Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Febrụwarị 2027 › 13 Febrụwarị

Kalenda Ọtọdọks · 31 Jenụwarị (Kalenda ochie)

Ihe ọgụgụ Ọtọdọks nke ụbọchị — 13 Febrụwarị 2027

Satọdee · Izu nke 37 mgbe Pentikọọsụ gasịrị · Olu 3

Mmemme na ndị nsọ

Holy Wonderworkers and Unmercenary Martyrs Cyrus and John, and together with them the Martyr Athanasia and her daughters: Theodota, Theoctista and Eudoxia at Canopus in Egypt († 311)

Obubu ọnụ

Ọ dịghị obubu ọnụ

Nke a na-eso iwu ndị mọnk. Nʼparish, a na-ekpebi ọtụtụ obubu ọnụ ya na onye na-anụ nkwupụta mmadụ, dịka ahụike, afọ na ọnọdụ si dị.

Ihe ọgụgụ nke ụbọchị

Akwụkwọ ozi

1Te 5:14–23

14Ma ugbu a, anyị na-arịọ unu, ụmụnna, na-adụnụ ndị na-anọ nkịtị ọdụ, na-agbanụ ndị dara mba ume, nyerenụ ndị na-adịghị ike aka, nwekwanụ ndidi nʼebe ha niile nọ. 15Ka onye ọbụla ghara inyeghachi mmadụ ibe ya ihe ọjọọ nʼọnọdụ ihe ọjọọ. Kama gbalịsienụ ike ime ezi ihe nʼebe ibe unu nọ na nʼebe mmadụ niile nọ. 16Na-aṅụrịnụ ọṅụ oge niile. 17Na-ekpenụ ekpere oge niile na-esepụghị aka. 18Na-enyenụ ekele mgbe niile banyere ihe niile, nʼihi na nke a bụ ọchịchọ Chineke banyere unu ndị bụ nke Kraịst Jisọs. 19Unu emenyụla ọkụ Mmụọ Nsọ. 20Ọzọ unu eledala okwu ndị amụma anya. 21Kama na-anwalenụ ihe niile ma na-ejidesikwanụ ihe niile dị mma aka ike. 22Wezuganụ onwe unu nʼihe ọjọọ niile. 23Ka Chineke ya onwe ya, bụ Chineke nke udo, doo unu nsọ nʼụzọ niile. Ka e debezuo mmụọ unu na mkpụrụobi unu na anụ ahụ unu nsọ, na-enweghị ntụpọ ọbụla ruo ụbọchị ọbịbịa Onyenwe anyị Jisọs Kraịst.

Akwụkwọ ozi (maka Onye nsọ Sairọs na Onye nsọ Jọn)

1Kọ 12:27–13:8

27Ugbu a, unu niile nʼotu nʼotu bụ otu anụ ahụ Kraịst. Unu bụkwa akụkụ ahụ ya nʼotu nʼotu, bụrụkwa ndị dị mkpa nʼahụ ahụ. 28Nke a bụ ụfọdụ nʼime akụkụ dị iche iche Chineke tinyere na chọọchị; nke mbụ bụ ndị ozi, ndị amụma, ndị nkuzi, ndị na-arụ ọrụ ịtụnanya, ndị na-agwọ ọrịa, ndị pụrụ inyere mmadụ ibe ha aka, ndị nwere onyinye ịchịkọta ihe niile nʼusoro, na ndị na-asụ asụsụ dị iche iche. 29Ha niile, ha bụ ndị ozi? Ha niile ha bụ ndị amụma? Ha niile ha bụ ndị nkuzi? Ha niile ha bụ ndị ọrụ ebube? 30Ha niile ha nwere onyinye ịgwọ ọrịa? Ha niile ha na-asụ nʼolu dị iche iche? Ha niile ha nwere onyinye nke ịkọwa asụsụ dị iche iche? 31Ugbu a, gbalịsienụ ike inweta onyinye kachasị dị elu karịa. Ma aga m ezi unu ụzọ nke kachasị ihe a niile mma. 13:1A sị na m na-asụ asụsụ dị iche iche nke ndị mmadụ maọbụ nke ndị mmụọ ozi, ma ahụghị m mmadụ ibe m nʼanya, abụ m naanị ogene na-eme ụzụ maọbụ mbadamba efere na-ada ụda. 2A sịkwa na m nwere onyinye ibu amụma, bụrụ onye pụrụ ikwu ihe niile gaje ime nʼoge dị nʼihu, na onye maara ihe niile, a sịkwa na m nwere okwukwe nke m pụrụ isite na ya nye ugwu buru ibu iwu sị ya site nʼebe ọ nọ gaa nʼebe ọzọ, ma ahụghị m mmadụ ibe m nʼanya, abụghị m ihe ọbụla. 3A sịkwa na m ewere ihe niile m nwere nye ndị ogbenye, werekwa anụ ahụ m nye ka ere ya ọkụ nʼihi ka m nyaa isi, ihe ndị a niile abaghị uru, ma m enweghị ịhụnanya. 4Ịhụnanya na-enwe ogologo ntachiobi, na-enwekwa obi ebere. Ọ dịghị ekwo ekworo, ọ naghị enwe anya ukwu, ọ naghị anya isi. Ọ nakwaghị ebuli onwe ya elu. 5Ọ naghị eme ihe na-akpasu iwe, ọ naghị achọ ihe nke naanị ya, ọ naghị ewe iwe ọsịịsọ. Ọ nakwaghị agụkọ ihe ọjọọ niile e mere ya. 6Ọ dịghị aṅụrị ọṅụ nʼihe ọjọọ, kama ọ na-aṅụrị nʼeziokwu. 7Ọ na-edi ihe niile, ọ na-ekwerekwa ihe niile, ọ na-enwekwa olileanya na-anagide ihe ọbụla dapụtara. 8Ịhụnanya adịghị agwụ agwụ. Ma ibu amụma niile ga-emesịa kwụsị, onyinye ịsụ asụsụ dị iche iche ga-akwụsịkwa. Otu a, ihe ọmụma niile ga-agabiga.

Oziọma

Luk 17:3–10

3Kpachapụrụnụ onwe unu anya! “Ọ bụrụ na nwanna gị e mejọọ gị, baara ya mba. Ọ bụrụ na o chegharịa, gbaghara ya. 4Ọ bụrụkwa na o mejọọ gị ugboro asaa nʼotu ụbọchị, rịọkwa gị ugboro asaa sị, ‘E chegharịala m,’ ị ghaghị ịgbaghara ya.” 5Ndị ozi ya sịrị ya, “Onyenwe anyị, mee ka okwukwe anyị dị ukwuu!” 6Onyenwe anyị zara, “Ọ bụrụ na unu nwere okwukwe nke ha ka mkpụrụ mọstaadị, unu nwere ike ị sị osisi ukwu a, Ka e site na mgbọrọgwụ hopu gị ma kụọkwa gị nʼime oke osimiri, ọ ga-erubere unu isi. 7“Ọ bụ onye nʼime unu nke nwere ohu onye si ebe ọ gara rụọ ọrụ maọbụ ịzụ atụrụ lọbata, ga-asị ya, ‘Mee ngwangwa nọdụ ala rie nri’? 8Ọ gaghị asị ya, ‘Siere m nri ọsịịsọ, kwadoo onwe gị jere m ozi ka m na-eri na aṅụkwa ihe ọṅụṅụ; emesịa ị ga-eri nri ma ṅụọ ihe ọṅụṅụ nke gị’? 9Ọ ga-ekele ohu ahụ nʼihi na ọ rụrụ ọrụ o kwesiri ịrụ? 10Nʼotu aka ahụ, mgbe unu rụchara ọrụ niile unu kwesiri ịrụ, ihe unu ga-ekwu bụ, ‘Anyị bụ ụmụ ohu na-ekwesighị ekwesi, anyị emeela ihe anyị kwesiri ime.’ ”

Oziọma (maka Onye nsọ Sairọs na Onye nsọ Jọn)

Mat 10:1, 5–8

1Jisọs kpọrọ ndị na-eso ụzọ ya iri na abụọ nye ha ikike ịchụpụ mmụọ na-adịghị ọcha, na ịgwọ nrịa nrịa na ọrịa niile dị iche iche. 5Ndị ikom iri na abụọ ndị a ka Jisọs nyere ikike zipụ. Maara ha ọkwa sị ha: “Unu agala nʼebe ndị mba ọzọ, maọbụ nʼebe ndị Sameria nọ. 6Kama jekwurunụ ụmụ Izrel, ndị bụ atụrụ furu efu. 7Mgbe unu na-aga, na-ekwusaaranụ ha sị, ‘alaeze eluigwe a dịla nso.’ 8Gwọọnụ ndị ọrịa, kpọteenụ ndị nwụrụ anwụ, meenụ ka ahụ ndị ekpenta dị ọcha, chụpụkwanụ mmụọ ọjọọ. Nʼefu ka unu natara. Ya mere, nyenụ nʼefu.

Ụbọchị ndị a na-eso kalenda Julian nke Nzukọ Rọshịa (dịka Nzukọ Sabia na Jọjia na Ugwu Athos): 31 Jenụwarị na kalenda nzukọ bụ 13 Febrụwarị na kalenda obodo. Nzukọ ndị na-eji kalenda ọhụrụ (Gris, Romania, Bulgaria, Ukraine…) na-eme mmemme ndị na-adịghị agbanwe agbanwe na ndị nsọ n’ụbọchị obodo ahụ n’onwe ya, ụbọchị 13 tupu mgbe ahụ, ụfọdụ ihe ọgụgụ ha dịkwa iche; Ista na ụbọchị ndị dabere na ya bụ otu.

Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike