Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Febrụwarị 2027 › 14 Febrụwarị

Kalenda Katọlik

Ihe ọgụgụ Mass (Katọlik) — 14 Febrụwarị 2027

Sọnde · Izu nke 1 nke Lent

Mmemme na ndị nsọ

Sọnde nke 1 nke Lent

Sọnde · Agba ofufe: odo odo

Ihe ọgụgụ nke ụbọchị

Ihe ọgụgụ mbụ

Jen 9:8–15

8Chineke gwara Noa na ụmụ ya sị, 9“Ugbu a, ana m ehiwe ọgbụgba ndụ nʼetiti mụ na unu, na nʼetiti agbụrụ unu ndị ga-anọchi unu, 10na nʼetiti ihe niile nwere ndụ nke unu na ha so, ụmụ anụ ufe, na ụmụ anụ ụlọ, na ụmụ anụ ọhịa niile, ndị ahụ niile so unu si nʼụgbọ mmiri pụta, bụ ihe niile nwere ndụ nʼụwa. 11Ebe ọ bụ na m ehiwela ọgbụgba ndụ m nʼetiti mụ na unu, ọ gaghị emekwa ọzọ na a ga-eji uju mmiri kpochapụ ihe niile e kere eke, ọ gaghị emekwa ọzọ na a ga-eji uju mmiri bibie ụwa.” 12Chineke kwuru sị, “Nke a bụ ihe ama nke ọgbụgba ndụ nke m na-etinye nʼetiti mụ na unu, na nʼetiti ihe niile nwere ndụ so unu, ọgbụgba ndụ nke ga-adị nye ọgbọ niile na-abịa nʼihu. 13Etinyela m eke na egwurugwu m na mbara eluigwe, ka ọ bụrụ ihe ama nke ọgbụgba ndụ dị nʼetiti mụ na ụwa. 14Mgbe ọbụla m zitere igwe ojii nʼụwa, ọ bụrụ na eke na egwurugwu apụta ìhè na mbara eluigwe, 15aga m echeta ọgbụgba ndụ m mere ka ọ dịrị nʼetiti mụ na unu, na nʼetiti mụ na ihe niile nwere ndụ site nʼihe niile e kere eke. Ọ gaghị emekwa ọzọ na mmiri ga-aghọ uju mmiri ibibi ihe niile nwere ndụ.

Abụ Ọma nzaghachi

Abụ 25:4–9

4O Onyenwe anyị, zi m ụzọ gị niile, kuzikwaara m ụzọ gị niile. 5Duo m nʼeziokwu gị, kuzikwaara m ihe, nʼihi na ị bụ Chineke, onye Nzọpụta m, ụbọchị niile, olileanya m dị na gị. 6Cheta, Onyenwe anyị, oke obi ebere na ịhụnanya gị, nʼihi na ha na-adị siterị na mgbe ochie. 7Echetala mmehie m mere nʼokorobịa m, ya na nnupu isi m niile. Kama site nʼịhụnanya gị cheta m, Onyenwe anyị, nʼihi na onye dị mma ka ị bụ. 8Onye dị mma na onye ezi omume ka Onyenwe anyị bụ; ọ bụ ya mere ọ na-ezi ndị mmehie ụzọ ya. 9Ọ na-edu ndị dị umeala nʼobi nʼụzọ ziri ezi, na-ezikwa ha ụzọ nke ya.

Ihe ọgụgụ nke abụọ

1Pt 3:18–22

18Nʼihi na Kraịst nʼonwe ya hụrụ ahụhụ nwụọ nʼihi unu otu mgbe. Onye ezi omume nwụrụ nʼihi ndị ajọ omume, ka ọ kpọrọ unu bịakwute Chineke. Nʼihi na e mere ka ọ nwụọ nʼanụ ahụ ma e mekwara ka ọ dị ndụ na mmụọ ya. 19Mgbe emesịrị ka ọ dị ndụ na mmụọ ya, ọ gara kwusaa oziọma nye mmụọ ndị ahụ a kpọchiri nʼụlọ mkpọrọ. 20Nke a bụ mmụọ ndị ahụ jụrụ ime ihe Chineke chọrọ mgbe ahụ o ji ntachiobi chere ha nʼoge ahụ Noa nọ na-ewu ụgbọ mmiri ya. Ọ bụ naanị mmadụ asatọ nʼime ndị bi nʼoge ahụ ka a zọpụtara site na mmiri ahụ. 21Mmiri a nọ ọnọdụ dị ka baptizim nke na-azọpụta unu ugbu a. Ọ anaghị asapụ unyi site nʼahụ mmadụ, kama ọ bụ ihe na-egosi ezi akọnuche nʼebe Chineke nọ. Ọ na-azọpụta unu site na mbilite nʼọnwụ nke Jisọs Kraịst, 22onye nọ nʼeluigwe, nʼaka nri Chineke, ebe ndị mmụọ ozi niile, na ịchị isi niile, na ike niile na-erube isi nye ya.

Oziọma

Mak 1:12–15

12Ngwangwa, Mmụọ Nsọ duuru ya baa nʼime ọzara. 13Ọ nọkwara nʼime ọzara ahụ iri ụbọchị anọ, ebe ekwensu nwara ya ọnwụnwa. Ya na ụmụ anụ ọhịa nọkwa. Ma ndị mmụọ ozi jeere ya ozi. 14Mgbe e tinyesịrị Jọn nʼụlọ mkpọrọ, Jisọs gara na Galili, na-ekwusa oziọma Chineke. 15Ọ sịrị, “Oge ahụ eruola, alaeze Chineke dị nso. Chegharịanụ ma kwerekwanụ nʼoziọma.”

Ndị nsọ nke ụbọchị

Kalenda Rom n’ozuzu; ọgbakọ ndị bishọp nwere ike ibuga ụfọdụ mmemme (Epifani, Mgbago n’Eluigwe, Ahụ na Ọbara Kraịst) n’ụbọchị Sọnde ma ọ bụ tinye nke ha. Akwụkwọ ọgụgụ: usoro Sọnde B, afọ ụbọchị izu I.

Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike