Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Jenụwarị 2027 › 24 Jenụwarị

Kalenda Katọlik

Ihe ọgụgụ Mass (Katọlik) — 24 Jenụwarị 2027

Sọnde · Izu nke 3 nke Oge Nkịtị

Mmemme na ndị nsọ

Sọnde nke 3 nke Oge Nkịtị

Sọnde · Agba ofufe: akwụkwọ ndụ

Ihe ọgụgụ nke ụbọchị

Ihe ọgụgụ mbụ

Jona 3:1–5, 10

1Mgbe ahụ, okwu Onyenwe anyị ruru Jona ntị nke ugboro abụọ na-asị, 2“Bilie, jee nʼobodo ukwu ahụ bụ Ninive, kwusaara ya ozi ahụ m ziri gị.” 3Jona biliri gaa Ninive dịka okwu nke Onyenwe anyị si dị. Ninive bụ nnọọ obodo dị ukwuu, nke ga-ewe ụbọchị atọ ịga ya gburugburu. 4Jona malitere ịba nʼobodo ahụ, ma mgbe ọ gara ije otu ụbọchị, o kwusara sị, “Iri ụbọchị anọ ka ọ fọdụrụ tupu alaa Ninive nʼiyi.” 5Ndị Ninive kwenyeere na Chineke, kpọsaa obubu ọnụ, ha niile site nʼonye ukwu ruo nʼonye nta, onye ọbụla yikwasịrị uwe mkpe. 10Mgbe Chineke hụrụ ihe niile ha mere, na otu ha siri site nʼụzọ ọjọọ ha niile chegharịa, Chineke chegharịrị uche banyere ịla ha nʼiyi. O mekwaghị ka nzube ya ibibi obodo ahụ mezuo.

Abụ Ọma nzaghachi

Abụ 25:4–9

4O Onyenwe anyị, zi m ụzọ gị niile, kuzikwaara m ụzọ gị niile. 5Duo m nʼeziokwu gị, kuzikwaara m ihe, nʼihi na ị bụ Chineke, onye Nzọpụta m, ụbọchị niile, olileanya m dị na gị. 6Cheta, Onyenwe anyị, oke obi ebere na ịhụnanya gị, nʼihi na ha na-adị siterị na mgbe ochie. 7Echetala mmehie m mere nʼokorobịa m, ya na nnupu isi m niile. Kama site nʼịhụnanya gị cheta m, Onyenwe anyị, nʼihi na onye dị mma ka ị bụ. 8Onye dị mma na onye ezi omume ka Onyenwe anyị bụ; ọ bụ ya mere ọ na-ezi ndị mmehie ụzọ ya. 9Ọ na-edu ndị dị umeala nʼobi nʼụzọ ziri ezi, na-ezikwa ha ụzọ nke ya.

Ihe ọgụgụ nke abụọ

1Kọ 7:29–31

29Ihe unu kwesiri ịma, ụmụnna, bụ na oge anyị nwere fọdụrụ naanị ntakịrị, site ugbu a gaa nʼihu ndị nwere nwunye ga-adị ndụ ha dịka ndị na-enweghị. 30Ka ndị na-akwa akwa bie ndụ dịka ndị ihe anaghị ewute, ka ndị na-achị ọchị dịrị ka ndị obi na-adịghị atọ ụtọ. Ka ndị na-azụ ahịa dịrị dịka ndị na-enweghị ngwa ahịa ọbụla. 31Ka ndị na-etinye oge nʼihe ụtọ nke ụwa hapụ ibi ndụ ịchọ iritecha ihe niile dị nʼụwa nʼuru. Nʼihi na ụwa, otu ọ dị ugbu a, bụ ihe na-agabiga agabiga.

Oziọma

Mak 1:14–20

14Mgbe e tinyesịrị Jọn nʼụlọ mkpọrọ, Jisọs gara na Galili, na-ekwusa oziọma Chineke. 15Ọ sịrị, “Oge ahụ eruola, alaeze Chineke dị nso. Chegharịanụ ma kwerekwanụ nʼoziọma.” 16Mgbe Jisọs na-aga nʼakụkụ osimiri Galili, ọ hụrụ Saimọn na Andru nwanne ya, ka ha na-awụnye ụgbụ ha nʼime mmiri nʼihi na ha bụ ndị ọkụ azụ. 17Jisọs siri ha, “Bịanụ soro m, m ga-emekwa unu ndị ọkụ na-akụta mmadụ.” 18Ngwangwa ha hapụrụ ụgbụ azụ ha ma soro ya. 19Mgbe ọ gatụrụ nʼihu nke nta, ọ hụrụ Jemis nwa Zebedi na nwanne ya bụ Jọn ndị nọ nʼime ụgbọ mmiri, na-ekezi ụgbụ azụ ha. 20Ngwangwa, ọ kpọrọ ha, ha hapụrụ nna ha Zebedi na ndị o goro ọrụ nʼime ụgbọ soro ya.

Ndị nsọ nke ụbọchị

Kalenda Rom n’ozuzu; ọgbakọ ndị bishọp nwere ike ibuga ụfọdụ mmemme (Epifani, Mgbago n’Eluigwe, Ahụ na Ọbara Kraịst) n’ụbọchị Sọnde ma ọ bụ tinye nke ha. Akwụkwọ ọgụgụ: usoro Sọnde B, afọ ụbọchị izu I.

Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike