Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Maachị 2027 › 2 Maachị

Kalenda Katọlik

Ihe ọgụgụ Mass (Katọlik) — 2 Maachị 2027

Tiuzdee · Izu nke 3 nke Lent

Mmemme na ndị nsọ

Tiuzdee nke izu nke 3 nke Lent

Ụbọchị izu · Agba ofufe: odo odo

Ihe ọgụgụ nke ụbọchị

Ihe ọgụgụ mbụ

Ọ dịghị na nsụgharị a

Abụ Ọma nzaghachi

Abụ 25:4–9

4O Onyenwe anyị, zi m ụzọ gị niile, kuzikwaara m ụzọ gị niile. 5Duo m nʼeziokwu gị, kuzikwaara m ihe, nʼihi na ị bụ Chineke, onye Nzọpụta m, ụbọchị niile, olileanya m dị na gị. 6Cheta, Onyenwe anyị, oke obi ebere na ịhụnanya gị, nʼihi na ha na-adị siterị na mgbe ochie. 7Echetala mmehie m mere nʼokorobịa m, ya na nnupu isi m niile. Kama site nʼịhụnanya gị cheta m, Onyenwe anyị, nʼihi na onye dị mma ka ị bụ. 8Onye dị mma na onye ezi omume ka Onyenwe anyị bụ; ọ bụ ya mere ọ na-ezi ndị mmehie ụzọ ya. 9Ọ na-edu ndị dị umeala nʼobi nʼụzọ ziri ezi, na-ezikwa ha ụzọ nke ya.

Oziọma

Mat 18:21–35

21Mgbe ahụ Pita bịakwutere ya jụọ ya ajụjụ sị, “Onyenwe anyị, ọ bụ ugboro ole ka m ga-agbaghara nwanne m nke mehiere megide m? Ọ bụ ugboro asaa?” 22Jisọs zara sị ya, “Ọ bụghị ugboro asaa. Kama ị ga-agbaghara ya ruo iri ugboro asaa ụzọ asaa. 23“A ga-eji alaeze eluigwe tụnyere eze ahụ kpebiri ka ya na ndị ọrụ ya gụzie ego ya ha ji. 24Mgbe ha malitere na-apịazi, a kpọtaara eze ahụ otu onye nke ji ya ụgwọ ruru puku talenti iri. 25Nwoke ahụ enweghị ihe ọ ga-eji kwụọ ụgwọ o ji. Nna ya ukwu nyere iwu ka e refuo ya na nwunye ya na ụmụ ya, na ihe niile o nwere, ka akwụghachi ụgwọ o ji. 26“Ma ohu ahụ dara nʼala, gbukwaa ikpere ya nʼala, rịọ ya arịrịọ sị, ‘Onyenwe m, biko, nwee ntachiobi nʼebe m nọ. Aga m akwụghachikwa gị ụgwọ niile m ji gị.’ 27Nna ukwu onye ọrụ ahụ nwere ọmịiko nʼebe ọ nọ, meere ya ebere. Ọ sịrị ya akwụghachila ụgwọ o ji ọzọ. 28“Ma mgbe ohu ahụ sitere nʼebe ahụ pụọ, ọ hụrụ otu ohu ibe ya ji ya ụgwọ otu narị denarị. O jidere ya nʼaka ike, machie ya aka nʼakpịrị, sị ya, ‘Kwụghachi m ụgwọ i ji m ugbu a.’ 29“Ya mere, ohu ibe ya ahụ dara nʼala nʼihu ya rịọọ ya ka o nye ya nwantịntị oge. Ọ rịọkwara ya sị, ‘Enyi m, biko nwee ntachiobi, aga m akwụghachi gị ụgwọ m ji gị.’ 30“Ma o kwenyeghị, kama ọ gara tụba ya nʼụlọ mkpọrọ, ebe ọ ga-anọ ruo mgbe ọ kwụsịrị ụgwọ niile o ji ya. 31Mgbe ndị ohu ibe ya hụrụ ihe mere, o wutere ha nke ukwuu. Ha jekwuru Nna ha ukwu kọọrọ ya ihe niile ndị a. 32“Nʼihi nke a Nna ya ukwu kpọrọ ohu ahụ sị ya, ‘Ohu obi ọjọọ! Agbaghara m gị ụgwọ ahụ niile i ji, nʼihi na ị rịọrọ m arịrịọ. 33Ọ bụ na ị kwesighị inwe obi ebere nʼebe ohu ibe gị nọ, dị ka m si mere gị ebere?’ 34Nʼihi iwe, Nna ya ukwuu nyefere ya nʼaka ndị nche na-eche ndị nọ nʼụlọ mkpọrọ ka ha taa ya ahụhụ, ruo mgbe ọ kwụchara ụgwọ niile o ji. 35“Otu a ka Nna m bi nʼeluigwe ga-emekwa unu, ma ọ bụrụ na unu ejighị obi unu niile gbaghara ụmụnna unu.”

Kalenda Rom n’ozuzu; ọgbakọ ndị bishọp nwere ike ibuga ụfọdụ mmemme (Epifani, Mgbago n’Eluigwe, Ahụ na Ọbara Kraịst) n’ụbọchị Sọnde ma ọ bụ tinye nke ha. Akwụkwọ ọgụgụ: usoro Sọnde B, afọ ụbọchị izu I.

Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike