Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Maachị 2027 › 10 Maachị

Kalenda Katọlik

Ihe ọgụgụ Mass (Katọlik) — 10 Maachị 2027

Wenezdee · Izu nke 4 nke Lent

Mmemme na ndị nsọ

Wenezdee nke izu nke 4 nke Lent

Ụbọchị izu · Agba ofufe: odo odo

Ihe ọgụgụ nke ụbọchị

Ihe ọgụgụ mbụ

Aịz 49:8–15

8Otu a ka Onyenwe anyị na-ekwu: “Nʼoge amara m, aga m aza unu, nʼụbọchị nzọpụta aga m enyere unu aka. Aga m echebe unu, mee ka unu bụrụ ọgbụgba ndụ nye ndị mmadụ, iweghachite ala ahụ na ikegharịkwa ihe nketa ya nke tọgbọrọ nʼefu; 9na-asị ndị mkpọrọ, ‘Pụtanụ,’ na-asịkwa ndị nọ nʼọchịchịrị, ‘Pụtanụ nʼihe.’ “Ha ga-adịkwa ka atụrụ m, nọọ nʼakụkụ ụzọ, ndị na-ata ahịhịa nʼebe ịta nri nke ahịhịa ndụ, nʼakụkụ ugwu nta niile. 10Agụ agaghị agụ ha, akpịrị agaghị akpọkwa ha nkụ. Oke anwụ otiti nke ọzara agaghị acha ha ọzọ. Nʼihi na Onyenwe anyị ga-esite nʼobi ebere ya duo ha nʼakụkụ isi iyi jupụtara na mmiri. 11Aga m emekwa ka ugwu ukwu niile ghọọ okporoụzọ, meekwa ka okporoụzọ niile guzozie. 12Lee, ndị m ga-alọghachi, ha ga-esitekwa nʼebe dị anya, ụfọdụ ga-esite nʼugwu, ụfọdụ nʼọdịda anyanwụ, ndị ọzọ ga-esite na mpaghara Aswan.” 13Tienụ mkpu ọṅụ, eluigwe niile; ka ụwa ṅụrịa ọṅụ. Ugwu ukwu niile, bụọnụ abụ, nʼihi na Onyenwe anyị akasịela ndị ya obi. Ọ ga-enwekwa obi ebere nʼihi iru ụjụ ha. 14Ma Zayọn sịrị, “ Onyenwe anyị agbakụtala m azụ; Onyenwe m echefuola m.” 15“Nwanyị ọ pụrụ ichezọ nwa ya na-aṅụ ara, hapụ inwe obi ebere nʼahụ nwa si nʼafọ ya? Eleghị anya ọ pụrụ ichezọ, ma agaghị m echezọ unu.

Abụ Ọma nzaghachi

Abụ 145:8–9, 13–14, 17–18

8Onyenwe anyị na-eme amara nweekwa obi ọmịiko, ọ dịghị ewe iwe ọsịịsọ, ọ bara ụba nʼịhụnanya. 9Onyenwe anyị dị mma nʼebe mmadụ niile dị; o nwere ọmịiko nʼebe ihe niile o kere eke dị. 13Alaeze gị bụ alaeze na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi, ọchịchị gị na-adịgidekwa site nʼọgbọ ruo nʼọgbọ. Onyenwe anyị na-emezu nkwa ya niile na-ahụkwa ihe niile o kere eke nʼanya. 14Onyenwe anyị na-ekulite ndị niile dara ada na-akwagide ndị niile dara mba. 17Ụzọ Onyenwe anyị niile ziri ezi; ọ na-ahụkwa ihe niile o kere eke nʼanya. 18Onyenwe anyị na-anọ nso ndị niile na-akpọku ya, bụ ndị niile na-akpọku ya nʼeziokwu.

Oziọma

Jọn 5:17–30

17Jisọs sịrị ha, “Nna m na-arụ ọrụ mgbe niile ruo ugbu a, mụ onwe m kwa, ana m arụ ọrụ.” 18Nʼihi nke a, ndị Juu chọsịrị ike igbu ya. Ọ bụghị naanị na o mebiri ụbọchị izuike, kama ọ na-akpọkwa Chineke Nna ya, sitekwa otu a na-eme ka ya na Chineke hara. 19Jisọs zara ha sị, “Nʼezie, nʼezie agwa m unu, o nweghị ihe ọbụla Ọkpara pụrụ ime nʼonwe ya; naanị ihe o nwere ike ime bụ ihe ọ hụrụ Nna ya na-eme, nʼihi na ihe ọbụla Nna ahụ na-eme ka Ọkpara ya na-emekwa. 20Nʼihi na Nna ahụ hụrụ Ọkpara ya nʼanya ma na-egosikwa ya ihe niile ọ na-eme. Nʼezie ọ ga-agbagwoju unu anya nʼihi na ọ ga-egosi ya ihe karịrị ndị a. 21Nʼihi na dị ka nna ahụ si akpọte ndị nwụrụ anwụ na-enyekwa ha ndụ, otu ahụ ka Ọkpara ya si enye onye ọbụla ọ masịrị ya ndụ. 22Nna anaghị ekpe onye ọbụla ikpe, kama o nyefere ikpe niile nʼaka Ọkpara. 23Ka mmadụ niile nye Ọkpara ahụ nsọpụrụ dị ka ha na-asọpụrụ Nna ahụ. Onye ọbụla nke na-adịghị asọpụrụ Ọkpara ahụ adịghị asọpụrụ Nna nke zitere ya. 24“Nʼezie, nʼezie agwa m unu, onye ọbụla na-anụ okwu m ma kwerekwa nʼonye zitere m nwere ndụ ebighị ebi, a gaghị amakwa ya ikpe, ọ gafeela site nʼọnwụ banye na ndụ. 25Nʼezie, nʼezie agwa m unu, oge na-abịa, ọ bịakwala ugbu a mgbe ndị nwụrụ anwụ ga-anụ olu Ọkpara Chineke, ndị ahụ nụrụ ya ga-adịkwa ndụ. 26Dị ka Nna ahụ nwere ndụ nʼime onwe ya, otu a ka o nyekwara Ọkpara ahụ ike inwe ndụ nʼime onwe ya. 27O nyekwala ya ikike ikpe ikpe nʼihi na ọ bụ Nwa nke Mmadụ. 28“Ka nke a hapụ iju unu anya, nʼihi na oge na-abịa, mgbe ndị niile nọ nʼili ha ga-anụ olu ya 29ma pụta, ndị mere ihe dị mma ga-ebili dịrị ndụ. Ma ndị mere ihe ọjọọ ga-ebili bụrụ ndị a ga-ama ikpe. 30Enweghị m ike ime ihe ọbụla nʼonwe m, ikpe m na-ekpe bụ naanị dị ka m nụrụ, ikpe m bụkwa nke ziri ezi, nʼihi na anaghị m eme ihe ga-amasị m, kama ọ bụ ihe ga-amasị onye ahụ zitere m.

Kalenda Rom n’ozuzu; ọgbakọ ndị bishọp nwere ike ibuga ụfọdụ mmemme (Epifani, Mgbago n’Eluigwe, Ahụ na Ọbara Kraịst) n’ụbọchị Sọnde ma ọ bụ tinye nke ha. Akwụkwọ ọgụgụ: usoro Sọnde B, afọ ụbọchị izu I.

Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike