Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Maachị 2027 › 9 Maachị
Kalenda Katọlik
Ihe ọgụgụ Mass (Katọlik) — 9 Maachị 2027
Tiuzdee · Izu nke 4 nke Lent
Mmemme na ndị nsọ
Tiuzdee nke izu nke 4 nke Lent
Ncheta a na-ahọrọ · Agba ofufe: odo odo
Onye nsọ Fransis nke Rom, Onye okpukpe · Ncheta nkenke
Ihe ọgụgụ nke ụbọchị
Ihe ọgụgụ mbụ
1Mgbe ahụ, nwoke ahụ mere ka m lọghachikwa nʼọnụ ụzọ ụlọnsọ ukwu ahụ. Ahụrụ m iyi nke na-asọ na-aga nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ (nʼihi na ihu ụlọnsọ ahụ chere ihu nʼọwụwa anyanwụ). Mmiri ahụ si nʼokpuru ụlọnsọ ukwu ahụ nʼakụkụ aka nri nke ebe ịchụ aja, nʼakụkụ ndịda ya na-asọpụta, 2O mere ka m si nʼọnụ ụzọ dị nʼugwu pụta, ma gaa nʼọnụ ụzọ nke ọwụwa anyanwụ, ebe m hụrụ mmiri ahụ ka o si na ndịda na-asọpụta. 3Mgbe anyị na-aga, o ji ihe ọtụtụ dị ya nʼaka tụpụta ihe ruru narị mita ise na iri mita atọ. O duuru m na-agafe mmiri ahụ. Nʼoge a, mmiri ahụ erutela na nkwonkwo ụkwụ. 4O jikwa ihe ọtụtụ ya tụpụtakwa ihe ruru narị mita ise na iri mita atọ ọzọ, durukwa m na-aga. Nʼoge a, mmiri ahụ erutela m nʼikpere. Mgbe ọ tụpụtara ihe ruru narị mita ise na iri mita atọ ọzọ, o duuru m gafee mmiri ruru m nʼukwu. 5Ọ tụpụtakwara ihe ruru narị mita ise na iri mita atọ ọzọ, mmiri ahụ ghọrọ osimiri nke m na-apụghị ịgafe, nʼihi na mmiri ahụ toro eto bụrụ mmiri ogwugwu, osimiri nke mmadụ na-apụghị iji ije ụkwụ gafee. 6Ọ sịrị m, “Nwa nke mmadụ, ị hụrụ ihe ndị a?” O duuru m laghachi nʼọnụ mmiri. 7Mgbe m rutere nʼọnụ mmiri, lee, ahụrụ m ọtụtụ osisi nke toro nʼakụkụ abụọ nke iyi ahụ. 8Ọ sịrị, “Iyi a na-asọ na-aga akụkụ ọwụwa anyanwụ, sọbanye nʼime Araba, tutu bịa sọbanye nʼosimiri nnu ahụ. Mgbe ọ sọbanyere nʼosimiri nnu ahụ, mmiri ya na-aghọ mmiri dị mma ọṅụṅụ 9Ọtụtụ ihe e kere eke dị ndụ ga-ebi nʼebe ọbụla mmiri a na-asọ aga. Azụ dị ukwuu ga-ejupụta nʼebe ahụ, nʼihi na mmiri a na-asọbanye nʼebe ahụ, na-eme ka mmiri osimiri ghọọ mmiri dị mma ịṅụ aṅụ. Ya mere, ihe niile dị nʼebe ọbụla mmiri a sọjere ga-adị ndụ. 12Mkpụrụ osisi dị iche iche ga-eto nʼakụkụ abụọ nke iyi ahụ. Akwụkwọ ha agaghị akpọnwụ akpọnwụ, mkpụrụ ga-adị nʼelu ha mgbe niile. Mkpụrụ ọhụrụ ga-adị nʼọnwa ọbụla, nʼihi na ọ bụ mmiri si nʼebe nsọ ahụ na-agba ha mmiri. Mkpụrụ ha ga-abụ nri, akwụkwọ ha ga-abụkwa maka ịgwọ ọrịa.”
Abụ Ọma nzaghachi
1Abụ Ọma nke dịrị onyeisi abụ. Abụ ụmụ Kora. Nʼusoro olu abụ alamot. Otu Abụ. Chineke bụ ebe mgbaba anyị, na ike anyị, onye inyeaka anyị ka ọ bụ nʼoge nsogbu. 2Nʼihi ya, anyị agaghị atụ egwu, ọ bụladị mgbe ụwa niile na-emebi, maọbụ mgbe a na-ewezuga ugwu nʼọnọdụ ha, mee ka ha daba nʼoke osimiri. 4Otu iyi dị nke na-asọbata na-eweta ọṅụ nʼime obodo Chineke, nʼime ebe obibi dị nsọ nke Onye kachasị ihe niile elu. 5Chineke bi nʼime ya, ọ gaghị ada; Chineke ga-enyere ya aka mgbe chi bọrọ. 7Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile nọnyere anyị; Chineke nke Jekọb bụ ebe mgbaba anyị e wusiri ike. Sela 8Bịa, hụrụ ihe ebube niile Onyenwe anyị mere, lee oke ịla nʼiyi niile o webatara nʼelu ụwa.
Oziọma
1Mgbe nke a gasịrị, otu mmemme ndị Juu ruru, Jisọs agaa Jerusalem. 2Ma otu ọdọ mmiri nta dị nʼime Jerusalem nʼakụkụ Ọnụ ụzọ ama Atụrụ. Aha ọdọ mmiri ahụ nʼasụsụ Hibru bụ Betsaida, nke nwere mgbe ọnụ ụzọ ise. 3Nʼime ya ka igwe ndị ahụ na-esighị ike na-edina; ndị ìsì, ndị ngwụrọ, na ndị akụkụ ahụ ha kpọnwụrụ akpọnwụ, ha na-eche mgbe mmiri ahụ ga-enugharị. 5Otu nwoke nọ nʼebe ahụ bụ onye nọrọla nʼọrịa iri afọ atọ na asatọ. 6Mgbe Jisọs hụrụ ya, matakwa na ọ nọọla nʼọnọdụ a ogologo oge, ọ jụrụ ya sị, “Ị chọrọ ka a gwọọ gị ọrịa?” 7Onye ọrịa ahụ zara, “Nna m ukwu, enweghị m onye ọbụla ga-enyere m aka kuba m nʼime ọdọ mmiri a ma a gbarụọ ya, mgbe o bụla m chọrọ ka m danye, onye ọzọ na-eburu m ụzọ danye.” 8Jisọs gwara ya, “Bilie, chilie ute gị jegharịa.” 9Nʼotu oge ahụ, ahụ dịrị nwoke ahụ mma, ọ chịlịri ute ya, malite ijegharị. Ihe a mere nʼụbọchị izuike. 10Ma ndị Juu gwara nwoke ahụ a gwọrọ ọrịa, “Taa bụ ụbọchị izuike, o megidere iwu na ị ga-ebu ute gị.” 11Ma ọ zaghachiri ha, “Nwoke ahụ mere ka ahụ dị m mma sịrị m, ‘Chilie ute gị laa.’ ” 12Ha jụrụ ya, “Onye bụ onye ahụ gwara gị ka ị chilie ya laa?” 13Ma nwoke ahụ a gwọrọ amataghị onye ọ bụ nʼihi na Jisọs zoro onwe ya banye nʼetiti igwe mmadụ. 14Emesịa, Jisọs hụrụ ya nʼime ụlọnsọ ukwu sị ya, “Lee, e mela ka ahụ dị gị mma, emehiekwala ọzọ ka nke dị njọ karịa nke a hapụ ịbịakwasị gị.” 15Nwoke a siri nʼebe ahụ pụọ gaa gwa ndị Juu na ọ bụ Jisọs gwọrọ ya. 16Ya mere, nʼihi na Jisọs na-eme ihe ndị a nʼụbọchị izuike, ndị Juu malitere isogbu ya.
Ndị nsọ nke ụbọchị
- Onye nsọ Fransis nke Rom, Onye okpukpe
Kalenda Rom n’ozuzu; ọgbakọ ndị bishọp nwere ike ibuga ụfọdụ mmemme (Epifani, Mgbago n’Eluigwe, Ahụ na Ọbara Kraịst) n’ụbọchị Sọnde ma ọ bụ tinye nke ha. Akwụkwọ ọgụgụ: usoro Sọnde B, afọ ụbọchị izu I.
Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike