Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Maachị 2027 › 12 Maachị

Kalenda Katọlik

Ihe ọgụgụ Mass (Katọlik) — 12 Maachị 2027

Fraịdee · Izu nke 4 nke Lent

Mmemme na ndị nsọ

Fraịdee nke izu nke 4 nke Lent

Ụbọchị izu · Agba ofufe: odo odo

Obubu ọnụ na nchegharị

Izere anụ

Fraịdee ọ bụla bụ ụbọchị nchegharị; ọgbakọ ndị bishọp ọ bụla na-ekpebi otú a ga-esi debe ya: izere anụ ma ọ bụ omume nchegharị ọzọ. Obubu ọnụ na-ejikọ ndị dị afọ 18 ruo 59, izere anụ site nʼafọ 14.

Ihe ọgụgụ nke ụbọchị

Ihe ọgụgụ mbụ

Ọ dịghị na nsụgharị a

Abụ Ọma nzaghachi

Abụ 34:16–20, 22

16ma ihu Onyenwe anyị na-emegide ndị na-eme ihe ọjọọ, ime ka a hapụ ichetakwa ihe banyere ha nʼụwa. 17Onyenwe anyị na-anụ olu ndị ezi omume, mgbe ha na-akpọku ya ka o nyere ha aka; ọ na-azọpụtakwa ha site na nsogbu ha niile. 18Onyenwe anyị na-anọ ndị niile obi ha tiwara etiwa nso, ọ na-anapụta ndị niile olileanya ha gwụrụ. 19Nsogbu na-adakwasị ndị ezi omume na-adị ukwuu, ma Onyenwe anyị na-anapụta ha site na nsogbu ndị ahụ niile. 20Ọ na-anapụtakwa ha kpamkpam. Ọ gaghị ekwe ka ọ bụladị otu ọkpụkpụ dị ha nʼahụ gbajie. 22Onyenwe anyị na-agbapụta ndị ohu ya; ọ dịghị onye ọbụla nke na-agbaba nʼime ya a ga-ama ikpe ọnwụ.

Oziọma

Jọn 7:1–2, 10, 25–30

1Mgbe nke a gasịrị, Jisọs gagharịrị na Galili, ma ọ kpachapụrụ anya hapụ ịga Judịa nʼihi na ndị Juu na-achọ ụzọ igbu ya. 2Mmemme Ụlọ ikwu ndị Juu dị nso, 10Ma otu ọ dị, mgbe ụmụnne ya gawara mmemme ahụ ya onwe ya gakwara. Ọ gaghị ebe mmadụ niile ga-ahụ ya kama ọ gara na nzuzo. 25Nʼoge ahụ, ụfọdụ nʼime ndị Jerusalem bidoro na-asị, “Onye a ọ bụghị nwoke ahụ ha chọrọ igbu? 26Lee ka ọ nọ na-ekwu okwu nʼihu mmadụ niile ma o nwekwaghị onye na-agwa ya ihe ọbụla. Ọ pụtara na ndịisi amatala nʼeziokwu na ọ bụ Kraịst? 27Ma anyị matara ebe nwoke a siri pụta, mgbe Kraịst ahụ ga-abịa, o nweghị onye ga-amata ebe o siri pụta.” 28Ma dị ka Jisọs na-ezi ihe nʼime ụlọnsọ ukwuu ahụ, o tiri mkpu sị, “Nʼezie, unu maara m, matakwa ebe m siri pụta. Anọghị m nʼebe a na nke onwe m, ma onye ahụ zitere m bụ eziokwu. Unu amaghị ya. 29Ma amara m ya, nʼihi na esitere m na ya bịa. Ọ bụkwa ya zitere m.” 30Mgbe ahụ ha chọrọ ijide ya, ma o nweghị onye ọbụla metụrụ ya aka nʼihi na oge ya erubeghị.

Kalenda Rom n’ozuzu; ọgbakọ ndị bishọp nwere ike ibuga ụfọdụ mmemme (Epifani, Mgbago n’Eluigwe, Ahụ na Ọbara Kraịst) n’ụbọchị Sọnde ma ọ bụ tinye nke ha. Akwụkwọ ọgụgụ: usoro Sọnde B, afọ ụbọchị izu I.

Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike