Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Febrụwarị 2027 › 14 Febrụwarị

Kalenda Ọtọdọks · 1 Febụwarị (Kalenda ochie)

Ihe ọgụgụ Ọtọdọks nke ụbọchị — 14 Febrụwarị 2027

Sọnde · Olu 4

Mmemme na ndị nsọ

Sọnde Zakịọs

Obubu ọnụ

Ọ dịghị obubu ọnụ

Nke a na-eso iwu ndị mọnk. Nʼparish, a na-ekpebi ọtụtụ obubu ọnụ ya na onye na-anụ nkwupụta mmadụ, dịka ahụike, afọ na ọnọdụ si dị.

Ihe ọgụgụ nke ụbọchị

Oziọma ofufe ụtụtụ nke 4

Luk 24:1–12

1Nʼụbọchị mbụ nke izu ụka, nʼezigbo isi ụtụtụ, ha weere mmanụ otite ahụ ha tinyere ọtụtụ ụda nke ha kwadoro gawa nʼili ahụ. 2Ha chọpụtara na e nupụla nkume e ji dochie nʼọnụ ili ahụ. 3Ma mgbe ha banyere nʼime ya, ha ahụghị ahụ Onyenwe anyị Jisọs. 4Dị ka ha nọ na mgbagwoju anya banyere nke a, nʼotu ntabi anya, ha hụrụ mmadụ abụọ yi uwe na-egbu ka amụma guzo ha nso. 5Ha kpudoro ihu ha nʼala nʼihi oke egwu, ma mmadụ abụọ ahụ gwara ha, “Gịnị mere unu ji na-achọ onye dị ndụ nʼetiti ndị nwụrụ anwụ? 6Ọ nọkwaghị nʼebe a, o biliela nʼọnwụ, chetakwanụ ihe ọ gwara unu mgbe unu na ya nọ na Galili sị, 7‘A ghaghị inyefe Nwa nke Mmadụ nʼaka ndị mmehie, a ga-akpọgidekwa ya nʼobe ma nʼụbọchị nke atọ ọ ga-esi nʼọnwụ bilie.’ ” 8Mgbe ahụ ha chetara okwu ya. 9Mgbe ha sitere nʼili ahụ lọghachi, ha kọọrọ mmadụ iri na otu ahụ na ndị ọzọ niile ihe ndị a. 10Ọ bụ Meri Magdalin, na Joana, na Meri nne Jemis na ụmụ nwanyị ndị ọzọ so ha kọọrọ ndị na-eso ụzọ ya ihe a. 11Ma ha ekweghị ihe ha gwara ha, nʼihi na okwu ha dị ha ka ọ bụ ihe efu. 12Ma otu ọ dị, Pita gbaara ọsọ ruo nʼili ahụ, hulata ala hụ ka akwa ozu ndị ahụ tọgbọọrọ onwe ha; ọ lara na-atụgharị uche nʼime onwe ya ihe ihe ndị a pụtara.

Akwụkwọ ozi

1Tm 4:9–15

9Okwu a kwesiri ntụkwasị obi, kwesikwa ka a nara ya nke ọma. 10Anyị na-adọgbu onwe anyị nʼọrụ na-ahụjukwa anya maka na anyị tụkwasịrị olileanya anyị na Chineke dị ndụ, onye bụ Onye nzọpụta mmadụ niile, karịchasịa, nke ndị niile kwere ekwe. 11Ndị a bụ ihe ndị ị ga-akụzi, kwudosie ike na-akụzi ha. 12Ekwela ka onye ọbụla lelịa gị anya nʼihi na ịbụ okorobịa. Kama mee ka ị bụrụ ihe ịmaatụ na ihe ilere anya ọma nye ndị kwere ekwe, nʼokwu, nʼibi obi, nʼịhụnanya, nʼokwukwe nakwa nʼịdị ọcha nʼuche. 13Tutu ruo mgbe m ga-abịa nʼebe ahụ, na-agụpụta ma na-akọwakwara ndị chọọchị ihe e dere nʼime akwụkwọ nsọ. Na-ekwusakwa okwu Chineke. 14Elelịla onyinye ime mmụọ nke i nwere anya, bụ nke e nyere gị site nʼibu amụma pụtara ihe mgbe ndị okenye bikwasịrị gị aka nʼisi. 15Jiri onyinye ndị a niile rụọ ọrụ, nọgidesie ike nʼọrụ gị, ka onye ọbụla mata, hụkwa na ị na-eme nke ọma.

Akwụkwọ ozi (maka Onye nsọ Trifọn)

Rom 8:28–39

28Anyị maara na ihe niile na-arụkọta ọrụ maka ọdịmma ndị hụrụ Chineke nʼanya bụ ndị a kpọrọ dịka uche nsọ ya siri dị. 29Nʼihi na ndị ahụ ọ maararị ka ọ kakwara akara ka ha nwe ụdịdị nke Ọkpara ya, ka ọ bụrụ nwa e buru ụzọ mụọ nʼetiti ọtụtụ ụmụnna. 30Ma ndị ahụ ọ kara akara, ka ọ kpọkwara; ndị ọ kpọrọ, ka ọ gụrụ na ndị ezi omume; ndị ọ gụrụ na ndị ezi omume ka o nyekwara otuto. 31Gịnị ọzọ ka anyị ga-ekwu banyere ihe ndị a. Ọ bụrụ na Chineke nọnyere anyị, onye pụrụ imegide anyị? 32Onye ahụ na-azọghị ndụ Ọkpara ya, kama o weere ya nye nʼihi mmehie anyị niile, ọ dị ihe ọzọ anyị chọrọ ọ na-agaghị enye anyị site na ya? 33Onye pụrụ ibo ndị ahụ Chineke họpụtara ebubo? Ọ bụ Chineke na-agụ mmadụ dịka onye ezi omume. 34Onye bụ onye ahụ nke ga-ama ikpe? Ọ bụ Kraịst Jisọs onye nwụrụ, ma karịa nke ahụ, onye e mere ka o si nʼọnwụ bilie, nọ nʼaka nri Chineke na-arịọtakwara anyị arịrịọ. 35Onye nwere ike ikewapụ anyị site nʼịhụnanya Kraịst? Ọ bụ nsogbu, ka ọ bụ ihe isi ike, ka ọ bụ mkpagbu. Ka ọ bụ ụnwụ, ka ọ bụ ịgba ọtọ, ka ọ bụ ihe egwu, ka ọ bụ mma agha? 36Dịka e dere ya, “Ọ bụ nʼihi gị ka anyị na ọnwụ ji na-agba mgba ụbọchị niile. A na-ele anyị anya dịka atụrụ a gaje igbu egbu.” 37Mba, kama nʼime ihe ndị a niile, anyị karịrị ndị mmeri site nʼonye ahụ hụrụ anyị nʼanya. 38Nʼihi na nke a bụ ihe m maara nke ọma, na ọnwụ, maọbụ ndụ, maọbụ ndị mmụọ ozi, maọbụ mmụọ dị iche iche ndị na-achị nʼelu na nʼụwa, maọbụ ike ọchịchịrị dị iche iche, maọbụ ihe dị ugbu a, maọbụ ihe gaje ịbịa, 39maọbụ ịdị elu, maọbụ ịdị omimi, ma ọ bụkwanụ ihe ọbụla ọzọ e kere eke, agaghị enwe ike ikewapụ anyị site nʼịhụnanya Chineke, nke dị nʼime Kraịst Jisọs Onyenwe anyị.

Oziọma

Luk 19:1–10

1Ọ banyere Jeriko mgbe ọ na-agafe. 2Otu nwoke nọ ebe ahụ, aha ya bụ Zakịọs; ọ bụ onyeisi ndị ọna ụtụ bụrụkwa ọgaranya. 3Ọ chọrọ ịhụ onye Jisọs bụ ma ebe ọ bụ onye mkpụmkpụ, ọ dịrịghị ya mfe nʼihi igwe mmadụ. 4Ya mere, ọ gbaara ọsọ gaa nʼihu rigoro nʼotu osisi sikamọ, ka o nwee ike ịhụ ya dị ka ọ na-agafe nʼụzọ ahụ. 5Mgbe Jisọs rutere nʼebe ahụ, o lere anya nʼelu sị ya, “Zakịọs, rịdata ngwangwa. Aga m abụ ọbịa nʼụlọ gị taa.” 6Ọ rịdatara nʼotu mgbe ahụ jirikwa obi ụtọ nabata ya. 7Mmadụ niile hụrụ nke a, ma bido na-atamu sị, “Ọ gaala ịbụ ọbịa onye mmehie.” 8Ma Zakịọs biliri ọtọ gwa Onyenwe anyị, “Lee, Onyenwe anyị, aga m enye ndị ogbenye ọkara ihe niile m nwere. Ọ bụrụkwa na o nwere onye m ghọgburu nara ya ihe ọbụla, aga m akwụghachi ya okpukpu anọ.” 9Jisọs gwara ya, “Taa nzọpụta abịala nʼụlọ a, nʼihi na onye a bụkwa nwa Ebraham. 10Nʼihi na Nwa nke Mmadụ bịara ịchọ na ịzọpụta ndị furu efu.”

Oziọma (maka Onye nsọ Trifọn)

Luk 10:19–21

19Lee! Enyela m unu ikike ịzọkwasị agwọ na akpị ụkwụ, na imegide ike niile nke onye iro; ọ dịghị ihe ọbụla ga-emerụ unu ahụ. 20Otu ọ dị, unu aṅụrịla ọṅụ nʼihi na mmụọ ọjọọ rubere unu isi, kama ṅụrịanụ ọṅụ nʼihi na e deela aha unu nʼeluigwe.” 21Nʼotu oge ahụ, o jupụtara nʼọṅụ nke Mmụọ Nsọ kwuo sị, “Nna, Onyenwe eluigwe na ụwa, ana m ekele gị nʼihi na ị zonarịrị ihe ndị a nʼebe ndị ọkachamara na ndị nwere amamihe nọ, ma ị kpughere ihe ndị a niile nye ụmụntakịrị. E, Nna, otu a ka o si masị uche gị ime ya.

Ụbọchị ndị a na-eso kalenda Julian nke Nzukọ Rọshịa (dịka Nzukọ Sabia na Jọjia na Ugwu Athos): 1 Febrụwarị na kalenda nzukọ bụ 14 Febrụwarị na kalenda obodo. Nzukọ ndị na-eji kalenda ọhụrụ (Gris, Romania, Bulgaria, Ukraine…) na-eme mmemme ndị na-adịghị agbanwe agbanwe na ndị nsọ n’ụbọchị obodo ahụ n’onwe ya, ụbọchị 13 tupu mgbe ahụ, ụfọdụ ihe ọgụgụ ha dịkwa iche; Ista na ụbọchị ndị dabere na ya bụ otu.

Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike