị ebi. 53Ị dị ukwuu karịa nna anyị Ebraham? Ọ nwụrụ, ma ndị amụma nwụkwara. Onye ka ị na-eche na ị bụ?” 54Jisọs zara, “Ọ bụrụ na m etoo onwe m, otuto m bụ ihe efu, Nna m, onye unu na-asị na ọ bụ Chineke unu, bụ onye na-eto m. 55Amaara m onye ọ bụ nʼagbanyeghị na unu amaghị ya. Aga m abụ onye ụgha ma ọ bụrụ na m ga-asị na-amaghị m onye ọ bụ. Amaara m ya na-edebekwa okwu ya. 56Nna unu Ebraham ṅụrịrị ọṅụ mgbe o chetara na ọ ga-ahụ ụbọchị m; ọ hụrụ ya ma ṅụrịakwa ọnụ.” 57Ndị Juu sịrị ya, “Ị gbabeghị iri afọ ise ma ị hụla Ebraham?” 58Jisọs sịrị ha, “Nʼezie, nʼezie agwa m unu, tupu amụọ Ebraham, mụ onwe m nọ ya.” 59Ya mere, ha tụtụlitere nkume ịtụ ya, ma Jisọs zoro onwe ya, sitekwa nʼụlọnsọ ukwuu ahụ pụọ.

Ndị nsọ nke ụbọchị

Kalenda Rom n’ozuzu; ọgbakọ ndị bishọp nwere ike ibuga ụfọdụ mmemme (Epifani, Mgbago n’Eluigwe, Ahụ na Ọbara Kraịst) n’ụbọchị Sọnde ma ọ bụ tinye nke ha. Akwụkwọ ọgụgụ: usoro Sọnde B, afọ ụbọchị izu I.

Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike