Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Maachị 2027 › 1 Maachị
Kalenda Katọlik
Ihe ọgụgụ Mass (Katọlik) — 1 Maachị 2027
Mọnde · Izu nke 3 nke Lent
Mmemme na ndị nsọ
Mọnde nke izu nke 3 nke Lent
Ụbọchị izu · Agba ofufe: odo odo
Ihe ọgụgụ nke ụbọchị
Ihe ọgụgụ mbụ
1Nʼoge a, Neeman bụ ọchịagha ndị agha eze Aram, Ọ bụ onye dị ukwuu nʼanya nna ya ukwu, bụrụkwa onye a na-enye nsọpụrụ nʼihi na Onyenwe anyị sitere nʼaka ya nye ndị agha Aram mmeri nʼọgbọ agha dị iche iche. Ọ bụ dike na dimkpa nʼagha, maọbụ onye ekpenta. 2Otu mgbe, ụfọdụ nʼime ndị agha Aram na-apụnara ndị mmadụ ihe pụrụ ga dọta otu nwaagbọghọ nta site nʼIzrel, onye na-ejere nwunye Neeman ozi. 3Ọ sịrị nne ya ukwu, “Ọ gaara atọ m ụtọ ma a sị na nna m ukwu ga-aga hụ onye amụma nọ na Sameria. Ọ ga-agwọ ya ọrịa ekpenta a.” 4Neeman nụrụ nke a, bilie gaa kọọrọ eze Aram ihe niile nwaagbọghọ a si Izrel kwuru. 5Eze Aram sịrị, “Bilie, gaa, aga m ezigakwara eze Izrel akwụkwọ ozi.” Ya mere Neeman gara, ọ chịịrị talenti ọlaọcha iri, na puku shekel ọlaedo isii, na uwe ọma dị iche iche, nke dị iri nʼọnụọgụgụ. 6Nke a bụkwa ihe dị nʼime akwụkwọ ahụ eze Aram degaara eze Izrel: “Nwoke a ji akwụkwọ a bịakwute gị bụ Neeman, onyeisi ndị agha m. Biko, achọrọ m ka ị gwọọ ya ọrịa ekpenta dị ya nʼahụ.” 7Ngwangwa eze Izrel gụrụ akwụkwọ ahụ, ọ dọwara uwe ya sị, “Abụ m Chineke? A pụrụ m ime ka mmadụ nwụọ na ime ka mmadụ dị ndụ? Gịnị mere nwoke a ji ezitere m onye m ga-agwọ ọrịa ekpenta? Lee ka o si na-achọ ụzọ anyị ga-eji nwee esemokwu.” 8Mgbe Ịlaisha onye Chineke nụrụ na eze Izrel dọwara uwe ya, o ziri ozi a zigara ya sị, “Gịnị mere i ji dọwaa uwe gị? Zitere m Neeman. Ọ ga-amatakwa na e nwere onye amụma nʼIzrel.” 9Ya mere, Neeman bịarutere guzo nʼọnụ ụzọ ụlọ Ịlaisha, ya na ịnyịnya ya, na ụgbọ agha ya. 10Ịlaisha zigara onyeozi ya nke bịara zie sị ya, “Jee saa ahụ gị ugboro asaa nʼosimiri Jọdan. I mee nke a, ekpenta ahụ ga-esi nʼakụkụ ahụ gị niile pụọ. Ị ga-adịkwa ọcha.” 11Ma Neeman were iwe nke ukwuu tụgharịa bido ịlaghachi ebe o si bịa. Mgbe ọ na-ala, ọ na-ekwu na-asị, “Echere m na ọ ga-apụkwute m, guzo, kpọkuo aha Onyenwe anyị Chineke ya, fufee aka ya nʼebe ahụ ọrịa m dị, gwọọ m ọrịa ekpenta m. 12Abana na Fapa, bụ osimiri dị na Damaskọs, ha adịghị mma karịa mmiri Izrel niile? Ọ bụ na m enweghị ike ịsa ahụ nʼime ha ma dị ọcha.” Ọ tụgharịrị jiri ọnụma pụọ. 13Ma ndị ozi Neeman jekwuru ya sị ya, “Nna anyị, a sị na ọ bụ ihe sịrị ike nke ukwuu ka onye amụma ahụ gwara gị sị gị mee, ị garaghị eme ya? Ma ihe ọ sị gị mee bụ naanị ‘Gaa saa ahụ gị ka ị dị ọcha.’ ” 14Ya mere, ọ gara sụnye onwe ya nʼime osimiri Jọdan ugboro asaa, dịka onye nke Chineke gwara ya. Anụ ahụ ya lọghachiri dị ọcha ka anụ ahụ nwantakịrị. 15Mgbe ahụ, Neeman na ndị niile ya na ha so laghachikwutere onye nke Chineke. O guzoro nʼihu ya sị, “Ugbu a amatala m na ọ dịghị Chineke ọzọ dị nʼụwa niile ma ọ bụghị naanị nʼIzrel. Ya mere, biko, nara onyinye a site nʼaka ohu gị.”
Abụ Ọma nzaghachi
1Abụ Ọma nke dịrị onyeisi abụ. Abụ Maskil nke ụmụ Kora. Dịka agụụ ịṅụ mmiri si na-agụ nne ele, otu a ka agụụ ihe banyere gị si na-agụ m, O Chineke. 2Akpịrị nke ihe banyere Chineke, bụ Chineke ahụ dị ndụ, na-akpọ m nkụ. Olee mgbe m pụrụ ịga zute Chineke? 43:3Zipụ ìhè gị na eziokwu gị, ka ha duo m; ka ha kpọbata m nʼugwu nsọ gị, bụ ebe i bi. 4Mgbe ahụ, aga m aga nʼebe ịchụ aja Chineke, gakwuru Chineke, bụ ọṅụ m na obi ụtọ m. Aga m eji ụbọ akwara too gị, O Chineke, bụ Chineke m.
Oziọma
24Ọ gara nʼihu sị, “Ma ị gwa unu eziokwu, o nweghị onye amụma ọbụla a na-anabata nke ọma nʼobodo a mụrụ ya. 25Nʼezie, chetakwanụ na e nwere ọtụtụ ụmụ nwanyị di ha nwụrụ anwụ nʼoge Ịlaịja onye amụma. Nʼoge oke ụnwụ dara nʼala ahụ dum, mgbe e mechiri eluigwe na mmiri ezoghị nʼala Izrel afọ atọ na ọnwa isii. 26Ma e zigaghị Ịlaịja ka o jekwuru onye ọbụla nʼime ha karịakwa nwanyị di ya nwụrụ anwụ nʼobodo Zarefat nʼakụkụ Saịdọn. 27Nʼoge Ịlaisha onye amụma, e nwere ọtụtụ ndị ekpenta nʼala Izrel, ma o nweghị onye e mere ka ọ dị ọcha nʼetiti ha karịakwa Neeman onye Siria.” 28Mgbe ndị nọ nʼụlọ ekpere ahụ nụrụ nke a, iwe were ha nke ukwuu. 29Ha biliri, kwapụ ya site nʼobodo ahụ, dọkpụrụ ya gaa nʼelu ugwu nke e wukwasịrị obodo ahụ ka ha nwee ike tụpụ ya site nʼugwu ahụ. 30Ma o sitere nʼetiti igwe mmadụ ahụ pụọ, gawara onwe ya.
Kalenda Rom n’ozuzu; ọgbakọ ndị bishọp nwere ike ibuga ụfọdụ mmemme (Epifani, Mgbago n’Eluigwe, Ahụ na Ọbara Kraịst) n’ụbọchị Sọnde ma ọ bụ tinye nke ha. Akwụkwọ ọgụgụ: usoro Sọnde B, afọ ụbọchị izu I.
Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike